Training modules/dashboard/slides/10305-wikipedia-is-free/ig

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Training modules/dashboard/slides/10305-wikipedia-is-free and the translation is 100% complete.

Mgbidi nke Atọ

Foto nke Eryk Salvaggio

"'Wikipedia bụ ọdịnaya n'efu nke onye ọ bụla nwere ike idezi, ijiri mee ihe, gbanwee, maọbụ kesaa. "'

Ihe niile dị na Wikipedia e nwere ikike iji ya mee ihe ọbụla n'efu. Ya mere, mgbe ị na-etinye ederede ozi na Wikipedia, ọ dị mkpa ijide n'aka hụ na ọ dị mma ịkekọrịta n'efu.

Ịkọpịrị na itinye ihe ndị ị na enweghị ikike iji wee tinye na Wikipedia bụ ụdịrị izu ohi ọrụ onye ọzọ na enweghị ikike. Ị kwesịrị ịkwụ n'ezi a ebe ọrụ ahụ si, mana ị ga-eji okwu nke gị mee ihe mgbe ị na-ekwu ya.

Ọ dịkwa mkpa izere "mgbachi ndegharị". Nke a bụ mgbe ị na-ewere okwu onye ọzọ ma mee obere mgbanwe na nhọrọ okwu ha, ma debe usoro nguzo ederede ha.

Ịchọta nhatanha nwere ike ịd aghụghọ na mbụ. Usoro kachasị mma bụ ijide n'aka na ị ghọtara ihe ị na-agbakwunye n'ezie. Chee echiche banyere ya, gbanwee ya site n'echiche eleghị mmadụ anya n'ihu, ma tinye ya (mgbe na-ekwu ebe isi ọrụ mbụ si).