Asọmpi Otu ndị ọrụ Wikimedia Igbo maka Ikike Mmadụ 2022
Wiki For Human Rights Contest 2022
Ikike maka gburugburu ebe obibi dị mma
Eprel 22-onwa Mee 02, 2022
[Social media: #WikiForHumanRights #IWUG]

Gịnị
Nke a bụ asọmpi ide ihe ọhaneze iji mepụta, melite akụkọ na ịgba ndị Wikimedia ume ka ha dee gbasara Ikike Mmadụ n'asụsụ Igbo. Ndepụta akụkọ a ga-elekwasị anya na ya aputala. Ndị meriri ga-anata ihe nrite.
Mgbe
Ihe ịma aka ide ihe bụ mmemme ịntanetị a ga-eme site na 22 Eprel ruo 02 Mee 2022.
Kedu
Ọ dị mfe isonye na asọmpi site na akụkọ Nhọrọ ị ga eji rụọ ọrụ. A ga-enyocha akụkọ dabere n'ọnụọgụ nke akụkọ emepụtara, edensibịa na ịdị ọcha nke akụkọ emepụtara ma ọ bụ a tụgharịrị.
Onye
Ndị Otu Ndị oru Wikimedia Igbo nwere ike inye aka dee na/ma ọ bụ tụgharịa asụsụ akụkọ gbasara ikike mmadụ, ịzụ ahịa mmadụ na ahụike gburugburu ebe obibi n'asụsụ Igbo. Iji sonye, ịkwesịrị ịdebanye aha na ngalaba Ndị so na asọmpi a. Ọ dịkwa mkpa ịdebanye aha na dashboard mmemmé. Depụtakwa akụkọ ịmepụtara ma ọ bụ ịtụgharịrị asụsụ ebe a maka inye akara na ngwụcha asọmpi a.
Gịnị kpatara
Wikimedia Igbo na-ahazi asọmpi a ya na nkwado sitere na Wikimedia Foundation.N'oge asọmpi a, anyị na-atụ anya imepụta, ịtụgharị asụsụ ma ọ bụ melite Wikiquote, Wikipedia, na akụkọ Wikidata metụtara ikike mmadụ, ịzụ ahịa mmadụ, na ikike iji nweta gburugburu ebe obibi dị mma maka WikiForHumanRight 2022.
Ihe emeputara
N'ọgwụgwụ asọmpi a ndị editọ 42 debanyere aha na dashboodu, emepụtara akụkọ 913, edeziri akụkọ 1.56k. Ndị ndezi 8 depụtara ihe ha metara ebe a ahọpụtara 3 kacha elu maka ihe nrite. Enwere ike ịchọta ozi ndị ọzọ ebe a.



