Atụmatụ afọ nke Wikimedia Foundation/2024-2025/ Nkọwa mmefu ego

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation Annual Plan/2024-2025/Budget Details and the translation is 100% complete.

Ndepụta nkọwa mmefu ego

Mmefu Ego site na ebumnuche mmefu ego (na nde USD) % nke mmefu ego % nke ndị ọrụ
Akụrụngwa $92.8 49.2% 57%
Ịha nhatanha $32.8 17.4% 11%
Nchekwa & Iguzosi ike n'ezi ihe $18.5 9.8% 10%
Ịdị irè $44.7 23.7% 22%
Ngụkọta $188.7

N'afọ 2024 ruo 2025, anyị ga-aga n'ihu na-eme ihe dabara nkesa mmefu ego anyị site na ebumnuche anọ nke atụmatụ afọ anyị. Ọ bụ ezie na a na-ekenye ọtụtụ n'ime usoro mmefu ego na akụrụngwa, ọrụ nke naga na ịmepụta na imeziwanye akụrụngwa anyị nọ, n'ọtụtụ ọnọdụ, na-akwadokwa ọrụ dị na ebumnobi ndị ọzọ. Ọrụ yiwere nke a ka ana ahụta na ebumnuche ndị ọzọ na-akwadokwa ọrụ akụrụngwa anyị.

Ntinye ego ọrụ na-eto eto na akụrụngwa

Ebumnuche nke akụrụngwa anyị ka na-egosipụta mpaghara ntinye ego kachasị mkpa. Nke a gụnyere ọrụ anyị iji nye nkwado na ahụmịhe wiki nke na-akwado nkesa nke ihe ọmụma n'efu n'ụwa niile; na-eme ma kwadoo ebe nrụọrụ weebụ iri kachasị elu zuru ụwa ọnụ ; gbagheeb data,Udi , nghọta, na ngwaọrụ ndị nwere ike inyere aka nyochaa mmetụta nke ọrụ anyị; na-enyocha atụmatụ maka ịgbasa karịa nke ndị na-ege anyị ntị na ndị na-azụ ahịa na ndị na-enye aka; na-enye ọrụ niile raara ahụ nke ga-adị na Foundation iji kwado ọrụ anyị; yana ọrụ ndị ọzọ niile akọwapụtara na ebumnuche ngwaọrụ anyị. Nke a gunyere ọnụego ndị otu niile na-arụ ọrụ a, ọnụego nke na-eji arụ ọrụ data anyị, na ihe ndị ọzọ.

Kemgbe 2022-2023, ntinye ego anyị na akụrụngwa etoola site na $74.7M ruo $92.8M, na-anọchi anya oke na-eto eto nke mmefu ego anyị site na 44.2% ruo 49.2%. Ọ na-egosipụta na anyị nọgidere na-elekwasị anya ihazi ọrụ Foundation a iji kwado mkpa teknụzụ nke njem Wikimedia.

Na-akpọ nkwado mkpa nye Njem

Ọtụtụ n'ime mmefu ego maka ebumnuche Ịha nhatanha anyị na-aga n'ịkwado nkwado otu n'ụdị onyinye ego ọrụ nye ndị mmekọ, ndị ọrụ ọkachamara maka kọmitii afọ ofufo (dịka AffCom, Kọmitii Ego mpaghara) na nkwado nke mmụta ndị ọgbọ na njikọ na imekọ ihe ọnụ gburugburu Njem a.

N'ihi ntinye uchu anyị na nkwado ndịgịde ego nke ụlọ ọrụ ndị nọ na Njem na-adabere na ego sitere na ngwa ọrụ ndịa, mmefu ego anyị nke 2024-2025 na-ebute ụzọ na uto dị ukwuu na onyinye ego ọrụ njem karịa uto anyị n'ozuzu ya dị ka nzukọ. Mmefu ego zuru oke nke onyinye ego na ego njem an'enye ga-abawanye site na 9% n'afọ na-abịa, ma e jiri ya tụnyere ihe dịka 5% maka mmefu ego zuru ezu nke Foundation. Uto a na-enyere mmefu ego mpaghara aka ịgbaso mmụba nke ọnụ ahịa ụwa, kwado ụfọdụ ndị bịara ọhụrụ na Njem a, ma kwalite onyinye ego maka ihe omume na nnọkọ njem a.

Ntinye uchu anyị na-aga n'ihu n'ibute ụzọ onyinye ego nye ndị mmekọ Wikimedia, User group, na ndị ọrụ afọ ofufo na-egosi na mmụba nke onyinye na nkwado dị ka pasentị nke mmefu ego anyị, nke na-akwado ndị otu a. O sitere na 8.8% ruo 14.3% nke mmefu ego anyị n'ime afọ ise gara aga.

Ikwado atụmatụ ọtụtụ afọ na Njem a. N'afọ a, anyị ga na-akwalite nkwado nke atụmatụ ogologo oge na Otu a site n'inye echiche ọtụtụ afọ maka mmefu ego a na-atụ anya maka mmemme onyinye ego anyị. Ọ ga enye ndị mmekọ nkwado ozi ha chọrọ maka nhazi mmefu ego na atụmatụ na-adigide.

Nkọwa ego anyị na-egosi na mmefu ego anyị ga-arịwanyeelu site na ihe dị ka 5% kwa afọ na 2025-2026 na 2026-2027, na-eme ka uto yitewe nke ahụ na nchịkọba ego ọrụ n'ozuzu. Ọ bụrụ na nrịwanye ego anyị na-enweta na-agbanwe n'afọ ndị ahụ, anyị na-eme atụmatụ ịzụlite nchịkọba ego ọrụ anyị ma ọ dịkarịa ala dịka nriwanye elu ego anyị niile.

Chaatị dị n'okpuru na-egosi nchịkọba ego ọrụ a tụrụ anya ya. Eserese mmefu ego ọrụ na-egosi nchikota grants programs, dị ka Ego Nkwado Otu, Ego mmemmme ọgbakọ, na Ego Rapid. Akụkụ nkwado Wikidata nke eserese ahụ na-egosi ego Foundation nyere maka ọrụ na Wikidata. A ga-emecha nkwekọrịta mmekọ ọnụ dị ugbu a site na njedebe nke 2024-2025, a ga-ekpebi ogo ọzọ nke ọrụ ahụ n'afọ ọzọ.

Dị ka akọwara na Ebumnobi ịdị ire arụmọrụ anyị, anyị na Kọmitii Ego mpaghara ga-arụkọ ọrụ iji kpebie ka a ga-esi kesaa ego njem a n'ime afọ atọ na-abịa.

Mmemme / Ịkwakọta ego / Mmefu zuru ọnụ na nke Nchịkwa

Mmefu ego site na Ụdị mmefu ego (na nde USD)
N'udi Mmemme $145.1
Nnakọta ego $21.2
Jeneral na Admịn $22.4

N'afọ 2024-2025, atụmatụ oke ego mmefu nke Foundation bụ nke a na-eme site na mgbado anya ọrụ kpomkwem na ebumnuche , nke a na-akpọkwa "Ihe mmefu mmemme", ga-abụ ihe dịka 77% nke mmefu ego, dịka ọkwa anyị na-atụ anya na 2023-2024.  

Ebumnuche anyị maka oke mmefu ego mmemme a bụ iji mee ka ọ daba na omume kacha mma nke mpaghara anaghị akwụ ụgwọ. Otu ntule ọrụ ebere nnọọrọ onwe ya dị ka Charity Navigator na-enyere aka guzobe omume ndị a kacha mma. Charity Navigator ka amaara maka ndị anaghị akwụ ụgwọ kacha elu karịa> mmefu ego mmemme 70%.

Kwa afọ, anyị na-ahụ na anyị gafere ihe kachasị mma nke 70% omume kacha mma na ọrụ nke Charity Navigator iji hụ na nzukọ anyị na-arụsi ọrụ ike ma dị irè. Nke ahụ bụ otu anyị si nwee ike ime ihe karịrị 75% n'afọ ndị na-adịbeghị anya.  

Anyị ga-edobe ọkwa ọrụ ebere anyị nwere kacha elu ebe anyị na-abawanye ntinye ego nke nnakọta. Na atụmatụ nke afọ gara aga, anyị kọwara mmụba a na-atụ anya ya na nnakọta ego n'afọ ndị na-abịa ka anyị na-eme atụmatụ maka ito eto na nnukwu onyinye, nnakọta ego email, na ọwa ọhụrụ ndị ọzọ na-adịghị arụsị ọrụ ike nke ọma karịa ọkọlọtọ nnakọta ego . Ịga n'ihu n'ịkwalite ụzọ ego anyị na-enweta dị oke mkpa maka mmemme ịnakọta ego na-agbanwe agbanwe. Anyị ghọtara na ọ ga-emetụta nnakọta ego na oke mmemme anyị.

Nchịkọta ndị ọrụ

Ndị ọrụ na Foundation bụ otu ihe karịrị mmadụ Narị isii na iri anọ bụ ndị na-asụ karịa asụsụ iri asaa na ise (ma na-agukwu!) ma na-agbasa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mpaghara oge ọ bụla, na mpaghara asatọ Wikimedia. Foundationahụ ga-ekekọrịta foto nke ngụkọta isi isi, nkesa mpaghara, na nyocha uto n'otu afọ na atụmatụ Kwa Afọ.

Na nlele na Disemba 31, 2023
Ọnụ ọgụgụ isi anyị niile 644 Anyị nwere ndị ọrụ Foundation Narị isiina iri anọ na anọ na 31 Disemba 2023.

Ọnụ ọgụgụ a gụnyere ndị ọrụ na Foundation, na Employers of Record, na ndị ọrụ nkwekọrịta oge a kapịrị ọnụ bụ ndị nọ na Foundation ruo ọnwa isii ma ọ bụ karịa.

Mba 54 Ndị anyị nọ n'ofe mba iri ise na anọ nakwa kọntinent niile ewezuga Antarctica.
Uto na ọnụ ọgụgụ isi -9% Ọnụ ọgụgụ isi agbadala site na 9% n'ime ọnwa iri na abụọ gara aga (Dec 2022 - Dec 2023).
Ndị ọrụ na-abụghị ndị US 49% 49% nke ndị ọrụ anyị nọ na mpụga USA.
Oge n'ime afọ 4.2 Ndị ọrụ na-anọ ihe dịka afọ 4.2