Jump to content

Ntuliaka Wikimedia Foundation/2025/Ndị na-adọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị/Lane Rasberry

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation elections/2025/Candidates/Lane Rasberry and the translation is 100% complete.

Lane Rasberry (bluerasberry)

bluerasberry (talk meta edits global user summary CA  AE)

Ihe gbasara ndi na adọ ndọrọ ndọrọ ọchichi
Lane Rasberry, Wikimedian in Residence at the School of Data Science at the University of Virginia
  • Ihe gbasara mmadụ:
    • Aha: Lane Rasberry
    • Ebe o bi: United States
    • Asụsụ: English
  • Ihe ndepụta:
    • Mgbe obanyere otu ndi Wikimedia: 2004
    • Wiki nke ọ na akpa ike: English Wikipedia, Wikimedia Commons, Wikidata
Candidate video statement
Ngụkọta ọnụ ọgụgụ okwu nọ na ngwa ndebanye akwụkwọ niile (ajụjụ a chọrọ ka azaa + ajụjụ nhọrọ) bụ `mkpụrụokwu puku abụo na narị ise.
Ị gụọla Ntozu kacha nta nke ihe ndị a chọrọ n'aka ndị na-adọ ndọrọ ndọrọ wee gosi na i mezuru ntozu kacha nta ya na ntozu ndị a chọrọ n'aka onye na-adọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị? Yes
Ị gụọla ntuziaka ndị na-adọ ọkwa nsonye n'ochichi Yes
Ajụjụ ndị a ga-azarịrị
  • A choro ajụjụ ndị a iji họrọ ndebanye anamachọ nsonye gị ka nke zuru oke. Ha ga-enyere ndị ngalaba otu aka ikpebi onye ha ga-atụrụ vootu. Ọ bụrụ na mpaghara a ezubeghị ezu malite na 23:59 ebe ọ bụla n'ụwa, na Julaị 8 (11:59 UTC, Julaị 9), agaghị eleba anamacho nsonye idebatara anya.
  • A na-atụ anya ka ndị na-adọ ndoro-ndoro nwe mmụtara nke nhiwe Wikimedia ma ọ bụ otu yiri ya.
  • Achọrọ ka ndị na-achọ nsonye na ọchịchị a nwee mmụtara na-ije ozi n'otu ndị na-eme mkpebi, dị ka bọọdụ ma ọ bụ kọmitii ma nke a ga-egosipụtakwa na ndepụta anamachọ nsonye gị. Biko nye nkọwa doro anya otu ị nwere ike gbasara afọ ndị i jeerela ozi na ozi ndị ọzọkwa.
Kedu ihe kpatara I ji chọrọ isonye na Board of Trustees Wikimedia Foundation ? Kedu ihe ị ga-enye aka mee? Kedu ihe ị ga-achọ ịmụtakwu? Wikipedia bụ naanị nhiwe Ịntanetị ebe ndị ọrụ na-achịkwa ụkpụrụ, ụkpụrụ omume, mmefu ego, na ihe niile. Nke a bụ ntuliaka kachasị mkpa na Ịntanetị, ma votu gị nwere mmetụta zuru ụwa ọnụ, nke na-agbanwe akụkọ ihe mere eme! Dị ka onye nlekọta atụkwasịrị obi, m ga-agwa ndị mgbasa ozi nakwa ụwa na Wikimedia Foundation na-echebe, na-azụ, ma na-akwado ndị na-eme ntụliaka dị ka gị ịchịkwa ma na-ejịkwa Wikipedia.

Nke a bụ ọkwa m gasị:

