Ntuliaka Wikimedia Foundation/2025/Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị/James Alexander
James Alexander (Jamesofur)
Jamesofur (talk • meta edits • global user summary • CA • AE)
| Ihe gbasara ndi na adọ ndọrọ ndọrọ ọchichi |
| |
|---|---|---|
| Candidate video statement | ||
| Ngụkọta ọnụ ọgụgụ okwu nọ na ngwa ndebanye akwụkwọ niile (ajụjụ a chọrọ ka azaa + ajụjụ nhọrọ) bụ `mkpụrụokwu puku abụo na narị ise. | ||
| Ị gụọla Ntozu kacha nta nke ihe ndị a chọrọ n'aka ndị na-adọ ndọrọ ndọrọ wee gosi na i mezuru ntozu kacha nta ya na ntozu ndị a chọrọ n'aka onye na-adọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị? | Yes | |
| Ị gụọla ntuziaka ndị na-adọ ọkwa nsonye n'ochichi | Yes | |
| Ajụjụ ndị a ga-azarịrị | ||
| ||
| Kedu ihe kpatara I ji chọrọ isonye na Board of Trustees Wikimedia Foundation ? Kedu ihe ị ga-enye aka mee? Kedu ihe ị ga-achọ ịmụtakwu? | Otu Wikimedia Movement abụrụla nnukwu akụkụ nke ndụ m. O nwetara m site na mahadum (n'ụzọ dị ịtụnanya, n'obere maka ọdịnaya yana ihe ndị ọzọ maka uru ahụike uche nke ọrụ afọ ofufo),o nyeere m aka ịchọta ọrụ ogologo oge m (na ntanetị na nchekwa teknụzụ), ma bụrụ ihe ndabere nke enwemenyi dị elu. Nke ahụ abụghị na mberede; Achọpụtara m ngwa ngwa na ọ bụghị naanị na m chọtara ndị otu m, mana nke bụ njem nke ezigbo mkpa zuru ụwa ọnụ. Ihe ọmụma efu dị oke mkpa iji kwalite uto, udo, na nghọta zuru ụwa ọnụ. Ịdị mfe mnweta ihe ọmụma bịara bụrụ ihe dị mkpa na afọ ndị na-adịbeghị anya. Njem Wikimedia na-ewulite ntọala nke ihe m tụrụ anya na ọ ga-abụ usoro ihe owuwu na-eto eto, mana a na-atụkwa egwu na ọ na-esiwanye ike na atụmanya di iche nye ụwa.
Achọrọ m ịnọgide na-ejere otu a ozi ugbu a nakwa n'ọdịnihu. Ka ọrụ m na-eto, ike na mmasị m abawanye. E sonyeere m kọmitii nnyocha nke bụ Wikimedia Endowment Boards Audit Committee n'afọ gara aga n'ihi na m kwenyere na nka na mmụtara m nwere ike inye aka chekwa ọdịnihu Njem a. Isonyewanye na njem a na ọrụ a emeela ka mkpebi m sikwuo ike. Ọ dịla anya m tụlere ịzọ ọkwa na bọọdụ Foundation, mana achọrọ m ichere ruo mgbe m nwere ike inye aka zuru oke. Ma Oge ahụ bụ ugbu a. Anyị nwere nnukwu ndị nlekọta atụkwasịrị obi nwere ọtụtụ nka dị iche iche m ga-achọ ịmụrụ ihe na ha mana ekwenyere m na nzụlite m ga-emeju nke ha. Enwere m mmụtara afọ iri na asatọ karịa na otu a ma nwee nzere na ngalaba akụ na ụba. Ọrụ ọkachamara m n'oge na-adịbeghị anya na-elekwasị anya na ụkpụrụ omume na nchebe iji AI na nkà na ụzụ azụmahịa, enwekwara m mmụtara afọ iri na ise karịa na arụmọrụ na nchekwa ntanetị, tinyere ihe karịrị afọ asatọ na Wikimedia Foundation, ebe m bụụrụ onye ndu ntụkwasị obi na nchekwa mbụ ka nzukọ na Njem na-eto n'ike. Foundation na Njem a na-anọ n'ọnọdụ pụrụ iche mgbe niile, n'ịkwado mkpa ọ dị ịghọta ihe gara aga, ihe dị ugbu a, na nke na-abịa na ọdịnihu ma mee ka ha nọgide na-adị mfe mmadụ niile inweta ma inwe ike iji ya mee ihe ka teknụzụ na-agbanwe. Ọ dịla anya anyị nọ na ebe nko obi n'elu ka ụwa gbara anyị gburugburu na-agbanwe. Achọrọ m ịbụ otu n'ime ndi nsonye ga enyere anyị aka na nduzi site na mgbanwe a, isonye na bọọdụ bụ ụzọ kachasị mma iji mee nke ahụ. | |
