Ntuliaka Wikimedia Foundation/2025/ Ntuziaka maka ntozu ndị ga-atụ vootu
Ndị ndezi
Ị nwere ike ịme ntuliaka site na akaụntụ ọ bụla idebanyere aha ị nwere na Wikimedia wiki. Ị nwere ike ịtụ vootu naanị otu ugboro, n'agbanyeghị akaụntụ ole i nwere. Iji tozuo etozu itụ vootu, otu akaụntụ ga-:
- abụ nke n'egbochighi ime ntunye na Wiki niile;
- a bụ nke n'egbochighi na saịtị niile n'ihe karịrị otu ọrụ ọha na eze;
- a bụ nke akpọchighi akpọchi;
- a bụ nke n'abụghị bot;
- a bụ nke meerela ma ọ dịkarịa ala ndezi Narị atọ tupu [ỤBỌCHỊ NGWỤCHA - ụbọchị iri atọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu] na gburugburu wikis Wikimedia; na
- a bụ nke n'emeela opekata mpe ndeezi iri na [NA ỤBỌCHỊ MMALITE - ọnwa iri na abụọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu] na [ỤBỌCHỊ NGWỤCHA - ụbọchị Iri ato tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu]
Enwere ike iji ngwa Ntozunjiarụ nyochaa ntozu ngwa ngwa ime ntuliaka onye ndezi.
Ndị nrụpụta
Ndị nrụpịta tozuru oke ịtụ vootu ma ọ bụrụ na ha:
- bụ ndị nchịkwa sava Wikimedia nwere ohere shell; ma ọ bụ
- emela ma ọ dịkarịa ala otu njịkọta na repos
Wikimedia ọ bụla na Gerrit, na agbata [ỤBỌCHI MMALITE - ọnwa iri na abụọ tupu ụbọchị mbụ nke ntuliaka] na [Ụbọchị ngwụcha - ụbọchị iri atọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu].
Itozu Ntozu qgbakwunyere
Ndịnwere nka nrụpụta nwere ike itozu ịtụ vootu ma ọ bụrụ na ha:
- emela ma ọ dịkarịa ala otu njịkọta na repos ọ bụla na nonwmf-extensions ma ọ bụ nonwmf-skins, na agbata [ỤBỌCHI MMALITE - ọnwa iri na abụọ tupu ụbọchị mbụ nke ntuliaka] na [ỤBỌCHỊ NGWUCHA - ụbọchị iri atọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu]; ma ọ bụ
- emela ma ọ dịkarịa ala otu njịkọta na repo ngwa Wikimedia ọ bụla ( ọmụmaatụ,magnustools) na agbata [ỤBỌCHI MMALITE - ọnwa iri na abụọ tupu ụbọchị mbụ nke ntuliaka] na [ỤBỌCHỊ NMGWỤCHA- ụbọchị iri atọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu]; ma ọ bụ
- bụ ndị na-elekọta/ndị na-enye aka na ngwaọrụ ọ bụla, bots, ngwaọrụ, na modul Lua na wiki Wikimedia ; ma ọ bụ
- etinyela aka nke ukwuu na imewe na/ ma ọ bụ nyocha usoro nke mmeba teknụzụ metụtara Wikimedia.
Ndị n'eme Ntụgharị
Ndị n'eme ntụgharị tozuru ịtụ vootu ma ọ bụrụ na ha emeela opekata mpe ndezi Nar atọ tupu [Ụbọchị] , na ndezi iri abụọ n'egbata [ỤBỌCHI MMALITE– ọnwa iri na abụọ tupu ụbọchị mbụ nke ntuliaka] na [UBỌCHI NGWỤCHA - ụbọchị iri abụọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu] , na translatewiki.net.
Ndị ọrụ na ndị ọrụ nkwekọrịta Wikimedia Foundation
Ndị ọrụ Wikimedia Foundation dị ugbu a na ndị ọrụ ngo tozuru oke ịtụ vootu ma ọ bụrụ na Foundation were ha n'ọrụ na [ỤBỌCHỊ NGWỤCHA - ụbọchị iri atọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu] '.
Ndị ọrụ otu mmekọ wikimedịa na ndị ọrụ nkwekọrịta
- Chapta Wikimedia dị ugbu a, nzukọ isiokwu ma ọ bụ onye ọrụ user group na ndị ọrụ ngo tozuru ịtụ vootu ma ọ bụrụ na nzukọ ha were ha n'ọrụ [ỤBỌCHỊ Ngwcha - ụbọchị iri atọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu] .
