Atụmatụ nwebiisinka

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Copyright strategy and the translation is 100% complete.
Ndị otu iwu na Wikimedia Foundation chọrọ ịmụtakwu gbasara isiokwu nwebisiinka na ọrụ Wikimedia. Ka anyị gbakọọ aka iji lebara okwu nwebiisinka dị mkpa maka Wikimedia site n'ime ihe ndị a:
  1. Depụta nsogbu na atụmatụ nwebisiinka/Isi okwu.
  2. Kwuo okwu n'okwu ndị edepụtara.
    a) Olee otú nsogbu ndị ahụ na-akpata siruru ná njọ?
    b) Olee otú nsogbu ndị ahụ si dị mkpa na ozi Wikimedia?
    ch) Mmetụta dị aṅaa ka idozi nsogbu ndị ahụ ga-enwe?
  3. Nyere aka dozie nsogbu ahụ n'ụzọ ọ bụla anyị nwere ike.

Ọ bụrụ na ị nwere nkọwa na usoro a, tinye ha na ibe okwu.

Na mgbakwunye na mkparịta ụka na wiki, ndị otu iwu Wikimedia Foundation mere elekere ọrụ IRC na atụmatụ nwebisiinka na September 15, 2016 na 14:00 UTC. Ndekọ ndị a dị na Atụmatụ nwebisiinka/awa ọrụ IRC.

Nghọta siri ike nke na itinye aka na nwebisiinka bụ isi na oru ngo, yana ebumnuche anyị ikwe ka ndị mmadụ gburugburu ụwa nweta, mepụta, kesaa, na remix ihe ọmụma efu. Otu ndị ọka iwu Wikimedia Foundation elelela ọrụ niile ọ na-arụ nke gụnyere itinye aka na okwu nwebisiinka. Anyị ewepụtala atụmatụ a iji nyere aka chọpụta na idobe ọrụ ndị kachasị mkpa maka obodo Wikimedia. Ọ na-agụnye ịdekọ ihe niile gbasara ikike nwebisiinka na-emetụta ọrụ Wikimedia na ntọala, na-ebute nsogbu ndị ahụ ụzọ, na ilebara ha anya.

Ka atụmatụ a wee gaa nke ọma, ọ chọrọ ntinye gị. Otu ndị ọka iwu enweghị ike ịma ụzọ niile nwebisiinka si emetụta usoro ndị Wikimedia na-eji enye aka na ọrụ a, ma ọ bụ mmetụta ndị kachasi ike, na-anụghị site na ọtụtụ ndị Wikimedia. Ọ dịkwa mkpa ka ndị otu anyị na ndị obodo na-arụkọ ọrụ iji chọta ihe ngwọta maka nsogbu nwebisiinka ndị a metụtara.

N'okpuru bụ ndepụta nke usoro nwebisiinka nke usoro nzọụkwụ atọ. Tupu anyị amaba n'ime usoro ahụ nke ọma, ka anyị were izu ole na ole na-ekwu maka usoro ahụ n'onwe ya. Biko kesaa echiche gị na ibe okwu site na September 14.

Nzọụkwụ mbu: Ịmata okwu

Otu "okwu" bụ ọnọdụ ọ bụla nke ikike nwebisiinka na-egbochi ndị Wikimedia ịkekọrịta ihe ọmụma na ọrụ a, kama inye ha ohere ime ya. Nke a gụnyere ịchọ akụkụ metụtara nwebiisinka nke imewe saịtị Wikimedia bụ nke na-adịghị mma ma ọ bụ na-agbagwoju anya. Ọ gụnyekwara inyocha amụma na usoro oru ngo metụtara ikike nwebiisinka ugbu a iji hụ na edere ha ma hazie ya nke ọma yana dabere na nkọwa ziri ezi nke iwu nwebiisinka.

Ọ dị mkpa ịgbaso mgbanwe na iwu nwebiisinka nke nwere ike imetụta Wikimedia nke ukwuu. Kedu ihe mmepe nwebiisinka zuru ụwa ọnụ, dị ka ikpe ụlọikpe na iwu ndị a tụrụ aro, nwere ike inwe mmetụta na ọrụ a?

Ọ dị mkpa na iji ọdịnaya Wikimedia's Creative Commons nwere ikikere dabara na usoro ikike. Ebee ka ndị na-emegharị ihe na-abụghị nke na-agaghị enye njiri mara nke ọma, ebeekwa ka nnabata na-ekwekọghị n'ọrụ a n'onwe ha?

Ka ị na-ezute ma chọpụta nsogbu, biko tinye ha na listi ahụ na Atụmatụ nwebisiinka/Isi .

Nzọụkwụ abuo: Okwu na-ebute ụzọ

Nyere obere oge na ihe onye ọ bụla nwere, anyị kwesịrị ilekwasị anya n'ime mgbanwe ga-enyere ndị obodo aka. Maka mbipụta ọ bụla, nke a gụnyere ịza opekata mpe ajụjụ atọ:

  1. Olee otú nsogbu ndị a na-akpata si dị njọ?
  2. Olee otú nsogbu ndị ahụ dịruru mkpa maka ozi Wikimedia?
  3. Mmetụta dị aṅaa ka idozi nsogbu ndị ahụ ga-enwe n'ọrụ Wikimedian?

Ọ bụrụ na ị nwere ike itinye aka na ịza ajụjụ ndị a, biko mee ya na atụmatụ nwebisiinka/okwu. Ntinye a ga-enyere anyị niile aka ikpebi ebe anyị ga-elekwasị anya n'ọrụ anyị.

Iji zere imefusị mgbalị, ọ kacha mma ka ị kwụsị n'ịgbalị ịchọpụta ihe kacha mkpa dị n'okwu dị iche iche tupu enweela nnukwu ndepụta nke ha.

Nzọụkwụ ato: Na-edozi nsogbu

Mgbe ịchọtachara nsogbu ndị kachasị mkpa ị ga-edozi, nzọụkwụ ọzọ bụ ịga n'ihu na-agbalị idozi ha. Ndị otu iwu Wikimedia Foundation nwere ike idozi ụfọdụ n'ime nsogbu ahụ, mana a ga-enwekwa nsogbu anyị enweghị ike idozi naanị anyị. Anyị na-akpọ gị òkù ka ị tụlee ma ị nwere ike inye aka na ngwọta maka ihe ọ bụla e depụtara na Atụmatụ nwebisiinka/okwu. Site na imekọ ihe ọnụ na ngwọta, anyị nwere ike rụpụtakwu ihe. Ndị Wikimedia na-abụghị ntọala ahụ nwere ihe ọmụma, ahụmịhe, na nkà dị mkpa iji nyere aka kọwaa ụzọ kacha mma. Ịbanye n'ime akụrụngwa ndị ahụ na itinye ndị Wikimedians nwere mmasị bụ akụkụ dị oke mkpa iji dozie nsogbu. Ndị otu iwu ntọala na-agba mbọ itinye aka na ndị na-emetụta ya mgbe anyị na-ebute ụzọ n'ịgbasa okwu. Anyị ga-agakwuru ndị otu obodo, otu na ndị mmekọ dịka okwesịrị, dịka site na ndetu nzipu ozi na na wiki. Mgbe ndị ọzọ na-edu ndú, anyị ga-akwado mgbalị ha ime otu ihe ahụ.

Ndị otu iwu Wikimedia Foundation ga-edozi ụfọdụ okwu n'ime, yabụ anyị agaghị enwe ike ịdepụta ọrụ niile metụtara nwebiisinka ebe a. Ọzọkwa, anyị enweghị ike inye ndụmọdụ gbasara iwu.

Ajụjụ a na ajụkari

Gịnị mere i ji eme nke a ugbu a?

Anyị na ndị otu iwu na-achọ ime nke a ruo oge ụfọdụ, mana ihe ndị ọzọ eburula ụzọ. Anyị nwere ikike ugbu a, yabụ anyị na-eji ohere ahụ. --CRoslof (WMF) (talk) 22:35, 18 August 2016 (UTC)[reply]

' Ọ nwere ihe ọ bụla ga-agbanwe maka ndị editọ n'ihi mmejuputa atụmatụ ọhụrụ nwebisiinka?

Ikekwe, dabere n'ihe nsogbu na ngwọta ndị mmadụ na-achọpụta. Dịka ọmụmaatụ, ndị Wikimedian nwere ike irite uru site na mgbanwe ụfọdụ na ebe onye ọrụ maka ntinye aka. Ma ọ bụ anyị nwere ike ịchọpụta na ụfọdụ amụma nwebiisinka ngo nwere ike agwụlala kemgbe ndị otu obodo ma ọ bụ ndị ọrụ Wikimedia Foundation mepụtara na mbụ ma ọ dị mkpa ka emelite ya. Ihe mgbaru ọsọ abụghị ịkpaghasị usoro ọrụ ndị editọ oge niile, mana ọ dị mkpa ịtụle mmetụta na usoro ọrụ ahụ tupu emejuputa mgbanwe ọ bụla. --CRoslof (WMF) (talk) 22:35, 18 August 2016 (UTC)[reply]

Kedu oke nke Wikimedia Foundation nwere n'ịkwado maka mgbanwe iwu?

Isi njedebe anyị bụ akụrụngwa - naanị anyị nwere ọtụtụ awa ndị ọrụ na nnukwu ego anyị ga-eji na mbọ iwu ọha. N'ihi na Wikimedia Foundation bụ 501(c)(3) anaghị akwụ ụgwọ, enwekwara ihe mgbochi na oke nzute anyị nwere ike ime, anyị enweghị ike ịkwado ma ọ bụ imegide ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'otu n'otu. --CRoslof (WMF) (talk) 22:35, 18 August 2016 (UTC)[reply]

Ọ bụrụ na atụmatụ a na-akwado nkwalite ngwanrọ, kedu ihe ga-abụ usoro iheomume maka imejuputa ha?

Usoro iheomume na-adabere n'otú okwu ahụ dị, ihe isi ike nke ngwọta, na nnweta ndị ọrụ na ndị ọrụ afọ ofufo nwere nkà iji mejuputa ngwọta ahụ. Ndị otu iwu nke Foundation agba mbọ itinye akụrụngwa na atụmatụ nwebiisinka, mana anyị ga-achọ ịhazi ndị otu injinia iji mee mgbanwe ọ bụla chọrọ akụrụngwa injinia. --CRoslof (WMF) (talk) 22:35, 18 August 2016 (UTC)[reply]