Akwụkwọ ikike Otu/Mmegharị

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Movement Charter/Amendment and the translation is 100% complete.


Mmezigharị

A haziri Akwụkwọ ikike njem Wikimedia ka ọ bụrụ nke ga-adịgide ruo ọtụtụ afọ. N'ihi nke a, a ga na-eme mgbanwe na Akwụkwọ ikike a naanị n'ọnọdụ pụrụ iche. Ewepụrụ na nke a bụ obere mgbanwe mkpoputa na ụtọasụsụ nke na-agbanweghị mpụtara ma ọ bụ ebumnobi nke ederede Akwụkwọ a.

'Ụdị mmezigharị

  1. Obere Ndezi.
    • Ndezi mkpoputa na ụtọasụsụ nke na-agbanweghị mpụtara ma ọ bụ ebumnobi nke Akwụkwọ a.
  2. Mgbanwe na-emetụta naanị usoro ọrụ nke Global Council .
  3. Mgbanwe ndị na-agbanwe ọrụ niile na nsonye nke GC.
  4. Mgbanwe na-agbanwe ụkpụrụ nke njem a; ma ọ bụ ọrụ na ikike nke ndị ọrụ afọ ofufo, ọrụ, mmekọ, họb, Wikimedia Foundation, Ọgbakọ Wikimedia n'odinihu , na ozuzu ọnụ njem Wikimedia.
  5. Mgbanwe ndị Wikimedia tụpụtara.
Ụdị Mgbanwe Usoro Gbanwee Òtù Nkwado Ndetu
1 Nkwado ụzọ abụọ nke atọ (⅔) maka mgbanwe a chọrọ Global Council Board
2 Nkwado ụzọ abụọ nke oke atọ (⅔) maka mgbanwe a chọrọ Global Council Assembly akwadoro nnọkọ ngalaba otu
3 Mmanye Nnọkọ ngalaba otu,ụzọ abụọ nke oke atọ (⅔) nkwado nke mgbanwe na votu na-eso nzukọ Global Council Assembly
4 Ntuliaka nke otu n'ozuzu oke, nkwado ọtụtụ maka mgbanwe Njem Wikimedia Usoro ịtụ vootu iji soro usoro nnabata dị ka o kwere mee, gụnyekwara votu nkwado sitere na Board of Trustees WMF
5 Atụmatụ ga-emezurịrị kriteria iji gaa n'ihu ịtụrụ vootu. Ntuliaka, nkwado ọtụtụ maka mgbanwe Njem Wikimedia Usoro ịtụ vootu iji soro usoro nnabata dị ka o kwere mee, tinyere votu nkwado sitere na Board of Trustees WMF

Usoro maka ịtụpụta mmezigharị Akwụkwọ ikike Njem Wikimedia

Kansụl zuru Ụwa ọnụ nwere ike ịtụpụta mmezigharị ụdị 1, 2, 3 ma ọ bụ 4. Global Council Assembly nwere ike ịtụpụta mmezigharị udi 2, 3 na 4. Ndị otu njem Wikimedia na-atụpụta mmezi nke otu 5.