Atụmatụ Kwa Afọ Wikimedia Foundation/2024-2025/Ebumnobi/Nchekwa na Iguzosi ike n'ezi ihe

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation Annual Plan/2024-2025/Goals/Safety & Integrity and the translation is 100% complete.

Chebe ndị anyị na oru

Mee ka usoro ndị na-enye ndị ọrụ afọ ofufo nchebe sie ike. Na-agbachitere iguzosi ike n'ezi ihe nke ọrụ anyị. Mee ka gburugburu ebe obibi gaa n'ihu n'inweta ihe ọmụma n'efu.

ohere ịnweta ihe ọmụma ntụkwasị obi nke ndị ọrụ Wikimedia na-enye bara uru karịa mgbe ọ bụla. N'oge ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị mpahara na-arịwanye elu, mkpọsa nhazi mgbasa ozi n'ezighị ezi, ọgụ megide nnwere onwe n'ịntanetị, na nfesa AI , ụwa kwesirị inwe mkpa ịchọ Wikimedia.

Ọrụ anyị niile ichekwa nchekwa nke ndị Wikimedia na iguzosi ike n'ezi ihe nke ọrụ Wikimedia gbanyere mkpọrọgwụ n'ụkpụrụ ikike mmadụ, dị ka ịgbachitere nnwere onwe ikwu okwu na nzuzo, ka ọrụ ndị a wee rụọ ọrụ zuru ụwa ọnụ ma hara kwa nha anya. Iguzosi ike n'ezi ihe nke ọrụ Wikimedia chọrọ nchebe iji guzogide ihe ịma aka na egwu dị na mpụga. Ka ọ dị ugbu a, iwu na-achịkwa nhiwe ịntanetị na-aga n'ihu na-enwe mgbanwe na-enwetụbeghị ụdị ya n'ụwa niile. Iwu Ọrụ Dijitalụ na Iwu Nchekwa Ọnlaịnụ bụ naanị ihe atụ abụọ nke usoro n'ewu ewu na-aga n'ihu n'ụwa niile. N'ime mgbanwe a dị otú a na-enwetụbeghị mbụ, ndị nchịkwa ga-echebe ma kwado ndị mmadụ na ọrụ Wikimedia ruo n'ókè ha ghọtara ọrụ pụrụ iche nke Wikimedia na-arụ n'ịkwalite mmasị ọha.

Ọrụ akọwapụtara n'okpuru ebumnuche nchekwa & iguzosi ike n'ezi ihe nke afọ a na-azaghachi nye isi ihe owuwu mpụga abụọ:

  • Eziokwu nke ọdịnaya na-esiwanye ike. Esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndọrọ ndọrọọchịchị mpaghara na-eme ka o siere ndị ndezi na ndị na-ege ntị ikwenye banyere eziokwu, ebe AI na-eji ngwá agbasa mgbasa ozi n'ezighị ezi.
  • Iwu na-eweta ihe iyi egwu na ohere dnkeị iche iche site na ikike.

Dịka anyị nụkwara n'aka ndị ọrụ afọ ofufo na Talking: 2024, ọrụ Wikimedia dabeere na mmadụ ndị nwere ike inye aka mgbe ha nọ na nchekwa, mere mnabatara na nkwanye ùgwù.

Iji nye nchekwa nke ndị ọrụ afọ ofufo a ma gbachite nguzosi ike n'ezi ihe nke ọrụ Wikimedia, anyị ga-:

  1. Echebe ndị anyị: Kwalite amụma na sistemu na-enye nkwado maka nchekwa ndị ọrụ afọ ofufo. Anyị ga-eme nke a site n'ịkwalite ntụkwasị obi na nchekwa na ọrụ Wikimedia, ichedo ikike mmadụ mgbe ọrụ anyị nọ n'ihe ize ndụ, yana iwulite teknụzụ iji gbochie mmegbu buru ibu.
  2. Echebe oru anyị: Chebe iguzosi ike n'ezi ihe nke ọrụ anyị site na mbọ iji gbochie oghere inweta ihe ọmụma. Anyị ga-eme nke a site na mgbachite nke iwu na nnabata, yana igbochi mgbasa ozi n'ezighị ezi.
  3. Kwalite ọganihu Model anyị: Kwalite uru ihe omuma ihe n'efu nke Wikimedia ka ọtụtụ mmadụ wee nyere anyị aka ichebe ya. Anyị ga-eme nke a site n'ịkwalite ebumnobi dị mma maka amụma ịntanetị na-akwado ma na-echekwa ọnụ ọgụgụ dijitalụ dị ukwuu nke Wikimedia dabere na ya.

Chebe ndị anyị

Anyị ga-enwe nwusike nke atumatu na sistemu na-enye nchekwa ndị ọrụ afọ ofufo. Anyị ga-eme nke a site n'ịkwado ọchịchị onwe onye nke ngalaba otu anyị, ichekwa ikike mmadụ mgbe ọrụ anyị nọ n'ihe egwu, nakwa ịkwalite ntụkwasị obi na nchekwa na ọrụ Wikimedia.

Anyị na-eme atụmatụ ịga n'ihu n'ịkwalite nkwado anyị maka mmemme ịchị onwe nke ngalaba otu anyị nke na-ahụ maka omume ndị ọrụ, gbaa mbọ hụ na ọrụ Wikimedia na-akwado ụkpụrụ dị na Usoro Omume nke Universal Code of Conduct, ma na-arụ ọrụ dịka ụkpụrụ dabara na [[foundation:Policy:Human Rights Policy|Amụma ikike mmadụ] ] nke Wikimedia.

Ntụkwasị obi na Nchekwa

MMekọrịta anyị na ndị ngalaba dịgasị na otu a na-edu ọrụ anyị iganihu nke ọma bụ ihe anyị hụrụ kachasi ike Wikimedia Movement gbadoro ụkwụ na ịdị ike na ike nke igwe mmadụ, na-eme ka ọrụ ahụ gbasaa ọdịnaya na imelite ozi ngwa ngwa na n'ụzọ doro anya. Ọchịchị ndị mmadụ juru na Wikimedia bụkwa usoro dị mkpa maka ntụkwasị obi na nchekwa na ọrụ anyị, na-enye anyị ohere ịdị mma karịa usorogbadoro ụkwụ udi naanị ndị ọrụ ịdị na abụghị naanị idobe saịtị anyị n'ụzọ iwu kwadoro, kamakwa n'ichepụta na ịmanye n'ezie ụlọ ọrụ ọchịchị zuru ụwa ọnụ nke na-egosipụta ụkpụrụ nke ọrụ Wikimedia.

Anyị na-akwado ọchịchị onwe onye nke ngalaba dịgasị n'otu anyị site n'ịkwado kọmitii n'ụzọ dị ukwuu ma ọ bụ ọbụna mgbe niile gụnyere ndị ọrụ afọ ofufo. N'okwu a, anyị na-arụ aka na kọmitii ndị ahụ nke ndị ọrụ afọ ofufo mba ụwa anyị na-enyocha ọdịnaya ma na-edozi ihe ịma aka na omume ndị ọrụ na saịtị anyị. Ọrụ ha sitere na nyocha na idozi esemokwu ndị ọrụ na ịtụle ọrụ nchịkwa megide iwu ụwa anyị iji nye usoro mkpesa maka ndị ọrụ nọ n'okpuru ntaramahụhụ Foundation. Ha na-enyere aka iwebata ahụmịhe na echiche dị iche iche ma na-enyere ndị dị otú ahụ aka hụ na ọrụ dị mkpa na-egosipụta Njem mba ụwa anyị. N'agbanyeghị ntinye uchu n'orụ ha, ndị ọrụ afọ ofufo a na-enwekarị nsogbu oge na ihe ịma aka, gụnyere ihe ize ndụ onwe onye n'ọnọdụ ụfọdụ, ọkachasị mgbe ọrụ ha gụnyere ibelata iji usoro anyị eme ihe n'ụzọ na-ezighị ezi. Anyị nọ ebe a iji nyere ha aka.

