Agụmakwụkwọ/Akụkọụwa/ọnwa Ọgọst afọ 2022/Wiki Maka ndị agadi

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Education/News/August 2022/Wiki For Senior Citizens and the translation is 44% complete.
Outdated translations are marked like this.

Wiki maka ndị Katara ahụ

Author: Oby Ezeilo

Summary: Ojiji Wikipedia maka mmepe mba: Ndị katara ahụ n'obodo Naijiria ka ha si hụ ya

" Foto nke ndị sonyere na ihe nkuzi Wiki For Senior Citizens,na Abuja Nigeria n'afọ 2022 n'ụlọ ọrụ Nigerian Copyright Commission Training School Abuja Nigeria."
Social Media channels or hashtags: Facebook: Obialugeriaku Ezeilo

Dika otu n'ime ndị nkuzi na onye nkwado ọrụ a, a achọpụtara m na ndị otu a nwere ọtụtụ ihe nrite na Wikipedia yana ikwado ọmụmụ n'efu. Ewezuga ịgba ha ume ka ha mara ma mụta ka esi eji ngwa teknụzụ , dị ka WIKIPEDIA, mee ka ihe ọmụma ha dịkwuo mma, ọ ga-enye aka maka ihe ha na-agabiga kwa ụbọchị, site n'ịgbanwe ozi, nyocha eziokwu, idozi nsogbu, na mmepe mba. .

Ọzụzụ ọnwa abụọ na-aga n'ihu bụ naanị maka ndị agadi ma ọ bụ gbara afọ iri ise na ise maọbụ karịa, ndị lara ezumike nká n' ọrụ ma biri n' Abuja. E kwuru na mmụta bụ ihe na-aga n'ihu, na Wikipedia, ha nwere ike imelite ihe ọmụma ha banyere nkà na ụzụ ọhụrụ. ihe ọhụrụ, nweta ozi dị iche iche, na ịkwalite nkà mmụta dijitalụ ha site na iji ekwentị android ma ọ bụ Laptọọpụ ha. Ha nwere ike ime ka uche ha na-arụ ọrụ oge niile, na-eme nchọpụta ngwa ngwa, na-enye aka na-edozi nsogbu iji bute mmepe,uto na mbawanye zuru ụwa ọnụ."

Ụfọdụ n'ime ndị agadi a, Oriakụ Uzoamaka Ezeilo na Oriakụ Rose Ettah tinyere ndị ọzọ gosipụtara afọ ojuju maka ọzụzụ a. "Ha nwere obi ụtọ isonye n' ọzụzụ ahụ, N'okwu nke aka ha, ha kwuru, sị, "Ndị mmadụ na-echekarị na mgbe mmadụ lara ezumike nká, onye ahụ agwụla, Mba!, ị ka nwere ike ịmụta ihe ọhụrụ ma gboo mkpa n'obodo" Maka ụfọdụ. , Ọzụzụ ahụ bịara n'oge, n'ihi na ọ ga-enye ha ohere zuru oke iji na-arụsi ọrụ ike, na-enye ihe ọmụma nakwa ntinye aka na mmepe obodo. Ọzụzụ Wikidata kpughere ha ụzọ di iche iche ha ga-esi nweta data dị iche iche ma tinye ya na Wikidata saiti. E nwere ihe anọ ndị ị ga-eburu n'uche mgbe niile ị na-edezi Wikidata bụ (ihe/isiokwu(item), Nkwuputa ahịrị bụ eziokwu(statement), ngwongwo(property), NA Uru(Value). Ha kelere Wikipedia maka inye ha ụdị ohere a. Enwere ngalaba ajụjụ na azịza. Ọzọkwa, bụ na nkuzi a buteere ha mmekọrịta n'etiti onwe ha. Ha na-atụsi anya ike maka nzukọ ọzọ.

... people usually think that when one is retired then it is over, No, you can still learn new things and be relevant to the society.

For some, the training came at the right moment, for it will give them ample opportunity to be busy, informative and contribute to the development of the society. The Wikidata training exposed them to how to source data from different reliable sources and input these data on the Wikidata site. The four key ideas to always bear in mind when editing Wikidata (ITEM, STATEMENT, PROPERTY, AND VALUE). They thanked Wikipedia for giving them this opportunity. There were a Questions and Answer section. Furthermore, The session ended with an opportunity for participants to network among themselves. They are eagerly looking forward to the next Meet up.