Jump to content

Ntuliaka Wikimedia Foundation/2025/usoro mwepụta aha

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation elections/2025/Shortlisting process and the translation is 94% complete.

Na ntuliaka 2025, a ga-enwe ohere oche abụọ. Kọmiti ntuliaka na Board of Trustees kpebiri na ndị na-azọọkwa ntuliaka iri ga-abụ ọnụọgụ ziri ezi nye ndị ntuliaka inyocha. Ọ bụrụ na e nwere ihe karịrị mmadụ iri ndị tozuru etozu dịka kọmitii ntuliaka kpebiri, a ga-eme usoro mwepụta aha. Usoro ga-ahọpụta ndị ga-azọ ọkwa isii, ndị a ga-eso azọ ọkwa isii a ga-eso na ntuliaka a ga-eme na mpaghara ntuliaka ngalaba otu. Ọ bụrụ na enwere nd na-azọ ọkwa iri ma ọ bụ nke n'erughi, a gaghị enwe usoro mwepụta aha.

Usoro mwepụta aha

Ọ bụrụ na enwere usoro mwepụta aha, a ga-agbaso usoro a:

  • A ga-agwa ndị ngalaba mmekọ ọ bụla ka ha wepụta 1 (otu) onye nnọchi anya ga-anọchi anya ha na usoro mwepụta aha. Onye nnọchi anya ahụ nwere ike ịbụ onye a na-akpọturu n'ihe gbasara ngalaba mmekọ ahụ ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ nwere ike ịrụ ịnọchite anya ngalaba mmekọ ahụ. Ndị otu nkwado ga-ezigara ndị ngalaba mmekọ niile ozi ịjụ ha aha onye nnọchi anya ha.
  • Ndị nnọchi anya Ngalaba mmekọ ga-ahọrọ ihe ruru ndị na-azọ ọkwa 6 (isii) niile ndị Kọmitii ntuliaka họpụtara dịka ndị tozuru etozu na ebe atụm vootu Kọmitii ntuliaka họpụtara. Mkpebi ha ga-adabere ndakọ nke ndị na-azọ ọkwa ntuliaka na ihe ndị Board chọrọ na ihe achọrọ maka ntozu nke ndị na-azọ ọkwa.

Kọmitii ntuliaka ga-ezite nkokọ nnyocha site na email nye onye nnọchi akpọpụtara site na 15 Julaị 2025. Usoro mwepụta aha ga-esi na 15 Julaị 2025 na 00: 01 UTC ruo 28 Julaị 2025 na 23: 59 UTC .

Nnyocha ahụ ga-ajụ ajụjụ ndị a:

  • Aha ma ọ bụ aha njirimara nke onye nnọchi anya
  • Biko họrọ ihe ruru mmadụ isii nke ndị ngalaba mmekọ gị kpebiri na ha gbasoro ụkpụrụ ntozu na ihe ndị Bọọdụ chọrọ.
    • Mata na: a ga-enwe ndepụta nke ndị niile tozuru etozu, nakwa onye nnọchi anya ngalaba mmekọ ga-enwe ike ịhọrọ karịsịa ndị na-azọ ọkwa isi;Enweghị ogo onyekachanu na nhọpụta ndị na-azọ ọkwa ntuliaka a
  • Biko kesaa akwụkwọ gbasara usoro mkpebi nke ndị ngalaba mmekọ iji nweta ihe achọrọ na nhọrọ a
  • kwupụta (ma ọ bụrụ na e nwere ihe ọ bụla ọzọ a na-etinyeghi na fọm a)

A ga-ekwupụta mpụtara nke usoro mwepụta aha n'ụzọ akọwapụtara n'okpuru ebe a, iji dozie ntinye aka maka nghọta ọha na eze na echiche banyere mmetụta na-ezighị ezi nke vootu ngalaba òtù.

  • Mgbe usoro mwepụtata ahụ gwụchara, Kọmitii Nhọrọ ga-ekwupụta ndị mmadụ isii nwetara ọnụ ọgụgụ kachasị elu na votu, nke agaghị ekwupụta ogoonye kacha nwee vootu ha n'ihu ọha.
  • Mgbe ntuliaka ngalaba otu gasịrị, a ga-ewepụta data banyere ndị ngalaba mmekọ ole sonyere na usoro ndepụta nakwa ndị ha tụụrụ vootu.

Shortlisted candidates

The shortlisting process concluded on 28 July 2025. These candidates proceeded to the candidate review process: