Leadership Development Working Group/Call for feedback on the draft shared leadership definition/ig

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
Outdated translations are marked like this.

TL; DR: nkọwa ndú nke Òtù ndị Na-arụ ọrụ Mmepe Ndú haziri dị njikere maka nzaghachi obodo!

Biko gwa anyị nzaghachi gị na ibe okwu Meta-Wiki anyị, fọm nzaghachi (njikọ akwụkwọ Google), ma ọ bụ Ogbako Movement Strategy. Ị nwekwara ike izitere anyị ozi ozugbo na leadershipworkinggroup(_AT_)wikimedia.org. Anyị na-anakọta nzaghachi ruo Ọktoba 6, 2022.

Ndewo onye ọ bụla!

Enwere m olileanya na ị maara na Leadership Development Working Group (LDWG) na-arụ ọrụ n'ime ọnwa ole na ole gara aga iji chepụta na ịchọta ụzọ anyị ga-esi zụlite nduzi nke ije anyị. LDWG bụ otu ndị ọrụ afọ ofufo Wikimedia na-anọchite anya obodo dị iche iche, asụsụ, ọrụ na ahụmịhe. Obi dị anyị ụtọ ịgwa ndị obodo na nkọwa anyị dị ugbu a maka nzaghachi obodo. Edere nkọwapụta nke mbụ a gbasara ndu ka ọnwa nke mkparịta ụka, mmụta na ikekọrịta site n'echiche obodo anyị gasịrị. Ije Wikimedia, nke sitere na okike di iche iche ma pụọ iche n'uzo nke ya, a kwupụtara nke ọma site na nkọwa a.

Biko tụlee ịyocha nkọwa ahụ wee mee ka anyị mara ihe ị chere ka ọ na-erule Ọktoba 6, 2022. Nkọwa ahụ gụnyere nkọwa zuru oke nke onye isi na ngalaba nke na-akọwapụta omume, àgwà, na nsonaazụ nke ezigbo ndu.

Enwere ọtụtụ ebe ị nwere ike kwupụta echiche, ntụnye, na nkọwa gị, dị ka ibe okwu Meta-Wiki, fọm nzaghachi, na Ogbako Movement Strategy. Ị nwekwara ike izitere anyị ozi ozugbo na leadershipworkinggroup(_AT_)wikimedia.org

Ị nwere ike ịlele ma izugbe nkọwapụta, na ngalaba ma ọ dakọtara na echiche gị nke idu ndú na ije a. Ị nwekwara ike ịnwale ịchọta oghere, ma eleghị anya ụfọdụ àgwà nke idu ndu ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na-efu na nkọwa a, ma ọ bụ ị nwere ike ịlele ma nkọwa ahụ o metụtara omenala, asụsụ, obodo ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ nke ije a ma kọọrọ anyị echiche gị. .

N'ijikọta aka Ọnụ, ka anyị ṅụrịa ọṅụ maka ụdị ndú pụrụ iche na ije a!

Ekele!