Global Council

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Global Council and the translation is 100% complete.

Global Council bụ otu a haziri ahazi nke e bu n'obi na-eje ozi dị ka "usoro zuru ụwa ọnụ nke na-aza mkpa nke Movement anyị n'ozuzu ya ma na-anọchite anya obodo n'ụzọ ziri ezi", ma bụrụ "ihe nnọchiteanya nke Movement na ọrụ ya na nhazi ya." Atụpụtara ya dịka akụkụ nke otu n'ime atụmatụ atụmatụ 2018-20, nke akpọrọ "Ihụkwaa na-aha ahá n'ime mkpebi", bụ nke ya na ndụmọdụ ndị ọzọ, nke Bọọdụ Wikimedia Foundation nke kwadoro ndị nlekọta.

Ndụmọdụ ahụ kwuru na "Mkpebi ọ bụla metụtara otu anyị ga-etinyerịrị otu ndị ahụ iji gbochie ihe mputa na-ezighi ezi", ma kọwaa Kansụl dị ka ọgbakọ "na-enwe nnọchite anya n'otu " ma "na-ahụ na arụkọrọ ọrụ ọnụ." Ndị otu a ga-agụnye ma ndị a họpụtara ahọpụta site na ṅtuli aka, na ndị ahọrọ, "n'ụzọ e mere iji gosipụta oke na ụdị dị iche iche nke nsonye ọ bụghị nanị na Movement ugbu a kamakwa na otu nke anyị chọrọ ijere ozi".

A ga-akọwapụta ọrụ Kansụl ziri ezi site na Charter Movement. Ndị Movement Charter Drafting Committee ga na-ahụ maka mmepe nke Charter (ọrụ nke ekenyeburu ndi na Interim Global Inteim).

Ọrụ na ibu ọrụ

Site na atụmatụ ñdụmọdụ:

Otu a ga-enwe ikikere na ọrụ ndị akọwapụtara na Charter, ndị a kwesịrị ịgụnye, mana ọnweghị oke:

  • Ihụ maka mmejuputa atumatu usoro Otu a, na ntinye ọnụ otu n'ebe ọ bụla ha enwere ike, na nhazi ya n'oke usoro ntọala nke Movement;
  • Na-ahụ maka mmepe na nkwado nke Movement Charter;

Na-eme ka otu nile no na okpuru movementi a na eme ihe na uzo kwesịrị ekwesị ma na aza ajụjụ doro anya

    • Etu esi eme ego ndi otua;
    • Dikọtara na ozi Wikimedia, echiche ha maka ọdi n' iru, na usoro atụmatụ;
    • Nrube isi na Charter Movement;
    • Iji akara otua me ihe na uzo kwesịrị ekwesị;
  • Ịtọ ntọala na oke akụrụngwa na ntinye ego na ichụ ego maka ije otua.
  • Ọrụ ọ bụla nke kansụl zuru ụwa ọnụ nyoputara di mpka na Bọọdu ga nyefere.

Kansul zuru ụwa ọnu ga elekọta mmejuputa usoro edeziri edezi nke otua etu esi kowa ya na edere ede iwu ndi otua, gụnyere ndụmọdụ maka ikenye ego na mpaghara otua na ebe isiokwu na òtù ndị ọzọ Movement ka ha na-amata ọrụ iwu na ntụkwasị obi nke òtù ndị metụtara.

Board ezigbo omume na iza ajụjụ na uzo were anya

Kansul zuru ụwa ọnụ ga-ahụ maka ijide bọọdụ we hu na- ha na aru ọru na ụzọ kwesịrị ekwesị ma na emekwa omume ọma, ma mepụta usoro iji nyochaa ma nye nkwado maka bọọdụ ndị na-adịghị agbaso ezi omume. Ezi ụkpụrụ omume maka otu bọọdụ si arụ ọrụ (dị ka oke okwu, usoro ntuli aka na nhọpụta, na ụzọ maka ajụjụ ọchịchị ndị ọzọ ebe ọdabara na mkpa maka obodo) ga-eguzobe.

Akụkọ ihe mere eme

Emere ọtụtụ atụmatụ maka ndị otu zuru ụwa ọnụ na-anọchite anya obodo, gụnyere ntụnye Wikicouncil (nke a na-akpọkwa "Wikimedia Global Council") na 2005, na atụmatụ Wikimedia Federation na 2008.

Ndị Kansul zuru ụwa ọnụ malitere atụmatụ Kansul zuru ụwa ọnu n'oge Usoro mgbaso 2018-20. Atụmatụ ahụ gafere n'usoro atọ (1, 2, 3), tupu ọ bịarute ụdị ikpeazụ na Mee 2020. Amụma, yana ndụmọdụ ndị ọzọ, bụ ndị Wikimedia Foundation Board of Trustees kwadoro.

Mgbanwe na Kansụl Zuru Ụwa Ọnu

Atụru atụmatụ na mbụ na, n'mgbe Usoro Mgbaso, a ga-emebe Kansụl zuru ụwa ọnu ga adi nwa-oge ka-aga eguzobe. E wetere Kansụl Mba Ụwa nke a ga adi nw'oge ka ha leba anya n'ịmepụta Charter Movement, ọrụ bụ emesịa bufee ya ka oburu Kọmiti na-edepụta akwụkwọ ikike ngagharị.

Atụmatụ akọwapụtara