Ihe omume gụnyere:

  • Na-akwado Kọmitii Nlebaanya Okwu, Ombuds Commission, ọtụtụ NDA-holding kọmitii mkpegharị ikpe, yana ndị Ndị Steward, yana Kọmitii ụkpụrụ omume Universal code of Conduct nke nọ ọdụ ọhụrụ site na iso ndị ọrụ na-akpakọrịta dị ka ọ dị mkpa, inye ọzụzụ ebe ọ dị mkpa, na akụkọ nhazi nke ahaziri mkpa nke otu onye;
  • Na-echebe ndị nchịkwa bụ ndị a na-achọsi ike site na ịgba akwụkwọ na-anụ ọkụ n'obi;
  • Inye akụrụngwa maka ndị na-ahụ maka ọdịnaya na mgbasa ụkwụ nye ndị na-ahụ maka saịtị iji nyere ha aka mee ka ha mara maka mgbanwe ọnọdụ mba ụwa nke ihe gbasara iwu.
  • Soro ndị ọrụ afọ ofufo na-arụkọ ọrụ iji melite ma wusie amụma ndị dị ugbu a metụtara iguzosi ike n'ezi ihe n'ọrụ ike.

ikike mmadụ

Njem Wikimedia na-adabere ma na-akwado ikike mmadụ aka. N'ụzọ bụ isi, ọrụ anyị na-eme ka onye ọ bụla nwee ike ịchọ, ịnata, na ịnye ozi dịka oke ikike mmadụ. Mana usoro nhazi, ikesa, na inye ihe ọmụma nwekwara ihe ọ pụtara maka ikike ndị gbadoro ụkwụ na nkwuwa okwu n'efu, nzuzo, na ịha nhatanha, n'etiti ndị ọzọ. Anyị ji ọrụ anyị kpọrọ ihe n'ịkwado gburugburu ebe nchekwa dị mma nke enwere ike ịkesa ma ọ bụ ịnata ọzi n'ụzọ kwesịrị ekwesị.

Ọ dị mkpa ịmara na Wikimedia Foundation anaghị ma agaghị eguzo naanị ya n'ọrụ a. Anyị na-adabere n'ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo anyị bụ ndị ike na-adịghị agwu inyocha saịtị anyị na-akwado maka ihe ndị na-emebi ikike nke ndị ọzọ, ma nke ahụ na-ewepụ ihe ndị na'enweghị isi banyere ụmụ mmadụ ma ọ bụ ọdịnaya nke ọnọdụ ikike nwebisiinka na-edochaghị anya. Anyị na-adabere n'ọtụtụ ndị mmekọ zuru ụwa ọnụ na-akwado ndị ọrụ afọ ofufo anyị n'oge ihe ize ndụ, ma na-enye ha enyemaka ngwaọrụ ma na-akwado maka ọdịmma ha ogologo oge. Anyị na-adabere n'ọtụtụ ndị omeiwu na ndị na-achịkwa na ndị ọzọ na-eme iwu ndị na-etinye aka n'ichebe ozi n'efu maka ọgbọ a na n'ọdịnihu.