  1. Ndị ọrụ afọ ofufo bụ nke mbụ, teknụzụ bụ nke abụọ Anyị na-eche nrụgide ihu ime mkpebi gbasara iji teknụzụ dochie njikọ mmadụ na mmadụ na Wikipedia. Wikipedia na-arụ ọrụ n'ihi na ndị ọgụụ na ndị ọrụ afọ ofufo tụkwasịrị ya obi, ya mere, mgbe nkà na ụzụ na-ebelata ntụkwasị obi ahụ, anyị kwesịrị ịkwụsịlata ma jụọ ndị ọrụ ihe ha chọrọ. Esemokwu teknụzụ e nwere na nso nso a bụ Wikimedia Foundation wepụtara atụmatụ ha dere nke ọgụgụ isi ọdinaya ederede aka mere (AI) nke a chọrọ iji dochie anya ederede Wikipedia. Mana itụnanya na nghọtahie ha bụ na ndị mmadụ achọghị nke a. Anyị chọrọ mkparịtaụka ndị ọrụ zuru ụwa ọnụ iji duzie mkpebi mmekọrịta ọha na eze na ụkpụrụ anyị na-eji nakwa nhọrọ teknụzụ anyị n'eme. Ugbu a mkparịtaụka ndị ahụ adịghị, mana m ga-akwalite ha!
  2. Ime ndezi na Wikipedia abụghị mpụ Ndị na-edezi Wikipedia n'ọtụtụ mba na-eche mkpagbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ihu na mkpagbu maka ịdezi ọdịnaya enyochara dị ka eziokwu. Egwu ndị ọrụ na-abịa site na USA, India, UK, na Belarus, mana nnukwu nsogbu bụ na anyị enweghị ọgbakọ ngalaba otu ga-azaghachi nnukwu mmaja na obere mkpagbu ndị a. N'ọ̀tụ̀ nta, ana m akwado maka nchekwa site na Wikimedia LGBT+ na maka neurodivergent editors. Ndị otu ndị a ahazielarị maka nchekwa, ma ọ bụrụ na anyị na-akwado otu ndị a dị ka ihe nnwale, mgbe ahụ anyị nwere ike ịkwado onye ọ bụla.
  3. Zulite ọgbọ ndị isi na-esochi N'afọ 2024, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri nke mkparịtaụka gbasara nkesa ọchịchị n'etiti Wikimedia Foundation na ndị ngalaba otu ndị ọrụ kụrụ afọ n'ala mgbe ndị ọrụ tụrụ vootu maka nnabata nke Movement Charter,ma Wikimedia Foundation akwadoghi ya. Ma enweghi atụmatụ ma ka agamnihu ya. Ọ bụrụ na anyị emeghị ihe ọ bụla, ọdịda Charter ga-aga n'ihu na-enyefe ike ọchịchị site n'aka onye ọrụ-gaa n'ọchịchị ụlọ ọrụ. Atụmatụ ntuziaka anyị tụrụ na Tinye ego na ntolite nke onye ndu afọ ofufo dị ka ụzọ isi wepụta ikike na ngalaba otu mgbe ọ bụla enwere ike. Ọ bụrụ na ahọpụta m, m ga-akwado maka nnyefe ikike nye ndị ọrụ.
Biko kọwaa mmụtara inweerala na Wikimedia (dịka ntinye aka na ọrụ Wikimedia, isonye na otu Wikimedia ma ọ bụ otu ndị mmekọ, mmemme dịka onye nhazi njem Wikimedia, ma ọ bụ isonye na otu njikọaka Wikimedia movement). Enwere m oke ntinye aka dị elu na Wikimedia .

Ọtụtụ ndị editọ Wikipedia anaghị esonye otu ma nke ahụ dịkwa mma, mana ọ bụrụ m, iosnye n'otu na-amasị m. Anọọla m na ntinye aka n'ọrụ afọ iri karịa na Wikimedia New York City, Cascadia Wikimedians, na Wikimedia Bangladesh. Ehiweelala m narị mmemme karịa na nzuko maka Wikimedia NYC, ọgbakọ ndị m haziri gụnyere Queering Wikipedia na WikiConference North America, etinyekwara m aka na mmalite Wikimedia LGBT+ na Wikimedia Medicine ma na-etinyesi aka ike na ha. Mmụtara m nwetarala bụ na anyị na-enwe ọganihu ngwa ngwa mgbe otu dị iche iche na-achọsi imekọ ihe ọnụ ike.

Enwere m ndezi 50k na Wikipedia, 10k na Commons, yana 100k na Wikidata.

Enyela m ọtụtụ narị Okwu na ajụjụ ọnụ na Wikipedia nye ebe mgbasa ozi nakwa ọgbakọ.

Abụ m onye ndezi akwụkwọ akụkọ Wikipedia Bekee, Signpost.

