User:Okpala Austin

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki

Igbo Wikipedia bu onodu mgbanwe nke intanet, nke ndi umu ogolobia na umu agbohobia tozuru etozu na asusu igbo jikotara aka onu were meputa iji were kwalite asusu igbo na ngalaba mba uwa di iche iche, maka odimma nke ndi igbo. Igbo Wikipedia na enyere ndi igbo na amaghi asu asusu bekee aka na isoro ndi ibe ha na abanye na intanet maka igu nuzu ka ha were mata ihe na eme na mba uwa dum.

Atumatu igbo Wikipedia bu ihe magburu onye ya na mma, maka na o na enye aka na akwalite asusu igbo iji were kpoche onunu di na etiti asusu igbo and asusu bekee nke ndi na etiti umu ogbala ohuru ugbua.

Igbo Wikipedia enweghi oghiri ma ncha. O bu ebe i nwere oghere ichota ihe obula ichoro na asusu igbo dika nuzu,emume ndi igbo, omenala ha, ejije na amu ndi igbo, ilu na uka ha w.d.g.z, maka na uka akpara akpa bu isi ka eji ekwe ya.

Ndeewo nu ndi be anyi.