Ihe omume gụnyere:

  • Imeziwanye nghọta nke ikike mmadụ n'ihe gbasara ọrụ Foundation na ọrụ Wikimedia iji bulie mmetụta anyị na ndị na-eme mkpebi , ndị ọrụ afọ ofufo, na ndị ọrụ dị ka ndị ozi dị mkpa maka ọrụ a nwere ike inwe.
  • Ikwado ikike nke Foundation iji kwadoo ma na-echebe ndị ọrụ afọ ofufo na-eche ihe iyi egwu nke ikike ruuru mmadụ n'ihe gbasara ntinye aka ha nyere na ọrụ.
  • Ịhazi usoro ịrụsi ọrụ ike nke ikike mmadụ ka ndị ọrụ na ndị ọrụ afọ ofufo wee nwee ihe ngwa na usoro ihe ọmụma dị mkpa iji chọpụta ihe ize ndụ ndị nwere ike ime nye ndị ọrụ afọ ofufo na n'oge ọrụ na ịchịkwa ọrụ Wikimedia.
  • N'ime nyocha nke mbụ nke onwe banyere mbọ Foundation na-agba iji chebe nnwere onwe ikwu okwu na nzuzo n'ihe gbasara ọrụ Wikimedia, dịka achọrọ dị ka onye otu Global Network Initiative.
  • Inyocha na inye nkwado nnwale nye teknụzụ na-eme ka ndị ọrụ afọ ofufo nwee ike itinye aka n'enweghị nsogbu na ọrụ Wikimedia, yana ikike ndị na-ọgụụ nwere ịnweta ọdịnaya Wikimedia niile n'enweghị nsogbu, dịka Wikimedia DNS.
  • Mgbasa ozi na nkwukọrịta na gburugburu ọrụ Foundation na-eme iji chebe ikike nke ndị na-ọgụụ na ndị na-enye aka na ọrụ Wikimedia nye ndị na-ege ntị (ihu ọha, Njem, ndị na-eme iwu) iji kwalite nghọta na ọmụma.

mkparị n'arịwanyelu =

Ebumnobi ọ bụla n'ime atụmatụ afọ nke afọ a bụ nke ọrụ ngwaahịa na teknụzụ na-akwadokwa.

OKR ndị dị n'okpuru na-akọwa ọrụ maka ebumnuche ịha nhatanha:

Chekwaba ọrụ anyị

Chebe iguzosi ike n'ezi ihe nke ọrụ anyị site n;ihe ndị na -agba mbọ igbochi inweta ihe ọmụma. Anyị ga-eme nke a site na mgbachite nke iwu na nnabata, yana ibuso mgbasa ozi n'ezighị ezi agha.

Nchekwa iwu na nnabata

N'afọ gara aga, ọtụtụ iwu ọhụrụ ma ọ bụ nke a tụrụ aro lekwasịrị anya na ndị isi nke nhiwe ịntanetị, Foundation etinyela ego n'ụzọ dị iche iche nke gụnyere: nkọwapụta na nyocha iwu, agụmakwụkwọ onye nchịkwa, nchekwa iwu, na nrubeisi ebe ime nke a kwekọrọ na ụkpụrụ ikike mmadụ. Na FY 24-25, anyị ga-agbadosike n'ime atụmatụ ndị a.

Iwu ndị na-anaghị akpọ udi ihe Wikimedia ihe nwere ike inwe mmetụta na-adịghị maka ọrụ anyị na ndị na-ewu ha - dị ka sesọship, njide nke ndị ndezi, ma ọ bụ ụgwọ nke nwere ike ịkpaghasị ọrụ Foundation - n'agbanyeghị ma mmetụta ọ bụ nke akpachara anya mee. Mgbe anyị na-eche iwu ndị nwere ike inwe ihe mmetụta na atụghị anya ya ndị a na-enweghị isi ihu, anyị na-arụ ọrụ iji kụziere ndị omeiwu na ndị na-achịkwa banyere mmerụ ahụ nwere ike ime. Mgbasa ozi na nkwukọrịta na-arụkwa ọrụ dị ka ụzọ dị mkpa iji mee ka a mara ma, n'ọnọdụ ụfọdụ, nweta nkwado ọha na eze maka ebumnuche anyị.

