Jump to content

Ntuliaka nke Wikimedia Foundation/2024/FAQ

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation elections/2024/FAQ and the translation is 100% complete.

Ajuju zuru ọnụ

Gịnị bụ Board of Trustees?

Wikimedia Foundation Board of Trustees na-ahụ maka ọrụ Wikimedia Foundation. Ihe mejupụtara kọmitii Board of Trustees bụ otu-na ndị mmekọ ahọpụtara, Ndị nlekọta ahọpụtara, na onye nchọpụta otu. Onye nlekọta ọ bụla na-eje ozi afọ atọ. Otu ngalaba Wikimedia nwere ike isonye n'ịhọpụta ndị nlekọta obodo na ndị mmekọ ahọpụtara.

Ole ndị bụ ndị nnọchi anya na Board?

Ndị nnọchi anya a bụ ndị si n'akụkụ ụwa niile nwere ahụmịhe dị iche iche. Chọpụtakwuo ihe gbasara onye nọ ugbu a na Board of Trustees nke Wikimedia Foundation

Gịnị bụ kọmitii ntuliaka ma gịnị kpatara ha ji kpebie iso usoro ntuliaka?

Kọmiti ntuliaka na-ahụ maka ntụliaka Otu nke Board of Trustees Wikimedia Foundation. Ebu ụzọ hiwe kọmitii ntuliaka na Julaị 2016, ma ndị bu ụzọ adịla kemgbe e mere ntuliaka mbụ nke Board na 2004. Kọmiti ahụ nwere ndị ọrụ afọ ofufo sitere na ngalaba otu.

Ihe gbasara ọchịchị n'amasịm! Kedu otu m ga-esi sonyekwuo na ntuliaka Board?

Nke ahụ mara mma! Ka ndị otu na-etinye aka na ntuliaka ahụ, ka usoro ahụ na-akawanye mma. Ndị otu ngalaba nwere ike bụrụ onye na-adọ ndoro-ndoro ochichi ma ọ bụ sonye dị ka Onye ọrụ afọ ofufo nke ntuliaka.

Ndị ọrụ afọ ofufo nke ntuliaka na-anọch oghere dị n'etiti kọmitii ntuliaka, ndị otu Wikimedia Foundation na-akwado ntuliaka Board, na ngalaba otu digasinụ. Ha na-enyere ndị sonye na otu ngalaba aka isonye na ntuliaka ma tinye aka n'ịhazị otu anyị.

Ajụjụ ndị a na-ajụkaarị ndi na-adọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị

Ohere Oche nnọchianya ole na-adị n'oge a?

Enwere oche anọ (4) nke otu ngalaba na ndị mmekọ ahọpụtara maka usoro nhọpụta bọọdụ 2024.

Gịnị kpatara m ga-eji nwee nka ịsụ Bekee nke ọma?

A na-eme ihe niile gbasara Board n'asụsụ Bekee na ndị nlekọta ga-amarịrị nke ọma otu esi asụ ma otu esi n'ede Bekee. N'ihi mkpuchi na ozuzo ihe achọghị mfesa, Foundation enweghị ike ịkwado ntụgharị asụsụ maka ihe ederede ma ọ bụ nzukọ. Foundation ahụ ga-enyere aka ịkwado ndị nnọchịanya bụ ndị ga-achọ ịkwalite akụkụ nke ịsụ bekee ha, dị ka mkpọpụta Bekee ha.

Gịnị kpatara ntozu kacha nta ji gbanwee?

Ndị na-adọ ndọrọ ndọrọ ga-enwerịrị ntozu kacha nta iji jee ozi na Board of Trustees. Ndị otu nhọpụta Board nke Wikimedia Foundation achọpụtala ụkpụrụ ndị a kacha nta site ntinye si na kọmitii ntuliaka. Ihe mgbakwunye abụọ nke afọ a bụ - ahụmịhe gara aga na-ejem ozi na otu ndị na-eme mkpebi zuru ọnụ, ọkachasị bọọdụ ma ọ bụ kọmitii na ahụmịhe dị ukwuu na Wikimedịa (ma ọ bụ nke yiwere ya) iwulite otu na nhazi ihe - bụ iji chọpụta ndị ga-enwe ahụmịhe dị mkpa iji gaa n'ihu dị ka onye otu Board.