N'echiche gị, kedu ihe Wikimedia Foundation kwesịrị ịlekwasị anya n'ime afọ atọ ruo afọ ise na-abịa, gịnịkwa mere i ji họrọ ihe ndị a dị ka ihe ndị kacha mkpa? Ihe kacha mkpa bụ inwe ike ịhazi mkparịtaụka bara uru n'etiti ngalaba otu nọ na ịntanetị na Wikimedia Foundation gbasara isiokwu ndị siri ike. Gbasara nsogbu ndị anyị na-eche ihu, mnweta ọsịsa ya bụ na Wikimedia Foundation na ndị ọrụ Wikimedia kwesiri na ha ga enwe mkparịtaụka ka mma na onwunwe ntụkwasị obi n'etiti onwe ha.

Anyị na-eche ihe ịma aka dị egwu chere na-ama ọdịdị Wikipedia aka. Dịka ọmụmaatụ, gọọmentị United State na-akpagbu ndị editọ na na-eyi egwu iwepụ ọkwa iwu Wikipedia. Anyị nwere nnukwu ihe iyi egwu sitere na gọọmentị aka ndị ọzọ, ọbịbịa nke AI, na ụfọdụ mba nke ndị editọ Wikipedia bụ ndị a na-ahapụ mgbe ime mkpebi. Anyị kwesịrị ịkparịtaụka n'etiti onwe anyị, zụọ ndị ọrụ afọ ofufo mpaghara ịgwa ndị mgbasa ozi okwu, yana nwetakwa ndị nnyocha, ndị nta akụkọ, na ndị mmekọ ndị ọzọ na-anaghị ana ego ka anyị ha na kparịta ụka maka ihe ịma aka.

Ihe kacha mma nwere ike ime Wikimedia Movement bụ ka Wikimedia Foundation na ngalaba otu ndị ọrụ ka ha hụ ibe ha n'anya 💙.

Biko kọwapụta mmụtara gị nke metụtara ndị otu na-achị achị (ndị na-anaghị akwụ ụgwọ ma ọ bụ ndị na-erite uru), ma kọwapụta ebe ọrụ gị lekwsịrị anya ya nakwa oke uto nke nzukọ a (n'ihe gbasara ọnụọgụ ọrụ, mmefu ego, ọnụọgụ ndị nọ na ya, ma ọ bụ usoro ndị ọzọ bara uru) nakwa otu bọọdụ ahụ ha. Kemgbe afọ 2018 abụrụla m onye isi nchọpụta maka nchocha Wikipedia na Ụlọ Akwụkwọ nke Sayensị Data na Mahadum Virginia. Ana m enweta ndụmọdụ ndị ọkachamara site na ngalaba mahadum na enyemaka ụmụ akwụkwọ nchọcha nọ na ngalaba amụma ọha, ndekọ ego, sayensị kọmputa, ngalaba m, na ebe niile. Dịka onye nlekọta atụkwasịrị obi, ngwa ọrụ mahadum ndị a ga-akwado ọrụ bọọdụ m ma nyere m aka ịkparịtaụka nke ọma na bọọdụ, mgbasa ozi na ndị ojiji ịntanetị.

E jikwara m mmemme Wikipedia na Consumer Reports, nke bụ consumer organization na United States. Anyị kwalitere ederede Wikipedia maka nchekwa ahụike.

Kemgbe afọ 2007 a na m arụ ọrụ na bọọdụ ụkpụrụ omume maka nyocha isiokwu mmadụ na vaccines for HIV/AIDS na HIV Vaccine Trials Network.. Nchọpụta ahụ zuru ụwa ọnụ, ebe m na-akwado maka ịnweta ozi n'ịntanetị.

Anọ m na bọọdụ nke otu ndị ọrụ mahadum nke mpaghara m, yana njikọ na Communication Workers of America.

Ọrụ ndị a niile tinyere m n'ọnọdụ ijikwa ọrụ, mmefu ego na atụmatụ.

