Jump to content

Ntuliaka Wikimedia Foundation/2025/Ọkpụkpọ oku maka ndị ga-eso zọọ ọkwa

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation elections/2025/Call for candidates and the translation is 94% complete.
Outdated translations are marked like this.


Otu ndị Bọọdụ atụkwasịrị obi nke Wikimedia Foundation 2025 - Ọkpụkpọ oku maka ndị ga-eso zọọ ọkwa

Ndewo mmadụ niile,

Ọkpụkpọ Oku maka ndị ga-eso zọọ ọkwa na ntuliaka Bọọdụ nlekọta atụkwasịrị obi nke Wikimedia Foundation 2025 amalitela ugbu a site na ọnwa June 17, 2025 - Julaị 2, 2025 na 11:59 UTC. Ndị Bọọdụ nlekọta atụkwasịrị obi na-ahụ maka ọrụ Wikimedia Foundation, ma onye nlekọta ọ bụla na-eje ozi ọ́kwa afọ atọ. Nke a bụ ọnọdụ ọrụ afọ ofufo.

N'afọ a, ndị Otu Wikimedia ga-eme ntuliaka malite n'August wee kwụsị na Septemba 2025 iji mejupụta oche abụọ (2) na Bọọdụ Foundation. Ị nwere ike ịhụ usoro iheomume nke usoro nhọrọ n'uju ebe a.

Àgwà pụrụiche

Wikimedia bụ Otu zuru ụwa ọnụ ma na-achọkwa ndị ga-eso azọ ọkwa site na gburugburu ngalaba otu zuru ụwa ọnụ. Ndị so azọ ọkwa a na-ewere dị ka ndị zuru oke maka otu ọrụ a bụ ndị na-echemi echiche, nwere nsọpụrụ, na-eche banyere otu ma nwee mmasị dabara na ebumnuche ozi Wikimedia Foundation. Bọọdụ a na-achọ ndị nwere mmụtara na nduzi atụmatụ Ọgbakọ, na-eweta mgbanwe, ma na akwado atụmatụ ebumnobi ogologo oge. Ndị so azọ ọkwa kwesịrị iche echiche banyere ahụmịhe na echiche ha ga-eweta na Bọọdụ.

Ndị otu Bọọdụ ga-achọ ịchọta echiche na olu ndị dị mkpa nke enweghị ezi mpụta ihe na Otu anyị. N'ụzọ ziri ezi, a ga-agwa ndị niile so azọ ọkwa ka ha tinye nkwupụta na nakwụkwọ anamachọ nsonye ha nke na-ekwu maka mmụtara ọrụ ha na ụwa, atụmatụ ha na-eweta na Otu a ma kọwaa otú ndị a si enyere ha aka ịgụnye ndị na-anọghị ebe a.

Ntinye oge nke ndị nlekọta atụkwasịrị ọbị

Ndị nlekọta ga-eje ozi afọ atọ ma nwee ike ije ozi ruo ugboro atọ n'usoro. Ihe a n'atụ anya bụ na ndị nlekọta jere ozi na opekata mpe otu n'ime kọmitii Bọọdụ. Oge atụrụ anya ha itinye bụ ihe dịka awa otu Narị na iri isi kwa afọ, wezuga emem njem. Anaghị ahazi Oge a n'ụzọ ziri ezi n'afọ niile. A na-etinye oge na gburugburu nzukọ.

Ihe atụrụanya iji bụrụ onye nlekọta atụkwasịrị obi

Asụsụ Bekee bụ asụsụ mmekọrịta nke Bọọdụ. Ndị na-azọ ọkwa ga-enwerịrị ezi mmụta nke odide na ọsụsụ asụsụ bekee. Mmụtara gara aga metụtara ejem ozi na Otu na-eme mkpebi, ọkachasị bọọdụ ma ọ bụ kọmitii, yana mmụtaara dị ukwuu na mwulite na nhazi nke Otu Wikimedia ka a na-atụ anya n'aka ndị na-azọ ọkwa. Ị nwere ike nyochaa ụkpụrụ ntụzịaka ndị so azọ ọkwa ebe a.

Otu esi etinye akwụkwọ anamachọ isonye

Ndị chọrọ iso azọ ọkwa sitere na ọrụ nakwa ngalaba niile tozuru oke iji bụrụ onye nlekọta Wikimedia ka anabatara itinye akwụkwọ. Ị nwere ike - ma ọ bụ onye ị maara - dabara nke ọma ịbanye na Board of Trustees nke Wikimedia Foundation? Gbaa ha ume iso zọọ ọkwa ọchịchị. Ndị so azọ ndoro-ndoro ochichi nwere ike ịchọta ozi ma zibanye nhọpụta ha na ibe ngwa ntinye akwụkwọ anamachọ isonye. Ọ bụrụ n’ịchọrọ ịmatakwu gbasara ọrụ nke Ndị Nlekọta ma ọ bụ nwee ajụjụ, rụtụ aka na ibe ihe nlebanya ndị na-adọ ndoro-ndoro ochichi.

Ajuju ndị ngalaba òtù nye ndi na-adọ ndoro-ndoro ochichi

Ebipụtala ajụjụ ndị ga-azọ ọkwa Board of Trustees ga-aza dị ka nke so ngwa akwụkwọ anamachọ isonye ndị ga-azọ ọkwa. Site na ndepụta ajụjụ ndị ngalaba otu webatara, kọmitii na-eme ntuliaka ahọrọla ajụjụ ise nke achọrọ ka ndị chọrọ ịzọ ọkwa zaa. Matakwuo maka ajụjụ ndị ngalaba otu na ibe Meta-wiki a.

Yagazie,

Kọmitii Ntuliaka na Kọmitii Ọchichị