Ọdịiche nwoke na nwanyị

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Gender gap and the translation is 100% complete.
Gender Gap

Ebe maka akụrụngwa na ozi gbasara ọdịiche nwoke na nwaanyị Wikimedia.

Ụdị abụọ nke ọdịiche nwoke na nwanyị dị bụ nke na-emerụkwa, ụwa Wikimedia: (a) ọdịnaya ọdịiche nwoke na nwaanyị (nke pụtara na ọtụtụ ụmụ nwoke karịa ụmụ nwanyị ka akọwapụ́tara n'ime ihe ndi dị na wikis anyị), na (b) isonye ọdịiche nwoke na nwaanyị, nke pụtara na ọtụtụ ụmụ nwoke na-esonye na mpaghara mmepụta ọgbọ nke Wikimedia.

Ihe a na-achọ ime ebe a bụ idobe ebe nchekwa na ozi gbasara ọdịiche nwoke na nwaanyị Wikimedia, na ịkọwapụta nke ọma ọdịiche dị n'ihe gbasara nwoke na nwanyị, ọkachasị site n'igosi ihe ọmụmụ gbasara isiokwu a na site n'ịchịkọta ihe akaebe gbasara ihe kpatara ụmụ nwanyị, LGBT+ na ndị okike ndị ọzọ ọmụma ha dị ntakịrị na-ahapụ ma ọ bụ ghara ịbanye na Wikipedia.

ndepụta nzipu ozi ọdịiche nwoke na nwanyị bụ ebe anyị na ndị ọzọ nwere mmasị ma nwee ike inye aka ná kparịta maka nke a. Malitere na Jenụarị 31st, 2011, ọ nwere ngwakọta nke ndị Wikimedians ogologo oge na ndị sitere na mpaghara ndị ọzọ bịarutere site na mmasị ha nwere na isiokwu a, yabụ ọ na-enyere aka ikọwapụta onwe gị na ozi mbụ gị.

N'afọ 2020, e meghere Telegram channel iji kwado mkparịta ụka. Ị nwere ike sonyere ya.

Ngagharị portal a

Chee echiche banyere oghere ahụ
Chee echiche banyere oghere ahụ
  • ihe ọmụma - Lelee, gee ntị ma gụọ maka ọdịiche nwoke na nwanyị.
  • Nchọpụta - mbipụta
  • Akụrụngwa - Ngwa, akwụkwọ na nkwado ego
  • otu - otu, nke iwu ma ọ bụ nke nkịti, na-etinye aka na mkpochapụ nke ọdịiche nwoke na nwanyị.
  • Mmalite – Mmalite ndị otu dị iche iche na-eduzi (nke otu ma ọ bụ na mmekorita)
  • Akụkọ na mmemme - Nke kachasị ọhụrụ sitere na ọdịiche nwoke na nwanyị