Atụmatụ Mmegharị na Ọchịchị/Akwụkwọ akụkọ/6

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Movement Strategy and Governance/Newsletter/6 and the translation is 100% complete.
Movement Strategy and Governance News
previous issue 

Nnọọ na mbipụta nke isii nke Akụkọ Movement Strategy and Governance! Akwụkwọ akụkọ a na-ekesa akụkọ na ihe omume dị mkpa gbasara Movement Charter, Universal Code of Conduct, ego enyemaka Movement Strategy Implementation, Nhọpụta Ndị Board of Trustees na isiokwu ndị ọzọ dị mkpa. Ebumnuche nke akwụkwọ akụkọ a bụ inyere ndị Wikimedia aka itinye aka n'ọrụ na mmemme dị iche iche na-eme n'ime nnukwu otu Movement Strategy na Governance nke Wikimedia Foundation.

A na-ahazi akwụkwọ akụkọ MSG maka nnyefe nke otu ụzọ n'ụzọ anọ, ebe a na-enwekarị Movement Strategy Weekly, nke emebere iji gboo ndị Wikimedịa chọrọ iso usoro anyị nso nso. Ị nwere ike ịhapụ nzaghachi ma ọ bụ echiche maka mbipụta n'ọdịnihu na Ibe okwu akwụkwọ akụkọ. Ị nwekwara ike inyere anyị aka site n'ịsụgharị mbipụta akwụkwọ akụkọ n'asụsụ gị yana ikesa akwụkwọ akụkọ na ikpo okwu ndị obodo gi. Chetakwa ka ị denye aha na akwụkwọ akụkọ ebe a.

Daalụ maka ịgụ na itinye aka

Mmepe Ndu: Otu ndị na-arụ ọrụ na-malite!

N'ọnwa Febụwarị, otu Community Development (CD) bipụtara oku maka nzaghachi gbasara otu ndị na-arụ ọrụ mmepe nke ndu, nke ekesara n'asụsụ iri anọ na abụọ. Ndị nkuzi asụsụ iri na isii nke Movement Strategy & Governance chịkọtara nzaghachi site n'asụsụ ha na mpaghara ha site na ọtụtụ ọwa: Meta-wiki, Telegram, 1: 1 nzukọ, oku obodo, bọọdụ mkparịta ụka gbasara wiki na ndị ọzọ.

Oku maka nzaghachi bụ nzọụkwụ dị oke mkpa iji chịkọta ntinye obodo gbasara mmepe ndu na otu ndị na-arụ ọrụ, ebe ndị otu obodo nwere ike ịkesa nzaghachi gbasara ihe "onye ndu" pụtara, nhazi nke otu ọrụ, na mkpa maka nzaghachi obodo ịga n'ihu. Ị nwere ike ịlele nchịkọta nzaghachi na Meta-wiki.

Ọzọkwa, ngwa maka isonye na Leadership Development Working Group mechiri na Eprel 10th, 2022. A ga-ahọpụta ihe ruru ndị otu obodo iri na abụọ, gụnyere ndị ọrụ afọ ofufo na ndị ọrụ mmekọ ka ha sonye n'òtù ọrụ ahụ, nke otu afọ ga amalite na Mee 2022. Ịchọta nkọwa zuru ezu nke nhazi otu ọrụ, biko chọta ya na ibe Meta-wiki. Ọ bụrụ na ị nwere ajụjụ ndị ọzọ ma ọ bụ nchegbu, biko ziga ndị otu Community Development ozi na: comdevteam(_AT_)wikimedia.org.

Nsonaazụ Universal Code of Conduct Guidelines a putala!

Na 24 Jenụarị 2022, otu ndị Movement Strategy and Governance (MSG) kwadoro ntụgharị asụsụ na ibipụta ntụziaka mmebe iwu emelitere maka Universal Code of Conduct, na-ekpuchi ihe karịrị asụsụ iri na abụọ. Ndị kọmitii na-edepụta ndị ọrụ afọ ofufo rụrụ ọrụ n'ime afọ 2021 wepụtara ndụmọdụ ndị a.