Ajụjụ ndị (a ga-azarịrị) si n'aka ndị ngalaba òtù
Ajụjụ ndị a bụ sitere n'aka ndị ngalaba otu. A chọrọ ka Ị zaa ajụjụ ndị a iji mee ka ndebanye anamachọ nsonye gi zuo oke. Ọ bụrụ na mpaghara a ezughị oke site 23:59 n'ebe ọ bụla n'ụwa, na Julaị 8 (11:59 UTC, Julaị 9), agaghị elebe anya na ndebanye gị.
Kedu otu ị ga-esi eme atụmatụ ịhụ na-enwere nghọta doroanya na ịza ajụjụ na usoro ịme mkpebi gị dịka onye otu Board of Trustees? Ana m enye ajụjụ ọnụ na mgbasa ozi, m na-ebipụta vidiyo na YouTube, M na-ebipụta dị ka onye nchọcha, A na m edere The Signpost akwụkwọ akụkọ, ma mee ihe ọ bụla m nwere ike ime iji nweta nlebara anya. M ga-eme ka a mata nghọta doro anya na ịza ajụjụ site n'ime ihe m na-eme mgbe niile, nke bụ ikwu okwu n'ịntanetị.

Eguzobere m ọrụ Right to Information na Meta-Wiki niihi na afọ gara aga, achọrọ m ozi, enweghị m ike ịchọta ụzọ m ga-esi kparịtaụka nye Foundation. Dịka onye nlekọta atụkwasịrị obi, a na m agba ndị ngalaba otu ume ka ha hazie izitere m rịọ arịrịọ ozi ọha ha.

Gịnị ga-abụ nsogbu ọhụrụ mbụ ị ga-achọ iweta ná nlebanya nke Bọọdụ maka mkparịtaụka, oleekwa otú ị ga-esi soo ya? Achọrọ m ịnweta ndekọ gbasara ego Wikimedia Foundation ka m wee nyochaa ha na mahadum m, ma ọ bụ ikwu ya n'ụzọ ọzọ, WMF nwere ike ịpụta kpọmkwem n'ikwu na ọ chọghị ịkesa ozi a. Ugbu a akụkọ gbasara ego WMF enweghị nkọwa zuru oke nye ngalaba otu ndị ọrụ. Anyị chọrọ nghọta doro anya na akụkọ ndị ahụ ka ndị Wikimedia na ngalaba otu ọ bụla wee mara ego Foundation na-emefu n'aha ha, yana ihe bụ atụmatụ mmepe gbasra ngalaba otu ahụ.

Akụkọ kachasị ọhụrụ bụ latest report says that 34% of the money is "support for volunteers", ma e wezụga ntuliaka a maka ndị nlekọta atụkwasịrị obi, ndị ọrụ afọ ofufo enweghị nkọwa zuru ezu na otú e si eji aha ha na nhọrọ ole na ole iji lelee otú e si emefu ego .

Ọtụtụ n'ime ngalabaotu ndị ọrụ anyị na-eme mmemme site na mba ma ọ bụ asụsụ, yabụ ọ bụrụ na Wikimedia Foundation nyere nghọta doro anya gbasara mmefu ego na mpaghara, mgbe ahụ ọ ga-adịrị ndị ngalaba otu mfe ịhazi atụmatụ nke ha, were ụmụ akwụkwọ ndekọ ego na azụmaahịa dị ka ndị na-enye ndụmọdụ, nye nzaghachi na mmefu ego nke onwe ha, wee hazie ntụzịaka nke ha n'ọdịnihu n'achọghị ka onye sitere na omenala ọzọ banye na Wikimedia Foundation . Ndị Ngalaba otu Wikimedia chọrọ nnwere onwe na ike ịhazi ọdịnihu nke ha ma ha mara ihe ihe ọrụ ole ha nwere. Enweghị nziru ozi bụ nsogbu anyị karịa ikwu eziokwu na anyị nwere ụkọ akụrụngwa.

Kedu ka ekwesịrị isi soo mkpebi gbasara mwebata na mwepu na ihe ndịe kwesiri ilebanya na teknụzụ Wikimedia ma ọ bụ mpaghara ngwaahịa? Biko kọwaa ihe nke a bụ n'uche gị. Ihe mere anyị ji kwe ka ndị ọrụ tụọ votu maka ndị nlekọta ha chọrọ bụ ka ndị ọrụ nwee ike nwee ike na usoro mkpebi a. N'ihi ya, otu mgbakọ na mwepu dị mkpa bụ mbawanye nsonye ngalaba otu yana ịhapụ ụfọdụ mkpebi n'aka ndị ọkachamara.

