Akwụkwọ ikike/Nkọwa okwu

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Movement Charter/Glossary and the translation is 100% complete.


Nkọwa Okwu

Isi Nkwado

Nkwado nke ụlọ ọrụ nọọrọ onwe ya ma ọ bụ ihe owuwu na-eme ka ọrụ ndị dị mkpa na-aga n'ihu na-arụ ọrụ na Njem a. Ụdị nkwado a gụnyere ma obeghị na mbelata nzuko na nhazi mmemme na ịchịkọba mmemme, ọrụ ndekọ ego, enyemaka na mbanye ndị ọrụ, ịzụ ahịa, na ọrụ ndị ọzọ a na-eme n'azụ.

Ọrụ nlekọta

"Ọrụ nlekọta" na-ahazi ma n'akọwa mmekọrịta dị n'etiti Ọgbakọ na ngalaba otu ebe ha na-eje ozi. Nke a gụnyere, ma obeghi na: inye ohere na gburugburu ebe ọrụ na nnabata ọdịiche nye ndị otu ngalaba; na-akwado ihe omume na ọrụ Wikimedia na intanentị; na-arụ ọrụ iji nwetakwuo ihe ọmụma n'efu site na ntinye aka ndị ngalaba otu; na, na-eje ozi dị ka onye nnochite anya n'etiti ndị ngalaba otu na ọha na eze.

Ọdịnaya

Ihe ọ bụla agbakwunyere, ewepụrụ, agbanwere, edegharịrị, ehichapụrụ, ma ọ bụ megharịa ya ọzọ site na onye ọrụ edebanyere aha ma ọ bụ edebanyeghị aha ya site na iji ihu onye ọrụ ọ bụla na-eme mgbanwe n'akụkụ ọ bụla nke ọrụ Wikimedia.

Ndị ntinye aka

Onye nkwado bụ onye ọ bụla na-mepụta ma ọ bụ na-ejikwa ọdịnaya, ma ọ bụ na nkwado teknụzụ maka imepụta ọdịnaya, nke ọrụ Wikimedia.

Ndị mmekọ mpụga

Ụlọ ọrụ na-abụghị nke Wikimedia kwadoro ụkpụrụ anyị na ọrụ anyị, yana ndị na-emekọ ihe ọnụ nwere otu ndị na-eme ihe ma ọ bụ karịa n'ime Njem a.

Onye nkwado ego

Onye nkwado ego bụ ọgbakọ na-enye onyinye n'aha onye ọrụ dere maka ego ọrụ . Ndị na-akwado mmefu ego abụghị ma ọ bụ ndị mmekọ Wikimedia. Ndị nkwado gbasara ego ga-abụ ndị otu ụlọ ọrụ debara aha dị ka ndị ọrụ ebere ma ọ bụ ndị na-enweghi ebumnobi nweta ego n'ime obodo ha, ma ha kwesịrị imezu ụfọdụ usoro ntozu. mmezu usoro ntozu ndị a gụnyere, mana ọbụghị naanị na, ịbụ ọgbakọ:

  • debanyere aha dị ka ọgbakọ n'ime obodo ha (ọ bụghị ihe omume ma ọ bụ oru ngo na-enweghị nhazi ọgbakọ),
  • Nd ihe gbasara ego zuuru ha oke ma na-agbaso orụ ha ụzọ iwu kwadoro,
  • nke na-etinye aka na ebumnuche ọrụ ebere ma ọ bụ nke n'enweghi ebumnuche nnweta uru, yana akwụkwọ nke nchịkọta ihe omume ya gasị n'ozuzu oke, na ebumnuche na-egosipụta nke a,
  • nke na-adịghị etinye aka na ọrụ ọ bụla metụtara ntuliaka nke ndị ọrụ ọha n'ụzo ọ bụla, na
  • nke nwere atụmatụ edepụtara maka ihe a na-eme akụ ụlọ ọrụ mgbe ọ gbasasịrị.

Maka ndị otu US, ndebanye aha IRS nwere ọkwa 501(c)(3), ọnọdụ good standing na ndepụta dị ugbu a na GuideStar ka achọrọ.

Otu ahaziri

Otu dị iche iche na-arụ ọrụ n'okpuru iwu na usoro akọwapụtara. Ha nwere azam ajụjụ maka ọrụ ha nọ na ya (dịka ndị mmekọ Wikimedia, kọmitii mkpezi ikpe).

Otu ndị na-anọghị na nchịkọba enweghị nkọwa siri ike ma ha enweghị ikike akọwapụtara (dịka, WikiProjects).

Ihe Ọmụma efu

ihe Ọmụma efu, ihe ọmụma ekpuchighi ekpuchi, na ihe ọmụma n'efu na nke ekpuchighị ekpuchi bụ n'efu tinyere enwere ikike iji ihe ọmụma efu mee ihe , jigharịa ya mee ihe, ma kesaa ya n'enweghị mmachi ego, nke ọha mmadụ ma ọ bụ teknụzụ.

Ịchụnta ego

Ichụnta ego bụ omume nke ịchọ na inweta onyinye ego. A na-eji okwu ahụ bụ "ịchụnta ego" kọwaa usoro nke ịchọ onyinye ego site n'aka ndị otu nọọrọ onwe ha na ndị na-enye onyinye. Ịchụnta ego ebe a gụnyere onyinye ndị ọzọ na-enye, na-abụkarị iji kwado ụfọdụ ebumnuche.

