Wikimedia Foundation Board noticeboard/April 2022 - Board of Trustees on Next steps: Universal Code of Conduct (UCoC) and UCoC Enforcement Guidelines/ig

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki

Usoro na-esote:Universal Code of Conduct (UCoC) na Ntuziaka Mmebe iwu UCoC

Ọ masịrị Kọmiti na-ahụ maka ihe gbasara obodo (Community Affairs Committee) nke Wikimedia Foundation Board of Trustees ikele onye ọ bụla sonyere na ntuli aka obodo mechiri nso nso a na Ntuziaka Mmebe iwu maka Universal Code of Conduct (UCoC).

Otu ọrụ afọ ofufo na-enyochaputa emechaala nyocha nke izi ezi ntuli aka ahụ wee kọwapụta ọnụọgụ votu enwetara dị ka 2,283. N'ime votu 2,283 enwetara, ngụkọta nke 1,338 (58.6%) ndị otu obodo tozuru oke maka ntụzịaka mmebe iwu, na ngụkọta nke 945 (41.4%) ndị otu obodo akwadoghị ya. Na mgbakwunye, ndị sonyere 658 hapụrụ nkwupụta na 77% nke ihe edere na Bekee.

Anyị na-amata ma nwee ekele maka mmasị na ntinye aka nke ndị otu obodo gosipụtara n'ịmepụta omenala dị nchebe na nke na-anabata nke na-akwụsị omume ọjọọ, na-akwado ndị mmadụ na-akpa àgwà dị otú ahụ, ma na-agba ndị nwere echiche ọma ume ka ha na-arụpụta ihe na ọrụ Wikimedia.

Ọbụna n'oge a na-ezughị ezu, nke a pụtara ìhè na nkwupụta a natara. Ọ bụ ezie na Enforcement Guidelines ruru nkwado zuru ezu dị mkpa maka Bọọdụ iji nyochaa, anyị gbara ndị ntuli aka ume, n'agbanyeghị ụzọ ha si eme ntuli aka, inye nzaghachi na ihe ndị dị na ntuziaka mmebe iwu nke ha chere na ọ dị mkpa ka a gbanwee ma ọ bụ dozie ya, yana ihe kpatara ya, ọ bụrụ na ọ dị ka ọ dị mma ịmalite usoro ndezi ọzọ nke ga-eleba anya maka nsogbu obodo.

Ndị ọrụ Foundation bụ ndị na-enyocha nkọwa dụrụ anyị maka ụfọdụ isiokwu na-apụta, n'ihi ya, anyị ekpebiela dị ka kọmitii na-ahụ maka ihe gbasara obodo nke bụ Community Affairs Committee ịjụ Foundation ka ọ kpọghachite kọmitii na-edepụta akwụkwọ na ka ha malite ọrụ obodo ọzọ iji mee ka ntụziaka mmebe iwu dabere na nzaghachi obodo enwetara site na ntuli aka emechiri nso nso a.

Maka idoanya, achịkọtala nzaghachi a na ngalaba anọ ndị a:

  1. Iji mata ụdị, ebumnuche, na ntinye nke ọzụzụ ahụ;
  2. Iji mee ka asụsụ dị mfe maka ntụgharị asụsụ na nghọta nke ndị na-abụghị ndị ọkachamara;
  3. Iji nyochaa echiche nke nkwenye, gụnyere uru na ọghọm ya;
  4. Ka elele ọrụ ndị na-emegiderịta onwe ha nke nchekwa nzuzo/nchekwa onye ihe metụtara na ikike ikwuputa okwu ma ịge ntị

Okwu ndị ọzọ nwere ike ịpụta n'oge mkparịta ụka, na karịsịa ka akwụkwọ Enforcement Guidelines na-amalite, anyị na-ahụ ndị a dị ka akụkụ bụ isi nke nchegbu maka ndị ntuli aka ma na-arịọ ndị ọrụ ka ha kwado nyocha nke okwu ndị a. Mgbe itinyekwu aka n'ihu gasịrị, Foundation kwesịrị ịmegharị votu obodo iji nyochaa Enforcement Outline ohuru iji hụ ma akwụkwọ ọhụrụ ahụ adịla njikere maka nkwenye gọọmentị.

Ọzọkwa, anyị maara nchegbu ndị ahụ na ndetu 3.1 dị na Universal Code of Conduct Policy. Anyị na-eduzi Foundation ka ọ kwado nyocha nke asụsụ a iji hụ na Amụma ahụ mezuru ebumnuche ya iji kwado obodo dị mma na nke sonyere nụ, na-echeghị maka nyocha atụmatụ nke Amụma dum na njedebe afọ.

Ọzọ, anyị na-ekele ndị niile sonyere, na-eche echiche banyere ihe ịma aka ndị a dị oke egwu na ndị siri ike ma na-enye aka na ụzọ ka mma n'ofe ije a iji ịrụkọta ọrụ nke ọma.

Kachasị mma,

Rosie

Rosie Stephenson-Goodknight (she/her)
Onye nnochitere Onyeisi , Community Affairs Committee
Wikimedia Foundation Board of Trustees