Enwere ọtụtụ akụkụ nke ebe ọrụ Wikimedia nke na-arụ ọrụ nke ọma na-enweghị oke nsonye ngalaba otu. Na Mee 2025, Wikidata had a graph split maka WikiCite, ọ chọkwara mkpebi ndị ọkachamara maka nchekwa data. Ọtụtụ narị ndị ọrụ emetụtara na-arụ ọrụ sayensị mepere emepe chọrọ ka Wikidata rụọ ọrụ, mana ha achọghị ịmụta imewe nchekwa data A kọwara m nsogbu teknụzụ ka were ike isi mee, na nzaghachi, ndị ọrụ Wikimedia Foundation nyere m nzaghachi na kwado imepụta ndepụta nke ngalaba otu obodo. Mmụtara a na-egosi na mgbe mmelite teknụzụ na-akpaghasị ndezi onye ọrụ, mgbe ahụ ndị mmepụta ngwa Wikimedia na-ekesa ozi na-enweta nkwado ngalaba otu.

Usoro ọzọ nke na-arụ ọrụ nke ọma nke puku kwuru puku ndị sonye ngalaba otu nọ bụ Community Wishlist, ebe onye ọ bụla nwere ike ịrịọ atụmatụ ndị ọrụ ga-ewulite ma ndị ọzọ nwere ike ịtụ vootu iji kwado ya.

Mnweta ọsịsa na-abụkarị inwe mkparịtaụka iji wulite ma jikwa ntụkwasị obi.

Ọnụọgụ ndị mmekọ Wikimedia abawanyela nke ukwuu n'ime afọ ole na ole gara aga, mana ịgba mbọ hụ na inweta akụrụngwa zuru oke nwere ike bụrụ ihe ịma aka. Tinyere nke a, kedu ka anyị ga-esi lebagharịa echiche anyị gbasara gburugburu ọrụ anyị, tinyere otu esi enyocha, ejikọ na ọrụ, nakwa nnweta enyemaka nke ndị mmekọ? Ọ dịtụbeghị mgbe anyị nwere usoro iji nyochaa mmetụta nke ngalaba oyu Wikimedia. Affiliates na-ede akụkọ gbasra ihe emepụtara kwa afọ wee gosi metrik, mana Wikimedia Foundation enweghị ndị ọrụ n'egosipụta uru akụkọ ndị a. A na m enye ekele maka Mgbalị 2024 iji belata usoro ikọwapụta ihe emepụtara, mana ka ndị ngalaba obodo na-eji puku kwuru puku awa kwa afọ na-ede akụkọ banyere ihe ha na-emepụta. Ọ bụrụ na anyị ga-achọ nkọwa gbasara ihe ha na-emepụta, anyị kwesịrị ịkwanyere ha ùgwù site n'ịtụle ha. Enwere ọsịsa dị mfe: tupu Wikimedia Foundation ajụọ ngalaba otu maka ihe ọ bụla, ọ dị mkpa ka e nwee atụmatụ ọha na eze nke awa ole nke oku ndị afọ ofufo arịọla. Ọtụtụ mgbe, Wikimedia Foundation na-achọ naanị nnọkọ obere oge ha na ndị ngalaba otu, mana na-achọ ihe n'ụzọ na-ezighi ezi n'ụzọ ọ na-eme ka ndị ọrụ afọ ofufo otu puku na-eme ntinye aka na-ewe ọtụtụ awa ọrụ. Nlebara anya ndị ngalaba otu bụ ihe enyemaka dị ụkọ. Anyị kwesịrị ịrịọ maka oge ma ọ bụrụ na anyị nwere atụmatụ ojiji ha , na anyị kwesịrị ịmara oge o riri anyị na nnọkọ iji kelee ndị ọrụ afọ ofufo maka isonye na ya.
Dika onye isi oche (CEO) Wikimedia Foundation na-apụ n'ọkwa, kedu àgwà ị kwenyere na onye ndu na-abata kwesịrị inwe, kedu ka ndị a ga-esi kwado aganihu nke otu Wikimedia? Achọrọ m ka CEO kpachapụ anya na-ekwu naanị ihe ọma gbasara ngalaba ndị ọrụ anyị.