Mgbe iwu a atụrụ aro ya, anyị na-eme nnyocha zuru ezu iji ghọta ma ọ nwere ike itinye aka na ọrụ na/ma ọ bụ Founation, na-enyocha ya n'okpuru atumatu Applicable Law na Ikike Mmadụ. N'iji nyocha a, anyị na-ekpebi ma Foundation-n'ọnọdụ ụfọdụ, na-arụ ọrụ na obodo ndị na-enye onyinye-nwere ike ịchọrọ ịme ihe na nzaghachi nke iwu. achọrọ.

Ọganihu iwu nwere ike ime mgbe ụfọdụ na mberede n'afọ niile, yabụ ndepụta a enweghị ike ịba ụba. Anyị na-enye ihe atụ ole na ole ebe a banyere otu anyị si emeso ihe ịma aka a.

Ihe omume gụnyere:

  • Na-arụ ọrụ, na mmekorita ya na obodo Wikimedia, maka mmelite na mmezigharị nke Iwu Nzuzo anyị, nke a ga-emecha ma malite n'afọ mmefu ego 2025-26. Anyị ga-eme ka mkpebi anyị na-echebe data onye ọrụ na ọrụ ndị ahụ sie ike, ka anyị na-akwado Foundation na ndị mmepe obodo n'ịmepụta ngwaọrụ dị elu iji chebe ndị ọrụ na ihe ọmụma n'efu ha na-enye ma na-ekerịta site na mkparị na mmebi ihe.
  • Na-agbaso iwu ndị a na-etinye n'ọrụ dịka o kwesịrị. Ndị a bụ ihe atụ ole na ole dị mkpa nke ọrụ maka afọ mmefu ego na-esote:
    • Na-aga n'ihu na mmemme nnabata Digital Services Act (DSA), na nzaghachi nye iwu dị mkpa nke European Union na-emetụta ndị ọbịa n'ịntanetị. Karịsịa, afọ mmefu ego na-abịa, anyị ga-emeziwanye ma mezie mkpesa nghọta DSA anyị, ma mechaa nyocha mbụ anyị chọrọ.
    • Na-enyocha Iwu Nchekwa ịntanetị nke United Kingdom, na ịhazi ya maka mgbanwe ọ bụla na ọrụ Foundation nke anyị na-enyocha dị ka akọ. Iwu a bụ otu n'ime ọtụtụ ndị na-emetụta ọrụ ịntanetị nke ụmụaka karịsịa, anyị ga-eleba anya na Ntụle ihe ize ndụ ụmụaka iji duzie ọrụ n'ọdịnihu nke nwere ike ịbawanye nchekwa na ọrụ Wikimedia.
  • N'afọ mmefu ego a, anyị na-atụ anya mkpebi ikpe na Ụlọikpe Kasị Elu nke United States Netchoice v. Paxton, nke nwere ike ịgbanwe n'ụzọ dị ukwuu iwu iwu maka ịbubata ọdịnaya sitere na onye ọrụ ma nwee ike ịnye ihe ize ndụ ọ bụghị naanị na Foundation kamakwa onye ọ bụla bụ onye Wikipedia. Afọ mmefu ego na-abịa, anyị ga-arụ ọrụ iji chebe ọrụ ndị a ma ọ bụrụ na mpụtaara ya na-ebute ikpe ọhụrụ na-agbalị iwepụ ọdịnaya ma ọ bụ butere ndị ọrụ nsogbu. Anyị ga na-eleba anya na nhọrọ ndị omebe iwu nwere ike ịga n'ihu na-esochi ọchịchị na ọrụ nkwukọrịta ihu ọha nke nwere ike inye aka kwalite ozi anyị bụ isi.
  • Ime ka mmekọrịta anyị na ngalaba digasị na Wikimedia dị ike na mpaghara ụfọdụ iji kwado mgbanwe ndị dị mkpa. N'ógbè ndị nwere ike kachasị ịkpụzi ọrụ anyị, anyị na ndị ọrụ afọ ofufo ga-arụkọ ọrụ iji kwado mgbanwe iwu nke ga-echebe ọrụ anyị na ndị mmadụ site na ikpe ọjọọ site n'aka ndị mmadụ na ụlọ ọrụ na-achọ ịkwalite echiche ha ma ọ bụ akụkọ na-akwalite onwe ha.
  • Ịgbasawanye usoro ikpe anyị iji chebe ọrụ Wikimedia, ndị na-enye aka, na ihe nlereanya, n'ihi mgbanwe nke gburugburu ebe obibi. Anyị ga-achọ ma nyochaa ohere itinye akwụkwọ amicus briefs n'ụlọ ikpe gburugburu ụwa, ebe olu Foundation nwere ike inyere ụlọ ikpe mpaghara ma ọ bụ nke mba ụwa aka ịghọta mmetụta nke iwu ha na-akọwa na Wikipedia. Dịka ọmụmaatụ, anyị ga-achọ ikpe nnwale bara uru iji nyere aka mee ka ngalaba ọha na eze doo anya ma gbasaa ma nyere aka hụ na a ghọtara nkwutọ na ikike a ga-echefu n'ụzọ doro anya ka ndị ọrụ wee mara ụdị ọdịnaya dị mma iji nye aka na ọrụ ndị ahụ n'ebe dị iche iche gburugburu ụwa. Ebe enwere mmetụta zuru oke, anyị ga-atụle ohere nke Ntọala na-eweta usoro iwu iji kwado ọrụ a. N'ebe ndị dị mkpa, nkwukọrịta nwere ike inye aka mee ka ozi anyị dị mkpa gbasaa na ndị na-ege ntị na ndị na'ime iwu.

