Akwụkwọ ikike/Ndị orụ afọ ofufo

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Movement Charter/Volunteers and the translation is 83% complete.
Outdated translations are marked like this.


Ndị ọrụ afo ofufo

Ndị ọrụ afọ ofufo bụ mmadụ bụ isi nke Njem Wikimedia, ma nwee ikike dị ka onwe onye n'otu n'otu itinye aka na ebumnobi Wikimedia. Onye ọrụ afọ ofufo bụ onye na-etinye oge na ume nye mmemme Wikimedia, ma ọ bụ n'ịntanetị ma ọ bụ na-anọghị n'ịntanetị, ma na-eme ndezi ọrụ, ọrụ nchịkwa, ntinye aka na kọmitii, nhazi mmemme na ihe omume ndị ọzọ. Ndị na-arụ ọrụ na ọrụ afọ ofufo ha anaghị anata ụgwọ ọnwa maka mbọ ndị a, mana ha nwere ike ịnata nkwụghachi ụgwọ, ihe nrite, ngwa, ngwugwu nkwado, ikike, na ụdị nkwado ma ọ bụ nkwado ndị ọzọ.

Ndị ọrụ afọ ofufo na-etinye aka na mmemme onye ọ bụla ma ọ bụ mkpokọta na oghere a dabere na mmasị onwe onye, ​​ma e kwesịrị inye ya ike isonye mgbe ọ bụla enwere ike.

Ọrụ

  • Ndị ọrụ afọ ofufo niile ga-agbaso iwu amụma ọrụ mgbe ha na-eme ntunye.
  • Ndị ọrụ afọ ofufo niile ga-aza ajụjụ maka ntinye aka ha na Ọrụ Wikimedia ma na-ahụ maka omume ha n'otu n'otu.

Ngalaba otu Wikimedia

Ngalaba Otu Wikimedia bụ otu ndị mmadụ na-enye aka n'ịntanetị na ndị na-anọghị n'ịntanetị iji wuo ma kwalite njemozi Wikimedia. Ngalaba otu a na-abụkarị ndị ọrụ afọ ofufo, ndị ọrụ a na-akwụ ụgwọ na ndị nnọchi anya sitere na ndị mmekọ na-arụkọ ọrụ ọnụ, ma nwee ike ịmepụta ma ọ bụ kwado ya site na kọmitii. Ngalaba otu Wikimedia gụnyere ngalaba ọrụ dị iche iche, ngalaba asụsụ, na teknụzụ/ndị mmepe.

ngalaba otu oru ngo nke Wikimedia nwere ikike maka atumatu n'ime oru ngo nke onwe ha. Ngalaba ndị a na-eguzobe atumatu ha n'ime usoro iwu zuru ụwa ọnụ, gụnyere Usoro ojiji maka ebe nrụọrụ weebụ ọrụ.[1]. Nnwere onwe na-enye ohere maka nnwale iji zụlite ụzọ mmekọrịta ọha na eze na teknụzụ ọhụrụ. A na-atụ anya na ngalaba otu ga ekwupụta maka ọrụ ha na ọchịchị ya, ka onye ọ bụla na-eme njem a nwee ike ịrụkọ ọrụ ọnụ dị ka otu zuru ụwa ọnụ iji hụ na usoro anyị dị mma na enweghị ihu abụọ.[2] Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mkpebi niile emere na ọrụ Wikimedia nke onwe onye bụ ndị ọrụ afọ ofufo ndị na-eme ntunye na-eme, n'otu n'otu ma ọ bụ dị ka otu nwere mmasị.[3]

Ikike

  • Ngala otu Wikimedia nwere njikwa ndezi zuru oke nke ọdịnaya n'ime oru ngo Wikimedia nke onwe ha dịka usoro iwu zuru ụwa ọnụ hiwere, gụnyere Usoro ojiji maka webụsaịtị ọrụ Wikimedia.
  • Ngalaba Otu Wikimedia na-ahụ maka mkpebi esemokwu na usoro nhazi nke onwe ha, ma ọ bụrụhaala na otu a adịghị emebi iwu gburugburu.[4]

Ọrụ

  • Ndị ngalaba Otu Wikimedia kwesịrị inwe ohere ka ndị ngalaba Otu na-esonyere ya, na n'ọchịchị ya. Onye ọ bụla nke na-agbaso usoro iwu ma nwee oge na nkà zuru oke kwesịrị ka anabata, ma gbaa ya ume, isonye.
  • Ndị Otu Wikimedia kwesịrị ịgba mbọ hụ na-enwere izi ezi na nha anya n'ọchịchị na mmepụta iwu iji kwado ndigide nke Otu niile.
  • Iji nye ohere maka usoro nleba anya mepere emepe nke ọrụ Wikimedia onye ọ bụla, ndị ngalaba Otu Wikimedia na-ahụ maka ịnye ozi eziokwu gbasara ọnọdụ ọchịchị nke ọrụ a.

Ndetu

  1. Ihe atụ amụma ndị ọzọ gụnyere Universal Code of Conduct (UCoC), Nzuzo, CheckUser, na ikikere ojiji.
  2. Usoro nyocha nke mepere emepe kwesịrị ịbụ nke obodo ọ bụla.
  3. nke Pụtara "ndị na-pụtara" iji nyere aka mee mkpebi, ma ọ bụ na-agbanwe ọdịnaya. ma ọ bụ amụma.
  4. Amụma otu nwere ike ọ gaghị emegide amụma ụwa ma ọ bụ ọrụ iwu.