Maka ụzọ ndị ọzọ e si enweta ego, lee usoro nnweta ego.

Usoro nnweta ego

Nnweta ego bụ usoro nke inweta ego iji kwado otu akụkụ ma ọ bụ karịa nke ọrụ Otu a. Ụfọdụ imaatụ nke nnweta ego bụ:

  • Ịchụnta ego,
    • tinyere onyinye ndị ọzọ nyere (anaghị egbochi ma ọ bụ iji kwado ebumnobi akọwapụtara), nnukwu onyinye, ma ọ bụ mmemme ịchụnta ego,
  • ụgwọ otu maka ndị mmekọ

Ihe metụtara inweta ego bụ "onyinye n'ụdị," mgbe otu ma ọ bụ onye ọ bụla na-etinye aka n'ọrụ na/ma ọ bụ ihe anya n'ahụ na-anaghị ego, ma ọ bụ site na ibelata ego kwesiri. Ọmụmaatụ nwere ike ịgụnye:

  • ụlo nzụkọ ma ọ ọfis
  • ohere ịntanetị, na
  • inweta ohere n'efu iji nweta ihe ndị echekwara.

Ngwa ọrụ

Akụrụngwa bụ ngwaahịa ma ọ bụ nnyefe nke ego, ihe, ndị ọrụ, ihe ọmụma na ihe abamuru ndị ọzọ mmadụ ma ọ bụ ụlọ ọrụ nwere ike ịnweta iji rụọ ọrụ nke ọma.

N'ihe gbasara Njem Wikimedia, ngwa ọrụ gụnyere:

  • akụ ego enwetara site n'nnweta ego,
  • ndị mmadụ (gụnyere oge ha, mbọ ha, na ikike ha; ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ọrụ afọ ofufo na-agba mbọ na uto njem a; na, ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị ọrụ a na-akwụ ụgwọ na-akwado ndị ọrụ afọ ofufo),
  • aha òtù Wikimedia na ọrụ ya na ihe omume ya dị ka isi iyi nke ihe ọmụma e mere ka ụwa nwee ohere nweta n'efu,
  • ọdịnaya nke ọrụ Wikimedia dị ka ndị ọrụ afọ ofufo mepụtara ma jikwaa ya,
  • nchekwa anya n'ahụ nke nwere ngwanrọ na ọdịnaya nke ọrụ Wikimedia, na
  • odide akwụkwọ mmụta na ihe ọmụma iji kwado ọrụ a na ọrụ Otu ndị ọzọ.

Ndị nsonye na ntinye aka

Onye ọ bụla ma ọ bụ otu ọ bụla, ma ọ bụ onye ọrụ afọ ofufo ma ọ bụ na ọ bụghị, n'emeela ntunye mmefu n'udi mmadụ, ego ma ọ bụ ihe metụtara ego na otu, nke nwere ike imetụta mmezu nke ebumnuche Otu ma ọ bụ nwee mmetụta site na mmezu nke ebumnuche ndị ahụ.

N'ime Akwụkwọ a, "ndị na-eme ihe" bụ ndị mmadụ ma ọ bụ otu ndị nwere oke n'imezu ebumnobi nke otu ahụ. ido anya, okwu a na-agụnye ngalaba ndị dị n'ịntanetị na ndị na-anọghị n'ịntanetị, otu ahaziri ahazi dị ka ndị mmekọ, Wikimedia Foundation, na ndị otu sitere na gburugburu ebe nkesa ozi ịntanetị, dị ka ndị njikọ na ndị mmekọ.

Inyeaka

Nkwado bụ ụkpụrụ n'akọwa n'ekwesịrị ime mkpebi n'ogo kachasị ala enwere ike, yana ndị ọzọ metụtara nọ na ọkwa dị elu na-abata naanị mgbe ọ dị mkpa.

Njem Wikimedia

“Wikimedia Movement” na-arụ aka na mkpokọta ndị mmadụ, otu, na otu ndị na-akwado ma sonye webụsaịtị na ọrụ Wikimedia. Ọ gụnyere ndị niile na-arụ ọrụ metụtara atumatu iwu, ụkpụrụ, na ụzọ ụkwụ nke Otu ahụ.[1]

Ọrụ Wikimedia

Wikimedia nwere usoro ihe ọmụma dị iche iche (dịka, Wikipedia, Wiktionary, Wikiversity, na ndị ọzọ). Ọrụ Wikimedia mpaghara ma ọ bụ nke onwe onye ọ bụla bụ ụdị nke asụsụ nke ọrụ ihe ọmụma (dịka English Wikipedia, Turkish Wiktionary). Ụfọdụ ọrụ Wikimedia bụ nke gafere udi asụsụ na enweghị ụdị asụsụ a kapịrị ọnụ (Wikidata, Wikimedia Commons). Enwekwara ọrụ ndị na-arụ ọrụ dị ka akụrụngwa maka ngalaba otu Wikimedia, dị ka Meta wiki na MediaWiki wiki.

Ndetu

  1. Della Porta & Diani (2006) kọwara na mmekọrịta ọha mmadụ nwere njirimara atọ: (a) nke bụ netwọk mmekọrịta a na-ahazighi ahazi n'etiti otutu ndi mmadu, otu, na/ma obu Ọgbakọ; (b) na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ omenala / mgbanwe; na (c) dị na ndabere nke njirimara mkpokọta. Otu a enweghị oke siri ike, ebe ọ bụ na otu dị iche iche na-ejikọ otu n'ime nke ọzọ.