n'aluso mgbasa ozi n'ezighị ezi ọgụ

Foundation ga-anọgide na-arụsi ọrụ ike iji mee ka ikike ngalaba otu anyị nwee ịtụ anya, ịkwadebe, igbochi ma gbochie mwakpo ụgha.

A na-ewere ọrụ Wikimedia dị ka ebe a tụkwasịrị obi n'ụwa niile. Site na ntuliaka a na-ahụtụbeghị mbụ n'ụwa niile na 2024 na esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-arịwanye elu, eziokwu na-ese okwu karịa ka ọ dibu. E nwere ihe atụ nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na gọọmentị na-eme mgbalị iji mebie Wikipedia site na mkpọsa mgbasa ozi ụgha na mgbasa ozi ezighị ezi na ọha na eze. Ụdị ohere nke ọrụ ndị ahụ n'onwe ha na-eme ka anyị bụrụ ndị agha ozi, gụnyere ozi aghụghọ (ozi e kesara na ebumnuche nduhie).

Ịkwado ozi n'ezighị ezi nwere njikọ chiri anya na ọrụ buru ibu nke na-emegide ozi ezighi ezi na wiki (ozi na-ezighị ezi ma ọ bụghị nke iji duhie), akụkụ nke ọrụ ndị ọrụ afọ ofufo. Ịkwado ọrụ ndị ọrụ afọ ofufo n'imeziwanye iguzosi ike n'ezi ihe nke wikis na-aga n'ihu ịbụ ihe kachasị mkpa na 2024-2025.

Ihe omume gụnyere:

