Atụmatụ Afọ 2025-2026 nke Wikimedia Foundation/Ebumnobi
Nchịkọta Ebumnobi
Usoro ntule mmepụta
Ịmata Usoro ntule mmepụta kwesịrị ekwesị maka ụdị ọrụ Wikimedia Foundation na-arụ dịgasị iche site na mpaghara nakwa ụdị ọrụ.
Enweghị ụkọ data, nkọwa nnyocha, na nnyocha nke otu otu ọ bụla jiiri na Wikimedia Foundation, site na data arụmọrụ dị n'ime ụlọ ọrụ dị mkpa ma ọ bụ ụdị ihe ntunyere ndị ọzọ. Ọrụ nke ịchọpụta Usoro ntule mmepụta ziri ezi iji haa ihe ziri ezi, Otú ọ dị, anaghị abụkarị ihe dim̀fe ịhazị. ụfọdụ akụkụ nke ọrụ Foundation eguzobewo Usoro ntule mmepụta na mpụga dị ka nnyocha, nnyocha mpụga (dịka, ego, ịnakọta ego, iwu, wdg). mpaghara ndị ọzọ nke ọrụ na-adabere na Usoro ntule mmepụta ndị ọzọ dị ka nzaghachi na uto ndị ngalaba otu na Wikimedia nakwa njịkọ aka mpụga.
Ihe akọwapụtara n'okpuru ebe a bụ nwale siri ike, nwere ngwụcha oge iji wepụta obere isi Usoro ntule mmepụta dị mkpa nke ga-akpali mkpokọta ọrụ anyị na ndị ọrụ afọ ofufo, ma bụrụ akara ngosi iji gosi ma ebumnobi a n'ozuzu a na-aga n'ụzọ ziri ezi. Ebumnobi bụ na metrik ndị a ga-enyekwara anyị aka inyocha, mezie ma kwalite ka esi chọọ. Ebe anyị na-anaghị ahụ mmetụta anyị na-atụ anya, anyị ga-enyocha ma meharịa ọrụ ahụ n'ụzọ kwesịrị.
A họọrọ Usoro ntule mmepụta ndị bụ isi site na iji usoro ndị a:
- Ha na-anọchite anya ihe ịga nke ọma doro anya na mpaghara kacha pụta ihe nke nkwado Foundation maka ije ozi ahụ.
- Anyị nwere ike ime mgbanwe ugboro ugboro iji mee mgbanwe n'ime afọ.
- Usoro ntule mmepụta a dabara na ọrụ nke Foundation nwere ike ịchịkwa ma nwee ikike imetụta;
- Ha dị mma nlekwasa anya iji nyere anyị aka ịghọta ọganihu na atụmatụ ọtụtụ afọ ma nye nkọwa ozi iji chịkọba itinye ego n'ọrụ n'ihu.
A na-emejupụta Usoro ntule mmepụta a site n'ịbawanye ndị ọrụ afọ ofufo, ọdịnaya, ndị ọgụụ na ego enyemaka dị ka isi ahụrụ kwa okpu nke usoro atụmatụ ọtụtụ ọgbọ. Ịmepụta Usoro ntule mmepụta na nleba anya dị ogologo a na-enyere aka hụ na ịga n'ihu, usoro a ga-etinyesi uchu na ya nwere bụ nke enwere ike imeziwanye kwa afọ, ma nwee ike inyere anyị niile aka nyochaa ọganihu na mmetụta n'oge ihe karịrị otu afọ mmefu ego.
Ndepụta nke nhọrọ usoro ntule mmepụta
Ọtụtụ n'ime usoro ntule mmepụta ndị a ka nọ n'ogo odide ma a na-ekesa ya na ndepụta atụmatụ kwa afọ a ka a ga-aga n'ihu na-emeziwanye ha na oge mmejuputa ha n'afọ na-abịa.
Ebe enweghị usoro ntule mmepụta maka afọ mmefu ego a, atụmatụ bụ iji 'ihe ịga nke ọma nke isi mpụtaara' dị ka ihe nnọchi anya ruo mgbe a ga-enweta isi usoro ntule mmepụta maka iji ya mee ihe n'ọdịnihu nakwa n'akụkọ mmepụtara na-aga n'ihu. N'ime afọ mmefu ego na-abịanụ, ebumnobị bụ itinye usoro ndị ọzọ dị mkpa n'ime usoro nyule na nke akụkọ mmepụtara ka ha na-adị adị.