Na 2015, edere m ederede gbasara otu ndị ọrụ na ndị isi nke Wikimedia Foundation si akatọ ndị ọrụ Wikipedia mgbe ụfọdụ. Ana m ewepụta mmemme Wikipedia oge niile na mmemme ọha na ọgbakọ, amakwaara m site na mmụtaram na ndị na-adịghị edezi Wikipedia ga-abịakwute m ikwu na Wikipedia na-akpa oke site na mkparị a na-akparị ụmụ nwanyị na ndị na-enweghi ọnụ. Ha nwetara echiche a site na Mgbasa ozi nzikọrịta Wikimedia Foundation nke nwere nkwuputa na-adịghị mma ebe anyị anaghị eme mmemme ihe anyị mepụtarala. Aghọtara m na anyị nwere nnukwu ọdịiche dị iche iche, mana n'otu oge ahụ, ọ bụkwa eziokwu na Wikipedia nwere nchịkọta akụkọ ndụ na isiokwu omenala dị iche iche nke ụwa kachasị ukwuu e nwere ike inyocha, zuru oke, ma kacha mma.

Wikipedia na-eme ihu abụọ, mana ihe ọ bụla ndị ọzọ ka njọ. Wikimedia Foundation kwesịrị ikwupụta nke ọma na ndị ọrụ anyị na-emepụta ọdịnaya ozi dị mma n'eleghi mmadụ anya n'ihu, usoro mmepeanya na-arụ ọrụ kacha mma, yana naanị ngalaba otu ndị ọrụ nke ọchịchị onye ọrụ. Mkparịtaụka ga-adị mfe ma ọ bụrụ na anyị ahụ ihe ndị dị mma ma meghachi omume n'ụzọ ziri ezi, kama ịhụ ihe ọjọọ ma katọ ihe ndị anyị nwere.

Ajụjụ nhọrọ - mmụtara ọkachamara, nka na agụmakwụkwọ
Ajụjụ ndị a bụ nke enwere ike ịhọrọ. Azịza ya ga-agbakwunye na njedebe mkpuruokwu na ndebanye gị. (Nchetara: Ị gaghị enwe ohere ndị ọzọ iji nye nkọwa ozi ndị a).
Biko kọwaa mmụtara ọrụ ọkachamara gị na mkpa ọ dị na ọrụ Bọọdụ. I study artificial intelligence as Wikimedian in Residence at the School of Data Science. I already mentor student researchers, and as trustee, I would collaborate with students from all disciplines to assist me with board work. I would send students into Wikipedia to help me analyze, report, and uplift, and deliver Wikipedia community conversations and decisions to researchers, media, and public policy discussions.

I was Wikimedian in Residence at Consumer Reports from 2012-18, and before that I did clinical research through which I also did medical Wikipedia editing. In all these things I did project management, budgeting, and strategy.

Biko kọwaa otu i siri jikwa, ma ọ bụ dụọ ndị ọzọ ọdụ, na nsogbu dị mgbagwoju anya na nzukọ. Kedu ka gị na ndị ọzọ siri rụọ ọrụ iji dozie ọnọdụ ahụ? Gịnị bụ mgbanwe nke si ná mgbalị gị pụta? At my school I helped to develop our open access guidelines. It is a common wish for Wikimedians that universities, museums, and organizations would adopt open source practices and implement them. Organizations worry about losing control of their media, but demonstrating the reach and popularity of Wikipedia is a great argument to convince organizations to freely share their knowledge online.
Biko kọwapụta usoro mmụta gị, gụnyere nzere, asambodo na usoro ọmụmụ ịgụchara, yana mkpa ha dị n'ọrụ Bọọdụ. I studied chemistry and am a research professional at a university. I do things the university way and not the way of a corporation, NGO, or government.
Biko tinye njikọ ọ bụla dị mkpa na-akọwa nzụlite ọkachamara gị, mmụtara, profaịlụ gị (dị ka LinkedIn, ibe ndị ọrụ, dgz). -
Ajụjụ nhọrọ - Mmụtara dị ka onye ndu
Ajụjụ ndị a bụ ajụjụ nhọrọ. Azịza ya ga-agbakwunye na njedebe mkpuruokwu na ndebanye gị. (Nchetara: Ị gaghị enwe ohere ndị ọzọ iji nye nkọwa ozi ndị a).
Biko kọwaa ụzọ ị nyeerela aka igbo ihe mgbochi n'etiti ọtụtụ ngalaba otu (dị ka site n'ịrụ ọrụ na mpụga wiki ngalaba gị, ma ọ bụ ịrụ ọrụ na mmekorita n'etiti ndị mmekọ). To form bridges, people have to become friends by socializing repeatedly over time. An amazing part of Wikipedia that feels amazing is continually having positive interactions with other users by collaborating on projects. Bridges are the result of friendly collaboration on Wikimedia projects.