| Biko kọwaa mmụtara inweerala na Wikimedia (dịka ntinye aka na ọrụ Wikimedia, isonye na otu Wikimedia ma ọ bụ otu ndị mmekọ, mmemme dịka onye nhazi njem Wikimedia, ma ọ bụ isonye na otu njikọaka Wikimedia movement). | E mepere akaụntụ m ji eme ihe ugbu a na 2006. Enwere ike ịnwe otu ma ọ bụ abụọ (ma ọ bụ na enweghi) nke akaụntụ ndezi tupu nke ahụ, mana enwebeghị m ike ịchọta ndị ahụ. Enwere m obere ntinye aka n'ime afọ ole na ole mbụ mana m wee malitegharịa n'afọ 2009. Ụfọdụ isi ihe gụnyere:
Site na Ọgọst 2010 ruo Disemba 2018, arụrụ m ọrụ na Wikimedia Foundation, ebe m nwere ikike dị ukwuu n'ịchọpụta ihe m lekwasịrị anya. N'ịdị mkpa ọrụ ahụ dị, aga m akọwapụta ụfọdụ isi ihe, ọtụtụ n'ime ha na-aga n'ihu taa:
| |
| N'echiche gị, kedu ihe Wikimedia Foundation kwesịrị ịlekwasị anya n'ime afọ atọ ruo afọ ise na-abịa, gịnịkwa mere i ji họrọ ihe ndị a dị ka ihe ndị kacha mkpa? | A ga-enwe ihe ọhụrụ na ihe ndị na-agbanwe agbanwe anyị kwesịrị ilebara anya, mana ụfọdụ ga na-apụtawanye ihe mgbe niile n'ime afọ ole na ole ga-abịa:
| |
| Biko kọwapụta mmụtara gị nke metụtara ndị otu na-achị achị (ndị na-anaghị akwụ ụgwọ ma ọ bụ ndị na-erite uru), ma kọwapụta ebe ọrụ gị lekwsịrị anya ya nakwa oke uto nke nzukọ a (n'ihe gbasara ọnụọgụ ọrụ, mmefu ego, ọnụọgụ ndị nọ na ya, ma ọ bụ usoro ndị ọzọ bara uru) nakwa otu bọọdụ ahụ ha. | Ndị bọọdụ Wikimedia ga-abụ kọmitii ọchịchị kacha ukwuu m tinyere aka na ya, ma otu ihe n'ime ọtụtụ kpatara m ji chọrọ isonye bụ ma mmụtara ya. N'agbanyeghị nke ahụ, esowo m òtù ndị na-achị isi ruo ọtụtụ afọ. N'usoro nhazi a:
| |
| Ajụjụ ndị (a ga-azarịrị) si n'aka ndị ngalaba òtù | ||
| Ajụjụ ndị a bụ sitere n'aka ndị ngalaba otu. A chọrọ ka Ị zaa ajụjụ ndị a iji mee ka ndebanye anamachọ nsonye gi zuo oke. Ọ bụrụ na mpaghara a ezughị oke site 23:59 n'ebe ọ bụla n'ụwa, na Julaị 8 (11:59 UTC, Julaị 9), agaghị elebe anya na ndebanye gị. | ||
| Kedu otu ị ga-esi eme atụmatụ ịhụ na-enwere nghọta doroanya na ịza ajụjụ na usoro ịme mkpebi gị dịka onye otu Board of Trustees? | Ọ bụ ezie na ọtụtụ mkparịtaụka na arụmụka kwesiri inwe ogo idị nzuzo (nwere ike ịbụ nwa oge ma ọ bụ nke na-adịghị agwụ agwụ), anyị ga-agbalịsi ike ka ọ bụrụ ihe doro anya dịka o kwere mee iji kwado ọchịchị kwesịrị ekwesị na ịkwụwa aka ọtọ. Ebe ọ bụla enwere ike, a ga m agbali ka enwee odudo anya na nzukọ, mkparịtaụka, na mkpebi anyị, ọ bụghị naanị maka mpụtaara ha kama maka ihe kpatara ya. M ga-ewepụta onwe m maka ajụjụ ma ọ bụ nchegbu ọbụlagodi na m enweghị m ike ịnye mmadụ azịza ozugbo ha chọrọ ozugbo, ọkachasị mkpa ọ dị ikwe ka ndị ọrụ Foundation rụọ ọrụ na-enweghị mmetụta na-ezighi ezi site na Board. Ụdị nzaghachi a dị mkpa iji ghọta ihe na-eme gburugburu Otu a nke ọma. | |