Gịnị ka 'ezigbo aha' pụtara? Gịnị mere m ga-eji kpughee ihe nke a?

'Ezigbo aha' na-arụtụ aka na aha enyere gị. Ọ bụrụ na ahọpụtara gị ma ọ bụ kpọlite gị na Board of Trustees, a ga-eji aha enyere gị mee nyocha ndabere na mgbasa ozi. N'otu oge ịnọ na bọọdụ ahụ, a ga-eji aha a enyere gị maka akwụkwọ mkpesa mpụga achọrọ, dị ka Ụdị 990, nke iwu chọrọ, dị ka ọgbakọ anaghị akwụ ụgwọ na US.

'Gịnị na-eme n'oge nlele ndabere na nlele mgbasa ozi?

Maka nlele ndabere, Foundation na-arụkọ ọrụ ha na onye na-anakọta ozi sitere n'aka ndị na-eme ntuliaka (gụnyere mbịpụtaharị nke ID ha) wee lelee ya megide nchekwa data dị iche iche nke ndekọ mpụ, iwu na ihe gbasara ego. Ụlọ ọrụ Talent & Culture nke Foundation na-ahụ maka nyocha ndabere a, bụ ndị na-egosi ihe ọ bụla nwere ike ime na ndị ọrụ Board. Usoro nlele yiweere nke a na-eji mgbe a na-ewe ndị ọrụ Foundation n'ọrụ

Maka nlele mgbasa ozi, Foundation na ndị Vendọ na-arụ ọrụ nke na-achọ mkparịta ụka nke onye ntuliaka na mgbasa ozi yana nkwupụta ọha na eze nke onye ntuliaka ahụ kwuru. Ngalaba Talent & Culture Foundation bụ ndị n'eme nyocha ndabere a, na-ahụ maka inye nchịkọta ma n'egosipụta nchegbu ọ bụla ndị board nwere.

Ị nwere ike mụtakwuo ebe a.

'Kedu ihe atụ nke ihe akaebe nke njirimara? Kedu mgbe a chọrọ ihe akaebe na gịnị ga-eme na ihe akaebe ahụ ma ọ bụrụ na m azọchaa?

Ihe akaebe nke njirimara nwere ike ịbụ ụdị njirimara ọ bụla, gụnyere kaadị njirimara na paspọtụ gị. Mgbe ị kwuputara mmasị isonye na ndoro-ndoro ochichi gị, a ga-agwa gị ka iziga ihe akaebe njirimara a na secure-info@wikimedia.org iji kwado njirimara gị. Ma ozugbo usoro nhọrọ ahụ gasịrị, a ga-ehichapụ ihe akaebe nke njirimara gị.

Gịnị kpatara eji nwee usoro mwepụta aha?'

Ntụle ngalaba otu nke usoro nhọpụta gara aga achọpụtala na ọ gaghị ekwe omume maka ọtụtụ ndị ntuliaka iji ntụsara ahụ nyochaa ihe nke onye ọ bụla na-eme ntuliaka ma ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ndị na-eme ntuliaka dị ukwuu. A natara nkwupụta ndị a n'oge usoro nhọpụta Board nke 2021 mgbe enwere ndị na-apụta na ntuliaka iri na itoolu maka oche abụọ. Maka usoro nhọpụta nke afọ 2024, a ga-eme ka usoro ndepụta aha rụọ ọrụ ma ọ bụrụ na enwere ihe karịrị mmadụ iri na ise. Ogo ọnụ ọgụgụ ndị a ga-eme ntuliaka dabeere na ọnụ ọgụgụ oche ndị nwere oghere, nke ga-abụ anọ n'afọ a.

Gịnị kpatara ndị mmekọ na-eme ndepụta aha a?

