Wikimedia Foundation Bọọdụ nke Trustees/Kpọọ maka nzaghachi: Ntuli aka Bọọdụ nke Trustees

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
Outdated translations are marked like this.

Nsogbu a ga edozi

Wikimedia Foundation na mmegharị etoola n'ime afọ iri gara aga, na Board abụrụla otu na nhazi ma usoro N'ihe nlebanya ọchịchị nke afọ 2019, ikike, ịrụ ọrụ na enweghị nnochite anya ihe dị iche iche nke mmegharị ahụ ka ekwuru dị ka nchegbu.

N'afọ 2021, a tụlere ụfọdụ n'ime nchegbu ndị a n'oge Oku maka nzaghachi: oche bọọdụ obodo. 2021 Bọọdụ nke Trustees nhọpụta gụnyere omume emelitere ka ịmalite ilebara nchegbu ndị edepụtara n'elu. agbakwunyere oche abụọ ọzọ iji gboo mkpa ikike Bọọdụ. A na-eji ịtụ vootu nwere ike ịfefe otu iji kwalite ohere maka nnọchite anya iche iche nke mmegharị. Ndị nlekọta kesara nkà ha ma gwa ndị na-aga ime ka ha kesaa nke ha iji gwa ndị ntuli aka.Mgbasa ozi sara mbara na ọtụtụ asụsụ na-achọ ndị na-eme ntuli aka na ndị ntuli aka n'ọtụtụ obodo n'ụzọ nzikọrịta ozi.

N'ime oku nke 2022 maka nzaghachi a, anyị nwere olile anya ịchọpụta azịza ndị ọzọ iji gosipụta ụdị mmegharị na bọọdụ. N'ịgbakwụnye, anyị chọrọ iji ohere a mụta n'aka ndị obodo gbasara ịmekọrịta ndị na-eme ntuli aka n'oge usoro ntuli aka.

Kpọọ maka Imepụta Nzaghachi

Site na oku maka nzaghachi a, anyị na-ewere ụzọ dị iche nke gụnyere nzaghachi obodo site na usoro 2021. Kama iji atụmatụ na-edu, a na-ahazi Oku ahụ ka ọ ga gburugburu n'ajụjụ ndị bụ isi. Ebumnobi a bụ ịkpali mkparịta ụka mkpokọta yana mmepe atụmatụ imekọ ihe ọnụ.

Daalụ maka iwepụta oge iji sonye na oku a maka nzaghachi yana inye aka wulite kọmitii ntụkwasị obi dị iche iche na nke na-arụ ọrụ nke ọma.Daalụ maka iwepụta oge iji sonye na oku a maka nzaghachi yana inye aka wulite kọmitii ntụkwasị obi dị iche iche na bọọdụ nke na-arụ ọrụ nke ọma.

Ajụjụ ndị bụ isi

  1. Kedu ụzọ kacha mma iji hụ na ndị nnọchite anya dị iche iche n'etiti ndị a họpụtara ahọpụta?
  1. Kedu ihe a na-atụ anya maka ndị a ga atụnyere aka n'oge ntuli aka?
  1. Kedu ka ndị mmekọ kwesịrị isi sonye na ntuli aka?

Kwurịtara ajụjụ ndị bụ isi

Otu esi eso

Ndị ọrụ Ntughari Strategị na Gọọmentị nwere ike ịkwado mkparịta ụka n'ọtụtụ asụsụ. A na-anabata mkparịta ụka n'asụsụ ọ bụla, n'agbanyeghị na anyị nwere ike ịdabere na ndị nsụgharị afọ ofufo iji nyere aka chịkọta asụsụ anyị na-enweghị na ndị ọrụ. Ị nwere ike ịhụ njikọ mkparịta ụka n'ọtụtụ asụsụ na tebụl dị na Kụkọrịta ibe ajụjụ ndị bụ isi. Ị nwere ike ịchọta mkparịta ụka na Telegram Board selection chat|nkata nhọrọ bọọdụ telegram. Kpọtụrụ onye nhazi na mpaghara gị iji hazie mkparịta ụka obodo ma ọ bụ nye nzaghachi.

Usoro iheomume

  • Disemba 23: Nkwupụta nke oku maka nzaghachi
  • 10 Jenụwarị: Kpọọ maka nzaghachi mepere emepe
  • 16 Febrụwarị: Kpọọ maka mnmechi nzaghachi
  • 26 Febrụwarị: Bipụta akụkọ ikpeazụ nke oku maka nzaghachi

N'izu ọ bụla, otu Mmegharị Strategị na Gọọmentị ga-ebipụta akuko izu ụka iji weghara nzaghachi na mkparịta ụka na-eme n'ime izu gara aga.

Ozi ndabere bara uru

Bọọdụ nke Trustees bụ otu na-achị maka Wikimedia Foundation otu ndị ọrụ +450 na-akwado mmegharị mba ụwa nke ọtụtụ narị ọrụ, obodo, na ndị mmekọ hibere. Naanị ọrụ Board bụ ilekọta njikwa nke Wikimedia Foundation. Orụ Bọọdụ bụ ilekọta njikwa nke Wikimedia Foundation. Nke a gụnyere:

  • Isonye na ịtọ atụmatụ ogologo oge Wikimedia Foundation.
  • Nleba anya n'ihe omume na ego iji hụ na ego na-adị mma, kwekọọ n'ozi yana kwekọrọ n'ọrụ iwu.
  • Ịnweta, ijikwa, inye ndụmọdụ, na ịtọkwa ụgwọ ọrụ maka onye isi oche Wikimedia Foundation.

Ozi ndị ọzọ dị na Akwụkwọ Bọọdụ.

Hukwa