| Gịnị ga-abụ nsogbu ọhụrụ mbụ ị ga-achọ iweta ná nlebanya nke Bọọdụ maka mkparịtaụka, oleekwa otú ị ga-esi soo ya? | Eji m n'aka na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ isiokwu ọ bụla m nwere ike iche maka ya ka a tụlere ma ọ dịkarịa ala na nzukọ Bọọdụ ma ọ bụ n'etiti ndị otu Bọọdụ, yabụ na ọ gaghị abụ okwu ọhụrụ kpamkpam. N'agbanyeghị nke ahụ, ewezuga nhọpụta doro anya nke onye isi oche ọhụrụ, ọ ga-amasị m ịkọwa otú anyị si esochi mgbanwe teknụzụ na AI . Anyị ga-esochi nke a n'ụzọ dabara adaba, na-ebunuche ojiji ma mpụga na nke ime na iche echiche maka ọdịnihu. Mmụtara ọrụ m na nlekwasị anya n'iwụlite ngwaahịa AI dị mma, tinyere ntinye aka ogologo oge m na Njem a, na-eweta ezi ntunye dị mkpa na Otu a. | |
| Kedu ka ekwesịrị isi soo mkpebi gbasara mwebata na mwepu na ihe ndịe kwesiri ilebanya na teknụzụ Wikimedia ma ọ bụ mpaghara ngwaahịa? Biko kọwaa ihe nke a bụ n'uche gị. | A na-enwe mwepụ ma ọbụ nnabata mgbe niile na ọrụ nhazi , nke nwere ike bụrụ nke teknụzụ ma ọ bụ n'ụzọ ọzọ. Mgbe ụfọdụ, nke a bụ maka ego ma ọ bụ ihe ọrụ; ị nwere ike ịkwụ inye ego ọrụ ma kwado ọtụtụ ihe. N'oge ndị ọzọ, ọ na-abụ maka ọrụ na nnweta na ogo uto dị mfe. Ọrụ Wikimedia na ozi ngalaba otu gasi na-emepụta ga-anọgide na-adị mfe mnweta ma dị mfe ịmepụta, mana nke ahụ apụtaghị na ọ ga-ahapụ ime ihe di ire gbasara uto teknụzụ ma ọ bụ jiri ngwaa ochie ruo mgbe ebighị ebi n'ihi ojiji ngwa ochie ma ọ bụ ọchịchọ nlekwasị otu ebe. Anyị ga-eme ya karịa ọtụtụ, mana anyị enweghị ike ime ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ dị mkpa isochi nhọrọ na mwepu na mwebata si n'iji usoro nnyocha ego ọ ga-eri/uru ọga-aba. Ọ bụrụ na ị nwere ike itinye obere ego ma ọ bụ obere oge iji nọrọ na-arụ ọrụ, e kwesịrị ime ya. Ọ bụrụ na uru ma ọ bụ ego sitere na mgbanwe ahụ dị ịrịba ama, mgbe ahụ ị ga-ebelata ọnụahịa nke mgbanwe ahụ, ọkachasị na ngalaba otu na-arụkọ ọrụ ọnụ dị ka nke anyị. Mgbanwe ndị buru ibu kwesiri inwe nnyocha dị mkpa nke mmata uru nwa mgbe ya na uru dị ogologo, nke na-eme m ịdabere na uru ogologo oge. Otú ọ dị, ọ dị mkpa inyere aka belata mmefu dị obere ị nwere ike inweta, n'ihi na ọ bụghị ya, ị nwere ike chufuo ndị na-enye aka ma ọ bụ ezi uche ruo ogologo oge karịa ka ị tụrụ anya. | |
| Ọnụọgụ ndị mmekọ Wikimedia abawanyela nke ukwuu n'ime afọ ole na ole gara aga, mana ịgba mbọ hụ na inweta akụrụngwa zuru oke nwere ike bụrụ ihe ịma aka. Tinyere nke a, kedu ka anyị ga-esi lebagharịa echiche anyị gbasara gburugburu ọrụ anyị, tinyere otu esi enyocha, ejikọ na ọrụ, nakwa nnweta enyemaka nke ndị mmekọ? | Mmụba nke ndị mmekọ abụrụla nnukwu ihe agamnihu dị mma maka gburugburu Otu kemgbe ọtụtụ iri afọ, ọkachasị na ụdị ndị mmekọ dị iche iche nke na-enye ohere maka nkwado lekwasịrị anya na mmepe nke ngalaba otu niile. Anaghị m eme ka ọ bụrụ na m bụ ọkachamara na ọgbọ mmekọ zuru ụwa ọnụ, ya mere achọrọ m ige onye ọ bụla na-etinye aka ugbu a nakwa na ọdịnihu ntị nke ọma. N'agbanyeghị nke ahụ, ihe m na-enyo enyo ugbu a bụ na anyị nwere ike chọ ịdabere na ngalaba otu nọ na mpaghara yana nke dị nnukwu tozuru oke iji nyere aka jikwaa ohere akụrụngwa nke nwere oke mgbe niile. Echeghị m na ọ bụ ihe ka mma ịchọ ka ndị isi ngalaba otu dị ala nwee ike ịrụ ọrụ otu ndị tozuru oke na obere ọnụ ọgụgụ, ya mere a ga-enye ikikere ọrụ ntozu a ụlọ ọrụ nwere ngalaba gasị ma ọ bụ otu ndị nkwado, ma ọ bụ nke nkịtị ma ọ bụ nke ama ama, na-enye anyị ohere ịnweta obosara anyị chọrọ na ntozu oke anyị kwesịrị inwe iji họrọ nkesa ngwaọrụ ma hụ na enwere nghọta dor anaya na idi mfe mmegharị. | |
| Dika onye isi oche (CEO) Wikimedia Foundation na-apụ n'ọkwa, kedu àgwà ị kwenyere na onye ndu na-abata kwesịrị inwe, kedu ka ndị a ga-esi kwado aganihu nke otu Wikimedia? | Dika Foundation na Njem anyị toorola, ihe a na-atụ anya na ndi isi ochichi abawanyelakwa ruo n'ókè na anyi na-acho onye zuru oke. Ikwu nke a, anyị chọrọ onye nwere ike idu ndu zuru ọnụ na dukwa ọha. Ha bụ ihu nke Foundation ma na-ahụkarị ha dịka ihu nke Njem a, ma ọ masịrị anyị ma ọ bụ na ọ masịghị anyị. Ha ga-enwerịrị ike ime ya nke ọma gburugburu ụwa. Anyị chọkwara onye bụ ọkà mmụta teknụzụ. Ọ dịchaghị mkpa inwe ọzụzụ nkịtị ma ọ bụ ọbụna mmụtara na mpaghara ndị a (n'agbanyeghị na ọ nwere ike inye aka). N'agbanyeghị nke ahụ, ha ga-enwerịrị nnabata gbasara teknụzụ ma kwupụta mkpa teknụzụ na ọrụ anyị dị. N'ezie, ha ga-abụ onye otu ngalaba otu anyị zuru ọnụ. O nwere ike anyị amatabeghị ndị ha bụrịị, ma ha kwesịrị ịma ndị anyị bụ. | |
| Ajụjụ nhọrọ - mmụtara ọkachamara, nka na agụmakwụkwọ | ||
| Ajụjụ ndị a bụ nke enwere ike ịhọrọ. Azịza ya ga-agbakwunye na njedebe mkpuruokwu na ndebanye gị. (Nchetara: Ị gaghị enwe ohere ndị ọzọ iji nye nkọwa ozi ndị a). | ||
| Biko kọwaa mmụtara ọrụ ọkachamara gị na mkpa ọ dị na ọrụ Bọọdụ. | After working at the Wikimedia Foundation for just over eight years, I worked in Trust & Safety at Twitter from January 2019 until March 2023. There, I led the Illegal Content & Media Operations team, overseeing automated and manual policy enforcement on multi-media content (audio, images, video) as well as content involving terrorism, child safety, and regulated goods. The work there was widespread and varied, encompassing everything from building proper moderation tooling to developing AI detection models for audio and visual media. The global team I led grew to a maximum of 25 full-time employees and 1,500-2,000 indirect contractors. Over the last six months or so, I transitioned to leading our wider safety platform team on the Product side, as well as overseeing the teams that handled internationalization and T&S Project Management. It was challenging work but enormously valuable for me to learn how to manage larger teams and budgets and engage with a diverse range of executive and board-level leaders, from Yoel Roth to Elon Musk.
After a short break from work, where I spent time working with industry groups to discuss AI and moderator safety, as well as restarting my obsession with swimming (ask if you want an earful), I joined Salesforce as a member of their Office of Ethical and Humane Use policy team, where I remain today. There, I focus on content safety across all our products, as well as product and consumer policy for our in-house AI models and AI-driven consumer products. I hope to bring this experience to the Board as we discuss our strategic direction in this space. | |
| Biko kọwaa otu i siri jikwa, ma ọ bụ dụọ ndị ọzọ ọdụ, na nsogbu dị mgbagwoju anya na nzukọ. Kedu ka gị na ndị ọzọ siri rụọ ọrụ iji dozie ọnọdụ ahụ? Gịnị bụ mgbanwe nke si ná mgbalị gị pụta? | Unfortunately, many examples can’t be discussed publicly, but one more visible case was Twitter’s 2020 shift to remote work. We wanted to ensure that our thousands of contracted moderators worldwide could continue working safely from home. I was part of the leadership task force that drove this, setting up security protocols and home systems while continuing to pay them. Though some couldn’t work for days or weeks, the transition was successful, and strengthened their loyalty to the company and our mission. | |
| Biko kọwapụta usoro mmụta gị, gụnyere nzere, asambodo na usoro ọmụmụ ịgụchara, yana mkpa ha dị n'ọrụ Bọọdụ. | I hold a bachelor's degree in Economics, which, although I've never been an economist, has helped me better understand finances, investments, and the broader economy. This will be particularly helpful for the Board, as we've several other great board members with financial experience as well. | |
| Biko tinye njikọ ọ bụla dị mkpa na-akọwa nzụlite ọkachamara gị, mmụtara, profaịlụ gị (dị ka LinkedIn, ibe ndị ọrụ, dgz). | ||
| Ajụjụ nhọrọ - Mmụtara dị ka onye ndu | ||
| Ajụjụ ndị a bụ ajụjụ nhọrọ. Azịza ya ga-agbakwunye na njedebe mkpuruokwu na ndebanye gị. (Nchetara: Ị gaghị enwe ohere ndị ọzọ iji nye nkọwa ozi ndị a). | ||
| Biko kọwaa ụzọ ị nyeerela aka igbo ihe mgbochi n'etiti ọtụtụ ngalaba otu (dị ka site n'ịrụ ọrụ na mpụga wiki ngalaba gị, ma ọ bụ ịrụ ọrụ na mmekorita n'etiti ndị mmekọ). | I'm proud to say that this has been a significant part of my career, both professionally and as a volunteer, whether that's as an OTRS team member, a global sysop, or an elections coordinator in San Francisco. Every community is a combination of other communities, and it's crucial to recognize this and continually support and bridge those around you. | |
| Ị nwere ike ịkọwa amụma, na wiki ma ọ bụ na mpụga wiki, nke ị nyere aka mepụta ma ọ bụ gbanwee? Kedu ihe ị mụtara na mmụtara a? | ||
| Kedu ka ị siri kwado inye ndị mmadụ iji mee ka a nụ olu ha? | ||
| Ị nwere ike ịkọwa otu ị siri gosipụta ike iduzi ndị ọzọ n'ịdozi nsogbu, inabata mgbanwe ma ọ bụ imezu ebumnuche, karịsịa n'ọkwa ọchịchị ma ọ bụ njikwa? | ||
| Ajụjụ nhọrọ - Echiche e chezimara nke ọma | ||
| Ajụjụ ndị a bụ ajụjụ nhọrọ. Azịza ya ga-agbakwunye na njedebe mkpuruokwu na ndebanye gị. (Nchetara: Ị gaghị enwe ohere ndị ọzọ iji nye nkọwa ozi ndị a). | ||
| Biko kọwaa mmụtara gị na nsonye ma ọ bụ nduzi otu nzukọ n'nhazi maka ọdịnihu ya. Kedu ka ọrụ gị si tinye aka n'ịhọrọ ụzọ dị mma nke nzukọ a? | ||
| Verification | Identity verification performed by Wikimedia Foundation staff and eligibility verification performed by the Elections Committee | |
| Eligibility: |
Identification: Verified by: – NahidSultan (WMF) (talk) 05:03, 16 July 2025 (UTC) | |