Ndị otu ahụ tinyere aka ma gbaa ndị obodo ume ka ha nyochaa ma kwuo okwu banyere akwụkwọ ahụ sitere na mkparịta ụka obodo nke kpatara na ntuli aka zuru ụwa ọnụ. Emere usoro mkpebi zuru ụwa ọnụ site na SecurePoll na 7 ruo 21 Maachị. Ihe karịrị ndị ịtụ vootu 2,300 sitere na opekata mpe ọrụ ụlọ 128 dị iche iche nyefere echiche na nkọwa ha. Ebipụtala nsonaazụ votu a ebe a. Ị nwere ike ịgụkwu gbasara ọrụ UCoC.

Mkparịta ụka Ije a gbasara Hubu

Emere Ihe omume mkparịta ụka zuru ụwa ọnụ na Mpaghara gbasara Thematic Hubs na Satọde, Maachị 12, 2022. Ntinye aka na mmemme ahụ mepere site na arịrịọ maka ndebanye aha tupu oge eruo. N'ihi ya, onye ọ bụla nwere mmasị na mkparịta ụka ọdụ nwere ike isonye, ​​n'agbanyeghị ebumnuche ha ịmalite ma ọ bụ ịga n'ihu na-arụ ọrụ na mmpaghara ma ọ na ebe oru. Ndị Wikimedia 84 nwere ọnọdụ dị iche iche na ahụmịhe sitere n'ofe ịje a bịara mmemme ahụ. Ebumnuche nke mmemme ahụ bụ:

  • Kesaa ihe nchoputa sitere na nsonso ajụjụ ọnụ sitere na Hubs Dialogue.
  • Mara ma isi ihe nchoputa nke nyocha a na ndị sonyere ya ọ dị iré.
  • Lelee ma mkpa ndị achọpụtara ma o nwere ike imezu naanị site na nhazi Hubu.
  • Chịkọta ihe ntinye maka ịdepụta nkọwa mbido nke Hubu.

Ruo ugbu a, ọ dịghị nkọwa doro anya nke hubu; Otu n'ime ebumnuche nke mkparịta ụka ahụ bụ ịgbalị ịtụpụta nkọwa dabere na nyochaa ndị ekekọrịta nke e kwubiri site na mkparịta ụka ndị hubu, ma gbalịa ịghọta ihe n'ezie metụtara isi nke hubu.

Usoro nke a bụ nanị maka itụzi na mmụta maka omume, ọ ga-ewe oge iji ịweta ezigbo iwu dị mma n'ịje a banyere ihe ruru eru dị ka a hubu, na nanị ihe ndị hubu na-eme ka ọ dị iche na ndị mmekọ. Ọ dị mkpa ịkọwapụta njirisi kacha nta, ghọta ihe njirisi ụlọ ọrụ kwesịrị ime ka ha mepụta, yana otu ndị ntuzi ịrụ ụfọdụ ọrụ n'ezie na nhazi mpaghara na isiokwu. Mkparịta ụka ga-aga n'ihu, ọ ga-adị mkpa ka ejikọta ya nke ọma ma kwekọọ na mkparịta ụka akwụkwọ ikike, nke ga-edozi ajụjụ ọchịchị dị na gburugburu ije a.

Ebipụtara nchịkọta akụkọ na Meta-wiki.

Enyemaka Movement Strategy ka Mepere emepe!

Kemgbe mmalite nke afọ, akwadoro atụmatụ isii nwere ọnụ ahịa mkpokọta ihe dịka $80,000 USD. Enwekwara ihe achoro ime emeasaa nke ezitere n'ụzọ zuru oke nke a na-enyocha ugbu a ma na-eche mkpebi, yana ọtụtụ ihe ndi achiro ime dị okpukpu abụọ karịa ka nọ na echiche nke ndị na-akwado MSG ga enyere aka gbanwee echiche ahụ ka ọ bụrụ atụmatụ zuru oke. Nnukwu ekele maka ndị nọ ugbu a na-emejuputa atumatu ha. Nke a bụ ndepụta zuru ezu nke ọrụ akwadoro ugbu a:

Enyemaka Movement Strategy emepeghariri n'ọnwa Ọktoba afọ gara aga. Ndị na-enye mmemme MSG esorola ndị mmadụ dị iche iche, ndị mmekọ na ndị otu ndị ọrụ na-emekọ ihe iji kwalite ihe ọmụma gbasara Movement Strategy ma kwado mgbanwe nke echiche ka ọ bụrụ ọrụ zuru oke na ihe achoro ime. Site na mbọ a, anyị na-amụta ọtụtụ ihe banyere ihe ịma aka nke ọtụtụ ndị na-eche ihu n'mmeputa ihe achoro ime siri ike na ịnweta nkwado dị mkpa ọ bụghị naanị itinye akwụkwọ maka ego, kamakwa itinye aka zuru oke na mkparịta ụka Movement Strategy.