  • Mgbakwunye na nnyocha nke na-achọpụta ozi na-eduhie eduhie na wiki, na mmekorita ya na ndị ọrụ afọ ofufo na nkwado sitere na nnyocha na mmekorite.
  • Ime ka ngwá ọrụ ndị na-achịkwa ike ma gbasaa, tinyere iji mmụta igwe eme ihe n'ụzọ doro anya na nke a na-aza ajụjụ n'ọrụ nke ndị ọrụ afọ ofufo na-eme iji chọpụta ma dozie ozi nduhie.
  • Ikekọrịta ozi, usoro, na ihe ngwa n'etiti ndị ọrụ na ndị ọzọ na-achị onwe ha na ndị mmekọ na-arụ ọrụ iji gbochie ozi aghụghọ na ngalaba ha.
  • Imeziwanye nghọta ndị na-eme iwu banyere udi Wikimedia, na ụdị iwu na iwu ọha na eze nwere ike ichebe ma kwado ikike ndị ọrụ afọ ofufo iji lụso ozi nduhie ọgụ, na ikike ebe iwu nwere mmetụta dị ukwuu na ọrụ.
  • Ịmepụta otu ọrụ ọhụrụ maka ntuliaka nke afọ 2024, iji hazie ọrụ nke Foundation na-emegide ozi nduhie n'oge ọtụtụ ntuliaka zuru ụwa ọnụ na ịkwado ndị ọrụ afọ ofufo.
  • Ịkwalite mmekọrịta ya na ndị na-eme nchọpụta na mpụga na-amụ ihe ọmụma ozi nduhie n'ịntanetị sie ike, si otú a na-agwa ndị na-esochi ozi aghụghọ na wiki, na-emeziwanye ohere ịnweta ihe ndị na-enyocha eziokwu, na imeziwanye ohere maka nyocha mpụga banyere usoro ozi aghụnanya ka ha na-apụta na nhiwe ndị ọzọ.
  • Atụmatụ nkwukọrịta ọha na eze ga-enyere Foundation aka ịkọ akụkọ dị irè banyere ọrụ na-eme iji gbochie ihe na-ezighi ezi na ọrụ Wikimedia na ahịa ndị dị mkpa - India, EU na US - n'oge afọ ntuliaka a dị oke egwu.
  • Ime ka mmata na uru nke udi anyị pụrụ iche, nakwa otu o si enye ọgwụgwọ nye ihe na-ezighi ezi na ozi nduhie iji nyere aka bulie njikọ na ntụkwasị obi.

Kwalite ọganihu Udi anyị

Anyị ga-akwalite uru udi ihe omuma ihe n'efu Wikimedia ka ọtụtụ mmadụ wee nyere anyị aka ichebe ya.' Anyị ga-eme nke a site n'ịkwalite ịdị mma nke amụma ịntanetị na-akwado ma na-echebe ọnụ ọgụgụ dijitalụ buru ibu nke Wikimedia dabere na ya. .

Dị ka akụkụ nke ọrụ nkwado iwu na amụma, anyị na-anọchite anya ọdịmma nke ngalaba Wikimedia n'ihu ọha site n'ụdị mgbasa ozi dị iche iche na mmemme nzikọrịta ozi na isi mpaghara . Anyị ga-akụziri ndị na-eme iwu na ndị ọzọ na-emetụta ha (dịka mgbasa ozi, agụmakwụkwọ, na ndị otu obodo) gbasara ka ihe udi Wikimedia si arụ ọrụ, yana ka ọrụ ndị ahụ na-enye aka nye ọha. Anyị na-achọ ụzọ anyị ga-esi mee ka usoro iwu na usoro iwu nke njem a dịkwuo mma maka ntinye nchekwa na nsonye. Anyị ga-enye nkwado maka nlekwasịanya dị mma nke iwu ịntanetị nke na-akwado ihe ọmụma n'efu na ọnọdụ nke ọrụ anyị. Anyị ga-emye nkwado megide iwu, ụkpụrụ ma ọ bụ omume gọọmentị na-ebute iyi egwu ịntanetị nke ngalaba anyị dabeere. A na-ebute nkwado a ụzọ dabere na ohere Wikimedia nwere mmetụta yana mkpa okwu ahụ maka ndị mmadụ na ọrụ Wikimedia.