- Ndị otu na-arụ ọrụ dịka akọwara na iwu nke Chaputa Wikimedia dị ugbu a, otu n'elegara anya n'isiokwu ma ọ bụ otu ndị ọrụ tozuru oke ịtụ vootu ma ọ bụrụ na ha na-arụrị ọrụ ndị ahụ na [ỤBỌCHỊ NGWỤCHA - ụbọchị Iri atọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu].
Ndị mmadụ n'otu n'otu na-arịọ ka hà mee ntuliaka n'okpuru ngalaba a ga-etinyerịrị ihe akaebe sitere n'aka ndị ngalaba ha. A ga-ewererịrị ndị mmekọ ha “dabere” na mkpa mkpesa ha. Kọmitii Ngalaba mmekọrịta na Kọmitii Ntuliaka ga-akwado ndepụta nke ndị ngalaba mmekọrịta Wikimedia tozuru oke site na [ỤBỌCHỊ Ngwụcha - ụbọchị iri atọ tupu ụbọchị mbụ nke ntuliaka].
Ndị otu bọọdụ Wikimedia Foundation na ndị otu ndụmọdụ bọọdụ
Ndị otu Wikimedia Foundation Board of Trustees na ndị Otu Wikimedia Foundation Advisory Board tozuru etozu ịtụ vootu.
Ndị otu kọmitii Otu Wikimedia
Ndị otu kọmitii Otu Wikimedia nọ ugbu a tozuru oke ịtụ vootu ma ọ bụrụ na ha na-eje ozi n'ọkwa ọrụ ndị ahụ na [ỤBỌCHỊ NGWỤCHA- ụbọchị iri tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu].
Maka ebumnuche nke ntuziaka a, a na-akọwa kọmitii Otu Wikimedia dị ka Kọmitii nkwukọrịta, Kọmitii Ntuliaka, Kọmiti Asụsụ, Kọmitii Nkwado Ngwaahịa na Teknụzụ, Kọmitii Nkesa ngwa ọrụ zuru ụwa ọnụ Ụwa, na Kọmitii Nhazi Universal Code of Conduct.
Ndị nhazi ihe omume nke Otu Wikimedia
Ndị na-ahazi ihe omume n'enweghi akụkọ ọjọọ, ndị na-etozughi ịtụ vootu n'okpuru ụdị ndị ọzọ, tozuru ịtụ vootu ma ọ bụrụ na ha tozuru n'ime ndị a:
- etinyela akwụkwọ, natarala ma kọpụta ma opekata mpe otu onyinye ego ọrụ Wikimedia Foundation kemgbe [ỤBỌCHI MMALITE - ọnwa iri na abụọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu].
- bụ onye nhazi na opekata mpe nnweta nkwado ego ọrụ otu hackathon, asọmpi ma ọ bụ mmemme Wikimedia ọzọ nwere ndebanye gbasara ya na wiki yana nwee opekata mpe ndị bịara/ndị ọbịa/ndị nsonye iri [ỤBỌCHỊ MMALITE - ọnwa iri na abụọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu] na [ỤBỌCH NGWỤCHA - ụbọchị iri atọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu] '.
- bụ onye ọrụ, onye ọrụ nkwekọrịta, ma ọ bụ onye otu Bọọdụ nke họọbụ ndu nke na-enweta ego n'aka WMF kpọmkwem maka idu hoobụ kemgbe [ỤBỌCHỊ MMALITE - ọnwa iri na abụọ tupu ụbọchị mbụ nke ịtụ vootu] .
Ndị na-arịọ ka ha tụọ vootu n'okpuru Otu ga-agbakwunye ihe akaebe nke ọrụ ha. Ọ bụrụ na ị natara onyinye ego ọrụ Wikimedia Foundation, biko nye njikọ gosiri nkọwapụtọ ihe omume ọrụ gị. Maka ndị nhazi, biko nye njikọ nke peeji ịkpọ òkù ma ọ bụ ihe akaebe ọ bụla nke ihe omume ahụ n'ịntanetị.
Ndetu
Ọ bụrụ na ị ruru ogo ngọzi ndị editọ , ị ga-enwe ike ịtụ vootu ozugbo. N'ihi ihe ịma aka nke ọrụ nka SecurePoll, ndị mmadụ tozuru ogo ntozu agbakwunyere nwere ike a gaghị enwe ike ịme ntuliaka na ihu ekwesrị, ọ gwụla ma ha tozuru ogo ntozu ihe ọ bụla ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ị chere na I ruru ogo ntozu ndị agbakwunyere, biko zite emailu electcom
wikimedia.org tinyere ebumnuche iji ezite ya na opekata mpe ụbọchị anọ (4) tupu ụbọchị ikpeazụ nke ịtụ vootu. Ọ bụrụ na ị tozuru tụ vootu, anyị ga-agbakwunye gị na ndepụta ntuziaka, ka ị nwee ike ịme ntuliaka.