Ị nwere echiche ọrụ atụmatụ mmeghari? Ị maghị ka echiche gị ga esi daba na Movement Strategy ma ọ bụrụ na a na-enweta ego site na enyemaka MS? Biko nweere onwe gị ịkpọtụrụ onye nhazi ịrịọ nkwado. Ị nwekwara ike ịbịakwute anyị na Strategy2030(_AT_)wikimedia.org, ma ọ bụrụ na ị nwere ajụjụ ọ bụla metụtara onyinye ego nke Movement Strategy Implementation Grant ma ọ bụ echiche ịchọrọ ịkwado.

Movement Charter Drafting Committee dị njikere!

N'October 2021, ihe dị ka ndị Wikimedia 1,000 sonyere na ntụli aka na usoro nhọpụta iji guzobe Movement Charter Drafting Committee (MCDC). Kọmiti ahụ nwere ndị otu iri na ise, na ebumnuche imepụta akwụkwọ nke ga-akọwa ọchịchị n'ọdịniihu nke otu Wikimedia. Mgbe ọnwa ole na ole arụsi ọrụ ike, Kọmitii ahụ ekwenyela na ụkpụrụ na ụzọ ụzọ dị mkpa maka ọrụ ya, ma malite ịmepụta ihe ngosi nke ndepụta Movement Charter.

N'ime ọnwa ise mbụ ya a nókọtára ọnụ, kọmitii na-edepụta akwụkwọ tinyere nnukwu oge n'ịhazi usoro ọrụ ya. Dịka ọmụmaatụ, kọmitii ahụ mepụtara akwụkwọ iji kọwapụta ụkpụrụ ya na otu esi eme mkpebi n'ime, chịkọta atụmatụ nzikọrịta ozi, wee kwalite usoro iheomume nke usoro nhazi. Kọmiti ahụ dochiri otu n'ime ndị otu ya n'ihi ahụike, kwekọrịtara na otu esi arụ ọrụ na Board of Trustees ma megharịa ibe ozi ya na Meta-wiki.

Ugbu a, Drafting Committee na-atụle ụdị nke mbụ nke nkọwapụta nke Movement Charter. Iji nụ maka ndepụta ahụ, ozugbo e bipụtara ya, yana ihe ndị ọzọ gbasara ọrụ kọmitii ahụ, anyị na-akpọ gị òkù ka ị soro Mmelite MCDC (nke a na-ebikarị n'abalị iri nke ọnwa ọ bụla).

Na-ewebata Movement Strategy kwa izu - Nye aka ma denyekwa aha!

Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịchọta ụzọ n'etiti ọtụtụ peeji nke Movement Strategy, ma ọ bụ igbalịsi ike ịmata ihe na-eme na ebe ị nwere ike isonye, ​​anyị na-akpọ gị òkù ka ị denye aha na nke ewepụtara ọhụrụ Movement Strategy Weekly! Na portalu dị mfe-inweta na Meta-Wiki, ị ga ahụ ozi akwalitere ruo ugbu a banyere ihe dị iche iche na-aga n'ihu oru ngo, mmemmé na-abịa na ohere ịsonye n'ime Movement Strategy.

Ejikọtara portalu ọnụ na ibe Movement Strategy dị iche iche na Meta-wiki (dịka ọmụmaatụ, ibe ndi Hubu), nke a na-emelite ozugbo site na portalu, na-enweghị ịtụgharị asụsụ udi abuo ma ọ bụ ọdịnaya. Ọ bụrụ na ị nwere ọrụ ị na-arụ, a ga-anabata gi ịyefee ya. Ndị otu Movement Strategy and Governance Team na-anabata ntinye maka mmelite sitere na onye ọ bụla. Biko echefula ị denye aha na mmelite na ịle ibe meta!

Blọọgu Diff

Nke a bụ akwụkwọ ụfọdụ dị na Diff gbasara Strategy Movement, ọchịchị mmeghari, na isiokwu ndị yiri ya nke nwere ike ịmasị gị: