Atụmatụ afọ nke Wikimedia Foundation/2024-2025/akụkọ ihe mere eme

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation Annual Plan/2024-2025/History and the translation is 100% complete.

Otu Wikimedia webatara Usoro Ntuziaka atụmatụ n'afọ 2017. Mgbanwe na ụwa gbara anyị gburugburu na-eme ka ntụziaka a dịkwuo mkpa karịa ka ọ dị na mbụ. N'afọ a, Wikimedia Foundation ga-aga n'ihu na-achịkọba ọrụ ya n'usoro atụmatụ ntuziaka a ' ma lekwasị anya n'ịkwado Njem Wikimedia ka ọ bụrụ akụrụngwa dị mkpa nke gburugburu ebe ọdịdị ihe ọmụma n'efu.

N'afọ 2020, Otu anyị webatara usoro ntuziaka atụmatụ njem a, na n'ime afọ anọ gara aga, anyị enweela ọganihu n'ọtụtụ n'ime ha. Ka anyị na-eru nso afọ 2030, anyị ga-anọgide na-ekwupụta ụzọ ọhụrụ nke ga-enyere anyị aka ịkwado njema iji jee ozi dị ka akụrụngwa nke ihe ọmụma n'efu gafee 2030. N'akụkụ usoro atụmatụ Movement Strategy nke dị na Foundation na atụmatụ ndị mmekọ ndị ọzọ kemgbe 2020, lee ọmụmaatụ ole na ole nke atụmatụ dị mkpa ọtụtụ afọ iji zaghachi na ntụzịaka atụmatụ Njem a:

Ịkọwapụta ọrụ na ibu ọrụ Njem a na-aga n'ihu

Anyị na-aga n'ihu na-achọpụta ụzọ e ga-esi hụ na enwere ịha nhata n'ime mkpebi ma dokwuo anya ọrụ na Njem a. Movement Charter ka atụpụtara ịkọwa ọrụ na ibu ọrụ n'ọdịnihu na Njem a maka nhazi ka mma na mmetụta siri ike. Kemgbe 2021, kọmitii na-edepụta akwụkwọ ikike nke Movement Charter (MCDC) edepụtala ederede ahụ, na-alụso nsogbu ndị a na-apụghị izere ezere na-eche Otu ha otua dị ka nke anyị ma dị mgbagwoju anya ihu. Na June 2024, a ga-eme ntuliaka akwụkwọ ikike a na ngalaba dịgasị n'otu anyị.

N'ikwekọ n'ụkpụrụ nke Subsidiarity na efficiency, Wikimedia Foundation na-anọgide na-ịgba mbọ ikesa na ibufe ibu ọrụ nke ụlọ ọrụ njem ndị ọzọ kwadoro nke ọma inwe. Foundation eritela uru site na inwe njikọ aka ha na ndị MCDC na mkparịtaụka ya na ọtụtụ ndị isi nsonye n'ụwa niile iji zie ozi ma chịkọba echiche ya maka ọrụ ndị a ga-eme n'ọdịnihu.

N'adabereghị na mpụtaara nke votu nkwado Charter, Foundation kwenyere na e nwere usoro ngwa ngwa nke a ga-eme taa iji nwee ọganihu na ebumnuche 2030. Anyị na-akwado ọrụ ndị a ka anyị na ndị ọrụ afọ ofufo na-elekọta ya. Mgbanwe na-adịgide adịgide na-ewe oge, iji mee ya nke ọma, anyị kwesịrị ịmalite ime mgbanwe nhazi ndị a ugbu a:

  • Nsonye nkesa ego ọru - N'afọ 2020, anyị mepụtara Kọmitii n'ahụ maka nnyefe ego mpaghara iji nye Foundation ndụmọdụ gbasara oke ego ọrụ mpaghara ma mee mkpebi nnyefe ego gbasara ego ọrụ ngalaba otu. N'afọ a, anyị ga-arịọ kọmitii a ka ha na Foundation na-arụkọ ọrụ ka ha nye ndụmọdụ na gbasara oke ego ọrụ mpaghara, na-eme ka mmejupụta nsonye ikenye ihe onwunwe weere ọnọdụ ma hụ na ịha nhatanha dị ukwuu na mkpebi ego ọrụ.
  • Kansụl ndụmọdụ nke nwale ngwaahịa na teknụzụ - Echiche a nke ewulitere na Kọmitti ngwaahịa na teknụzụ Wikimedia Foundation ma na-agbaso usoro atụmatụ ntuziaka Otu nke Kansul Teknụzụ. N'afọ a, anyị ga-eme obere nwale iji nyochaa ma nye ndụmọdụ nye ọrụ ndị otu ngwaahịa na teknụzụ nke Wikimedia Foundation.
  • Kwalite Usoro atụmatụndị Mmekọ - N'afọ gara aga, Board of Trustee nke Wikimedia Foundation nwere njikọ aka nrụkọ ọrụ ha na Kọmitii Mmekọrịta, ndị mmekọ, na ndị ọrụ Foundation iji kwalite Wikimedia Foundation Affiliate Strategy. N'afọ a, anyị ga-ezipụ mmụta anyị nwetara wee zaa ajụjụ ụfọdụ dị mkpa site na usoro ahụ.