Akwụkwọ ikike Otu/Okwu mmalite

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Movement Charter/Introduction and the translation is 100% complete.


Wikimedia Movement bụ òtù mba ụwa, n'emetụta omenala ọha, nke ọrụ ya bụ iweta ihe ọmụma efu n'ụwa niile. Akwụkwọ ikike otu Wikimedia ("Charter") na-akọwa ụkpụrụ, ikike, mmekọrịta, na ibu ọrụ nke ndị niile sonyere na ozi nkekọrịta nke njem a. Akwụkwọ ikike a na-emetụta ndị niile sonyere na ụlọ ọrụ bụ ndị nsonye, ngalaba otu digasị na otu a, ọrụ, yana oghere dị n'ịntanetị na ndị na-anọghị n'ịntanetị metụtara njem Wikimedia .

Site n'ịkọwa njem Wikimedia na ụkpụrụ ya, Akwụkwọ ikike a nwere ebumnuche ime ka ọ dịrị ndị ntinye aka na njem a mfe ijikọta ọnụ. Nke a ga-enyere aka:

  • nye nkwenye nke ịbụ onye nsonye,
  • chepụta atụmatụ jịkọtara ọnụ maka uto, mgbasawanye, na ohere n'ọdịnihu iji chekwaa ihe okike na-aga n'ihu na ọdịdị nnweta ihe ọmụma efu,
  • chekwaba ikike ndị nyere onyinye, yana ọdịmma metụtara ego nke otu a,
  • njikwa ime mkpebi, na
  • belata esemokwu n'etiti ndị nsonye na njem a.

Enwere ike mezigharịa Akwụkwọ ikike a ma ọ bụrụ na achọọ , dịka ngalaba Mmezigharị siri dị.

Ụkpụrụ

Otu Wikimedia na-anabata usoro apụrụ inyochapụta eziokwu, nsonye akpaghị oke nke ihe ọmụma n'efu. A na-achịkọta ya site n'ụkpụrụ jikọtara ọnụ na-eduzi omume anyị niile. Mkpebi niile kwesịrị igosipụta ụkpụrụ ndị a jịkọtara anyị. Dị ka ntinye n'ọrụ, ọ dị mkpa ka Otu a guzozie ụkpụrụ iji mezuo ebumnuche bụ isi njem a ma nye ndị nsonye Wikimedia nkwado n'ụwa niile.

Ụkpụrụ ndị a gụnyere ndị dị ugbu a na mmalite anyị ma gbasaa ruo ndị dị mkpa iji nyere aka na ntolite maka ọdịnihu anyị. Ụkpụrụ ndị a na-ahụta ịkekọrịta ihe ọmụma dịka mbọ njikọ aka ọnụ.

Ihe ọmụma n'efu

Otu Wikimedia na-eji ikike ojiji n'efu kesaa ọdịnaya niile ọ na-emepụta, ngwanro ya niile, yana nhiwe ya niile. Ụfọdụ ọdịnaya mpụga gụnyekwara n'okpuru ikikere dị iche iche. Ọ na-agba mbọ ime ka ọrụ ya dịkwuo omimi site n'ịgbasa mpaghara nke ihe ọmụma efu na site na ijikọta ụdị ọhụrụ na-agbanwe agbanwe nke ijide na ịkekọrịta ihe ọmụma yana ụdị ọdịnaya dị iche iche na-eto eto.

Nnwere onwe

Otu Wikimedia na-agba mbọ ịrụ ọrụ n'onwe ya, site na-nduzi nke ebumnuche ihe ọmụma n'efu ya, ọ bụghịkwa site na inwe ihu abụọ ma ọbụ ile anya n'ihu. Otu a na-ajụ imebi ọrụ ya na nzaghachi maka mmetụta azụmahịa, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ego ndị ọzọ, ma ọ bụ nkwado.

Ime mkpebi na nhazi onwe

Otu Wikimedia na-enyefe mkpebi n'ogo nsonye kacha dị nso ma ọ bụ nke kacha ala, malite na ndị ọrụ afọ ofufo ya. Ngalaba ndị n'esonye n'ịntanetị na ndị na-anaghị esonye n'ịntanetị n'ofe ụwa kwesịrị ịme mkpebi nke onwe ha, site na ụkpụrụ nke ime mkpebi nke onwe. Ịkwado ọchịchị onwe na ikike ịnọọrọ onwe bụ akụkụ dị oke mkpa nke ụkpụrụ njem zuru ụwa ọnụ.

Iha nhata ziri ezi

Otu Wikimedia maa gbasara ihe ịma aka dị iche iche ịha nhata ihe ọmụma nke ngalaba otu na-eche ihu ma na-agba mbọ inye ha ike imeri akụkọ ihe mere eme, ọha mmadụ, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ụdị ndị ọzọ nke ahaghị nhata na nkọwahie. Otu a na-arụsi ọrụ ike iji kwalite ma nweta nha anya n'ihe ọmụma, ma guzobe ụzọ iji kenye ngwa site n'ọchịchị dị iche iche na Otu na inye ike nke ngalaba.

Nsonye

A na-emepụta ọrụ Wikimedia n'ọtụtụ asụsụ, na-egosipụta ọtụtụ mpaghara na omenala. Nkwanye ùgwù zuru ọnụ maka ndịiche dị iche iche nke ndị nsonye njem a na-ato ntọala nke mmemme niile, ma na-akwado nke a site na usoro iji kwado nchekwa na nsonye. Otu Wikimedia na-agba mbọ inye ohere dị iche iche, ebe onye ọ bụla nwere ebumnuche na ozi na ụkpụrụ nwere ike isonye ma sokọrịta ndị ọzọ n'okpuru ọhụụ nke ndị mmadụ. Oghere nsonye a na-akwalite nnweta site na teknụzụ enyemaka maka mkpa pụrụ iche dị iche iche.

Nchekwa

Otu Wikimedia na-ebute ọdịmma, nchekwa na ozuzo nke ihe gbasara ndị nsonye ya ụzọ. Ọ na-eme ka e nwee ebe nchekwa dị mma nke na-akwalite ụdị dị iche iche, nsonye, nha anya, na mmekorita, nke dị mkpa maka isonye na ihe ọmụma efu na gburugburu ebe obibi ozi ịntanetị. Ọ bụ ihe dị mkpa iji hụ na nchekwa na oghere dị n'ịntanetị na udi abụghị n'ịntanetị. Nke a na-aga n'ihu site na mmejuputa iwu na mmanye nke ụkpụrụ omume zuru oke, na ntinye ego nke ihe onwunwe dị mkpa iji kwado ọrụ ndị a.

Ịza ajụjụ

Otu Wikimedia na-aza ajụjụ onwe ya site n'aka ndị isi obodo dị ka a na-anọchi anya ya n'ime ọrụ Wikimedia na Movement Bodies. A na-emejuputa nke a site na ime mkpebi doro anya, mkparịta ụka, ọkwa ọha, mkpesa nke mmemme, na ịkwado Ọrụ nlekọta.

Nkwechiri

Otu Wikimedia na-eme nke ọma site na ihe ọhụrụ na nnwale, ma na-emegharị ebumnobi ya mgbe niile ebe o metụtara ihe ebe ihe ọmụma efu nwere ike ịbụ. Njem a na-agbaso atụmatụ na omume dị irè, ma na-eji ihe akaebe dabere na metrik bara uru iji kwado ma tinye ha n'oru ebe enwere ike.