Ndị mmekọ ọ bụla nwere ndị nnọchi anya abụọ ahọpụtara iji hazie ikere òkè na usoro metụtara otu. Ndepụta aha - na nyochaa nke ọma ihe ndị a na-eme ntuli aka - na-ewe oge na mgbalị dị ukwuu, na ndị mmekọ esonyela nke ọma na usoro a n'oge gara aga. A na-atụ anya na ndị nnọchi anya ndị mmekọ ga-etinye aka na ịhazi ya na ndị otu obodo ọzọ n'ịlele ndị na-eme ntuli aka, na-eduga na usoro nsonye.

Kedụ ihe a na-atụ anya na ndị mmekọ ga-eme na mkpebi ha maka ndenye aha ndị nnọchi anya ?

A na-atụ anya na ndị nnọchi anya ndị mmekọ na-eduzi ndetu a ga-eji nlezianya nyochaa onye ọ bụla n'ime ha na-atụle ihe achọrọ na njirisi achọrọ maka ndị na-eme ntuli aka Board of Trustee dị ka kọmiti ahụ siri kọwaa. Ha kwesịrị ịhọrọ naanị ọtụtụ ndị ga-eme ntuliaka dịka ha ga-atụ anya ka ha bụrụ onye nlekọta Wikimedia Foundation, ruo ihe ruru mmadụ iri na abụọ. Ọ bụrụ na ha achọta ihe karịrị mmadụ iri na abụọ ndị nwezuru ihe a tụrụ anya ya, ha kwesịrị ịhọrọ iri abụọ ndị kachasị mma.

Ònye ga-emenye ụkpụrụ ntụzịaka mkpọsa?

Kọmitii ntuli aka ga-ahụ maka ịkwado ụkpụrụ ntụzịaka maka ndị na-edonye na ntuliaka.

Gịnị kpatara e ji eme usoro mwebata maka ndị na-achọ isonye?

Usoro nwebata na-arụ ebumnuche abụọ: (1) iji nyere ndị na-eme ntuliaka aka ịchọpụta ma ọrụ ha ọ bụ ihe ha tụrụ anya ya na ọ bụrụ na ha bụ ndị dabara adaba maka ọrụ ahụ yana (2) iji nyere aka ịzụlite nkà ndị ga aga na Board of Trustees dị mfe maka ọrụ ahụ ndị a họpụtara ahọpụta.

Ajụjụ ndị n'eme ntuliaka na-ajụkaari

Enwere ihe achọrọ iji tozuo ịtụ vootu?

Ee, e nwere. Kọmitii ntuliaka na-ekpebi ụkpụrụ ntozu ịtụ vootu.

Ugboro ole ka m nwere ike ịtụ votu?

Iwu bụ: otu onye ọrụ, otu votu. Iji zute ntozu ịtụ vootu onye ndezi, a ga-agụta ntunye gị n'ofe wiki niile, ma ọ bụrụ na ọ bụ home-wiki ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ.

Ọ bụrụ na ị kpebie ịgbanwe votu gị, ị nwere ike ime ya. Nke a nwere ike ịbụ n'ihi na ị gbanweela obi gị ma ọ bụ ọ bụrụ na i mehiere. Tụọ votu ọzọ, a ga-akụtu votu gị gara aga.

Olee mgbe a ga-ahọpụta ndị nlekọta ahọpụtara?

A na-atụ anya ime nhọpụta ikpeazụ na nzukọ Board of Trustees nke December 2024.

Olee usoro ntuliaka kọmitii ntuliaka kpebiri?

Kọmiti ntuliaka ahụ họọrọ usoro Otu votu a na-enyefe. Usoro ịtụ vootu a na-enye ndị na-eme ntuliaka aka ịhọpụta ndị ga-eme ntuliaka kama ịtụ vootu maka otu onye ndoro-ndoro ochichi. Nyochaa ihe atụ nke usoro ịtụ vootu na Meta-wiki.

Olee ebe a ga-eji mee ntuliaka a?

Dịka ọ dị na ntuliaka Board of Trustees niile kemgbe 2009, ntuliaka a ga-eji ibe SecurePoll.