Ntuliaka nke Wikimedia Foundation/2025/Ọkwa/Ọkwa Nhọpụta
Ntuliaka Nhọpụta ndị Otu nlekọta atụkwasara obi nke Wikimedia Foundation 2025 & Òkù nnabata ajụjụ
Ndewo Mmadụ niile,
N'afọ a, ọnụnọ ugboro (abụọ) 2 nke ndị otu nlekọta atụkwasara obi ndị ngalaba otu- na ndị mmekọ-họpụtara na Otu Bọọdụ ndị nlekọta atụkwasịrị obi na Wikimedia Foundation ga-abịa na njedebe [1]. Ndị Bọọdụ na-akpọ òtù niile òkù isonye na usoro nhọpụta nke afọ a ma tụọ votu iji mejupụta oche ndị ahụ.
Kọmitii Ntuliaka ga-ahụ maka usoro a site na nkwado ndị ọrụ Foundation [2]. Kọmitii na-ahụ maka ọchịchị, nke ndị na-akwado ndị na-abụghị ndị na-azọ ọkwa n’usoro nhọpụta nke nhọpụta ndị nlekọta atụkwasịrị obi nke ngalaba otu-na ndị mmekọ na ntuliaka 2025 mejupụtara (Raju Narisetti, Shani Evenstein Sigalov, Lorenzo Losa, Kathy Collins, Victoria Doronina na Esra'a Al Shafei) [3], bụ ndị enyere ọrụ nlebara anya nye ndị Bọọdụ maka usoro nhọpụta nke ndị nlekọta atụkwasịrị obi 2025. Nkọwa ndị ọzọ gbasara ọrụ nke ndị Kọmitii ntuliaka, ndị Bọọdụ, na ndị ọrụ nọ ebe a [4].
Nke a bụ ụbọchị ndị akwadoro imepụta ihe ndị a:
- Mee 22 – June 5: Nkwupụta (nkwukọrịta a) na ịkpọ oku maka oge ajụjụ [6]
- June 17 - Julaị 1, 2025: ịkpọ oku maka ndị na-aga ịzọ ọkwa
- Julaị 2025: Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ndị mmekọ ga-eme ntuliaka iji wepụta aha ndị ga-azọ ọkwa ma ọ bụrụ na mmadụ iri ma ọ bụ karịa tinyere akwụkwọ [5]
- Ọgọst 2025: Oge nzisa
- Ọgọst – Septemba 2025: Oge ịtụ vootu ndị ngalaba otu izu abụọ
- Ọktoba – Nọvemba 2025: Nnyocha ndabere nke ndị ahọpụtara
- Nzukọ Bọọdụ na Disemba 2025: Ndị nlekọta ọhụrụ ewerela ọnọdụ
Matakwuo maka usoro nhọpụta nke 2025 - tinyere usoro ihe omume zuru ezu, usoro ịdebanye aha, iwu nzisa, na iwu ntozu ndị ga-eme ntuliaka - na ibe Meta-wiki a. [link].
Ịkpọ oku maka ajụjụ
N'ime usoro nhọpụta ọ bụla, ndị ngalaba otu nwere ohere iweta ajụjụ nye ndị na-azọ ọkwa Board of Trustees ịza. Kọmiti na-eme ntuliaka na-ahọpụta ajụjụ n'ime ndepụta ndị ngalaba otu wepụtara nye ndị na-azọ ọkwa ịza. Ndị na-azọ ọkwa ga-aza ajụjụ niile achọrọ ka ha wee ike tozuo ịzọ ọkwa; ma ọ bụghị ya, a ga-ewepu akwụkwọ anam achọ iso ha tinyere. N'afọ a, kọmitii ntuliaka ga-ahọpụta ajụjụ ise ndị na-azọ ọkwa ga-aza. Ajụjụ ndị ahọpụtara nwere ike ịbụ nchịkọta nke ihe ndị ngalaba otu zitere, ma ọ bụrụ na ha yitere ma ọ bụ na ha metụtara. [link]
Ndị ọrụ afọ ofufo Ntuliaka
Ụzọ ọzọ ị ga-esi sonye na usoro nhọpụta 2025 bụ ịbụ onye ọrụ afọ ofufo. Ndị ọrụ afọ ofufo bụ ndị nọ n'etiti kọmitii ntuliaka na ngalaba otu ha si na ya. Ha na-enyere aka hụ na ndị ngalaba otu ha sonyere ma kpọkọta ha ka ha mee ntuliaka. Mụtakwuo maka mmemme a na otu esi esonye na ibe Meta-wiki a
[link].
Daalụ!
[1] https://meta.wikimedia.org/wiki/Wikimedia_Foundation_elections/2022/Results
[2] https://foundation.wikimedia.org/wiki/Committee:Elections_Committee_Charter
[3] https://foundation.wikimedia.org/wiki/Resolution:Committee_Membership,_December_2024
[4] https://meta.wikimedia.org/wiki/Wikimedia_Foundation_elections_committee/Roles
[5] https://meta.wikimedia.org/wiki/Wikimedia_Foundation_elections/2025/FAQ
[6] https://meta.wikimedia.org/wiki/Wikimedia_Foundation_elections/2025/Questions_for_candidates
Ka e mesịa,
Victoria Doronina
Board Liaison to the Elections Committee
Governance Committee
