Jump to content

Movement Charter/Kọmitii Nhazi/Ọkwa- Ndepụta ikpeazụ adịla

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Movement Charter/Drafting Committee/Announcement - Final draft available and the translation is 100% complete.

Ndepụta ikpeazụ nke Wikimedia Movement Charter dị ugbu a na Meta

Ị nwere ike ịchọta ozi a ka atụgharịrị n'asụsụ ndị ọzọ na Meta-wiki. Please help translate to your language

Ndewo onye ọ bụla,

Ndepụta ikpeazụ nke Wikimedia Movement Charter dị ugbu a na Meta n'ihe karịrị asụsụ iri abụọ maka ọgụgụ gị.

Gịnị bụ Movement Charter Wikimedia?

Movement Charter Wikimedia bụ akwụkwọ atụpụtara iji kọwapụta ọrụ na ọrụ dịịrị ndị otu na ngalaba niile nke Wikimedia, tinyere imepụta otu ọhụrụ – Global Council – maka ọchịchị Otu a.

Sonye na "Mmemme Mwepụta mbụ" nke Wikimedia Movement Charter

Soro “Mmemme Mwepụta mbụ” na June 20, 2024 na 14.00-15.00 UTC (oge mpaghara gị). N'oge oku a, anyị ga-eme ememe mwepụta nke Charter ikpeazụ ma gosịpụta ọdịnaya nke Charter. Soro ma mụta maka Charter a tupu ịtụọ vootu gị.

Votu nkwado Movement Charter

Ịtụ vootu ga amalite na Securepoll na Juun 25, 2024 na 00:01 UTC ma ọ ga akwụsị Jụlaị 9, 2024 na 23:59 UTC. Ị nwere ike ịgụkwu gbasara usoro ịtụ vootu, ikike ntozu, na nkọwa ndị ọzọ na Meta.

Inwe ajụjụ ọbụla, Debanye ozi gị na Meta talk page ma ọ bụ zigara ndị MCDC emailụ na mcdc@wikimedia.org.

N'aha MCDC,