Kwalite Uto ndị ọrụ afọ ofufo
Zụlite ọtụtụ ọgbọ nke ndị ọrụ afọ ofufo. Maka ndị ọrụ afọ ofufo nwere mmụtaara na ndị ọhụrụ, iji nyere aka zaa ajụjụ a: "Gịnị mere m ga-eji wepụta onwe m?"
- Ntule: tụlee ma ghọta ọganihu site na usoro ntule mmepụta nke dabara n'ọrụ lekwasịrị anya na ebumnobi ndị na-enye aka na mpụtaara onye enyemaka(WE1). Usoro ntule nrụpụta a ga-adị maka iji malite na FY25 yana nkọwa usoro ntule mmepụta akọwapụtara nke dị na ngwụcha Q4 nke afọ mmefu ego ugbu a.
Nye ọdịnaya encyclopedik ekwesịrị ịtụkwasị obi
Kwado isi mmalite ihe ọmụma ịntanetị site n'ịgba mgba megide ozi na-ezighi ezi,ozi nduhie na ozi ndị na-adịghị nke gbasara gburugburu ebe obibi anyị. Gbaa mbọ hụ na ngwanro Mediawiki na-adigide ruo n'ọdịniihu.
- Ntule: Tụlee ma ghọta ọganihu n'ime isi mnwetaara akọwapụtara n'okpuru Ahụmahụ ndị ojieme (WE3) na ihe Ọmụma dị mkpa (WE2).
Nye nkwalite ego ọdịnihu nke inye n'efu
Na-akwado Otụ anyị n'ụzọ na-adịgide site na atụmatụ nrụpụta na uzọ mnweta ego. Mee ka ihe nd atụpụtara daba na usoro na mnweta na mmepe anyị maka nkwudosike ogologo oge.
- ntule: Tulee ma ghọta ọganihu dabere na isi ihe enwetara e depụtara na Iji Akụrụngwa n' ụzọ ziri ezi(WE5). Nke a ga-aga n'ihu na-eji usoro ego atụpụtara iji ghọta idi ire nke arụmọrụ site na Programmatic Expense Ratio yana usoro ntule mmepụta usoro ntinye ego ọhụrụ lekwasịrị anya na Cost per Dollar Raised .
Hazie ịntanetị na-agbanwe agbanwe
"Weta ọdịnaya ensaịklopedik na ọrụ afọ ofufo na ịntanetị nke AI na mmụtaara dị ụbara na achị".
- Ntule: Tụlee ma ghọta ọganihu dabeere na isi ihe enwetar akọwapụtara n'ebumnobi lekwasịrị anya na Ndị na-ege ntị n'ọdịnihu (FA1) na Vidio Social (FA2).
Nchịkọta usoro ntule mmepụta
| Ihe nkwudosike ike nke ọtụtụ ọgbọ | Ntule mmepụta bụ isi | Nkọwa usoro ntule mmepụta |
|---|---|---|
| Kwalite Uto ndị ọrụ afọ ofufo | isi usoro ntule mmepụta Ndị na-enye aka | Retained Editors |
| Chịkọba ịntanetị na-agbanwe agbanwe | Mmezu KR sitere na ndị na-ege ntị n'ọdịnihu (FA1) na vidiyo ọha (FA2) | Mmezu KR |
| Nye enyemaka ego maka ọdịnịhu inye n'efu | Mmezu KR site na iji akụrụngwa ọrụ n'ụzọ ziri ezi (WE5) | Mmezu KR |
| Isi usoro ntule mmepụta nke ego enwetara na ego anatara na onyinye | [Ọnụego kwa dollar enwetara] | |
| Ntule arụmọrụ mmemme | [Programmatic expense ratio] | |
| Nye ọdịnaya encyclopedik a pụrụ ịtụkwasị obi | Mmezu KR sitere na mmụtaara Ndị ji ọrụ anyị eme ihe (WE3) | Mmezu KR |
| Mmezu KR sitere na ihe Ọmụma dị mkpa (WE2) | Mmezu KR |