Mpụtaara gụnyere:

  • Anyị ga-eme ka mmekọrịta anyị na ndị mmekọ na ndị ọrụ afọ ofufo dịkwuo omimi ma gbasaa iji kụziere ndị na-eme iwu, gọọmentị, na ndị ọzọ nwere mmasị banyere udi ọrụ Wikimedia nke ọchịchị Otu. Nke a ga-enyere ndị ọrụ anyị si n'èzí aka ịghọta otú Foundation si akwado Njem a, na ụdị iwu na iwu ọha na eze nwere ike ichebe ma kwalite ikike ndị ọrụ afọ ofufo nwere ịkekọrịta ozi zuru oke.
  • Nkwado na nhazi maka ndị mmekọ na ndị ọrụ afọ ofufo na-akwado mgbanwe nwebisiinka ga-esikwu ike iji hụ na iwu na-echebe ma na-akwado iji ikikere n'efu na nke na-emeghe, nakwa na gọọmentị na-eme ka ọrụ na ọdịnaya dị n'efu.
  • Anyị achọpụtala ikpe nnwale nwere ike ịnwale maka ikpe ikpe mmetụta iji nyere aka mee ka ngalaba ọha na eze doo anya ma gbasaa ma nyere aka hụ na a ghọtara nkwutọ na ikike a ga-echefu n'ụzọ doro anya, ka ndị ọrụ wee mara ụdị ọdịnaya dị mma inye aka na ọrụ Wikimedia n'ebe dị iche iche gburugburu ụwa.
  • A na-agbasawanye mmekọrịta nke ndị na-eme nchọpụta maka nzube nke ịnakọta na ịgbasa nchọpụta ihe omimi, nyocha onwe onye nke mmetụta nke ọrụ Wikimedia. Nchọpụta a ga-abụ isi ihe na-enye ihe àmà doro anya na anyị nwere ike ịkpọ ndị na-eme iwu na mgbasa ozi nke otu Wikimedia na-esi eme ka ọha na eze nwee ọganihu. site n'itinye aka n'ọdịmma akụ na ụba na nke ọha mmadụ na obodo nakwa na mba.
  • Atụmatụ itinye aka nke UN anyị na-emepụta nghọta ka mma site n'aka ndị nwere mmasị n'ofe usoro UN banyere otu ọrụ Wikimedia si enye aka na Sustainable Development Goals.
  • Ndị na-eme iwu na nnukwu òtù mba ụwa na ndị otu gọọmentị na-ekweta na ọrụ Wikimedia bụ ihe dị mkpa nke akụrụngwa digitalụ ọha na eze nke a ga-akwado ma chebe.
  • Mmekọrịta ya na ikike ruuru mmadụ na òtù ọha na eze na-esikwu ike. N'ihi nghọta ka mma ha banyere usoro ọchịchị Wikimedia na inye aka ndị ngala otu anyị nyere maka ịha nhata ihe ọmụma, ndị ọzọ ga-enye nkwado maka ọnọdụ iwu nke na-echebe ọrụ Wikimedia dị ka ihe ọma ọha na eze.
  • Ndị na-eme iwu na ndị na-emetụta iwu (usoro mgbasa ozi, ọha na eze, wdg) na mba ndị iwu ha nwere mmetụta kpọmkwem na ọrụ ndị a na-akụziri banyere otu Otu Wikimedia si emepụta ma tinye ngwá ọrụ mmụta igwe nke na-akwado mbọ ndị ọrụ afọ ofufo iji melite ogo encyclopedic nke ọrụ ndị ahụ ma lụso ozi aghụghọ ọgụ.
  • Ndị na-eme iwu na ndị mmetụta iwu na-enweta nghọta ka mma banyere mmekọrịta na-apụta n'etiti ọrụ ihe ọmụma n'efu, tinyere ọrụ Wikimedia, na generative AI; na otu iwu na ụkpụrụ kwesịrị isi chebe mmepe teknụzụ mmadụ na udi ọchịchị ọdịnaya nke Wikimedia na-ejere ọha na eze ozi.