As described above, I have hosted 100s of Wikimedia events. Away from Wikipedia, I operated a queer punk rock house concert venue which presented 100 bands and indexed them in Wikidata.

Ị nwere ike ịkọwa amụma, na wiki ma ọ bụ na mpụga wiki, nke ị nyere aka mepụta ma ọ bụ gbanwee? Kedu ihe ị mụtara na mmụtara a? There is no need to turn a conversation into a conflict. We are Wikipedia and we can present all sides in our disagreements just like we do in encyclopedia articles.

There have been times when 1000 volunteer users signed petitions, but not a single WMF staff person publicly joined the conversation. Surely there must be at least one staff person who wished to sign, but felt afraid to do so. Humans define Wikipedia's values and ethics, and when the user community is having deep conversations on major issues, then WMF staff need to feel safe to join those discussions.

I was active in organizing community demonstrations including for Superprotect, the removal of the CEO, the rebranding, fundraising messages, and others. These are major wiki demonstrations with many petitioners.

The lesson to learn is that we have to listen to all sides, collaborate, and edit the story together.

Kedu ka ị siri kwado inye ndị mmadụ iji mee ka a nụ olu ha? I lived in the small rural town of West Orange, Texas from birth to age 18. Because I had problems for being gay, I moved to Seattle not knowing anyone there just because it was a big city far away. I did not have money so I lived for years in a building with no water or electricity. I experienced how society exploits vulnerable people.

I am more fortunate now, but because of my personal experience, I find other Wikipedia editors from fringe backgrounds. Wikipedia has editors who are homeless, unemployed, disabled, in poverty, in drug abuse, doing sex work, serving as caretakers for others, displaced or immigrant, but who still edit Wikipedia because they believe in sharing information. Editing Wikipedia is a pleasurable productive activity to all kinds of people. I try to make Wikipedia more accessible to the scared young person I used to be.

Ị nwere ike ịkọwa otu ị siri gosipụta ike iduzi ndị ọzọ n'ịdozi nsogbu, inabata mgbanwe ma ọ bụ imezu ebumnuche, karịsịa n'ọkwa ọchịchị ma ọ bụ njikwa? Management in Wikimedia projects means finding ways to consistently convert the money from Wikipedia donations into the impact that we decide is most meaningful. I recommend that Wikimedia community organizations ask questions like, "How much money does it cost to recruit a new editor?", "What is the worth of a Wikipedia article which is read 5000 times monthly?", or "What museums will sponsor Wikipedia programs if we develop GLAM tools?"

The leaders of a program should publish brief fantasy best case scenarios for their programs, and more realistic probable outcomes. After a project, compare the predictions to the outcome. Doing these exercises will confirm that the development team and community have a shared dream of a good outcome. For anyone applying for grants to the Wikimedia Foundation or for anyone making Wikipedia products, make these predictions before you begin.

Ajụjụ nhọrọ - Echiche e chezimara nke ọma
Ajụjụ ndị a bụ ajụjụ nhọrọ. Azịza ya ga-agbakwunye na njedebe mkpuruokwu na ndebanye gị. (Nchetara: Ị gaghị enwe ohere ndị ọzọ iji nye nkọwa ozi ndị a).
Biko kọwaa mmụtara gị na nsonye ma ọ bụ nduzi otu nzukọ n'nhazi maka ọdịnihu ya. Kedu ka ọrụ gị si tinye aka n'ịhọrọ ụzọ dị mma nke nzukọ a? At the start of any project, write a draft of your final report so that you have a clear idea of how success should look. The right path is the one that leads to the dream that everyone wrote at the start of the project.
Verification Identity verification performed by Wikimedia Foundation staff and eligibility verification performed by the Elections Committee
Eligibility: Verified Identification: Verified
Verified by: – NahidSultan (WMF) (talk) 04:57, 16 July 2025 (UTC)[reply]