Universal Code of Conduct/Enforcement guidelines/UCoC Phase 2 Ratification Results Announcement/ig

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki

Nsonaazụ sitere na ụkpụrụ omume zuru ụwa ọnụ nke mmebe iwu ntuli aka

Ị nwere ike ịchọta ozi a ka a tụgharịrị n'asụsụ ndị ọzọ na Meta-wiki.

Ndewo nụ,

Anyị na-ekele ndị Wikimedians karịrị 2,300 bụ ndị sonyere na ntuli aka obodo mechiri nso nso a na Enforcement Guidelines for the Universal Code of Conduct (UCoC). N'oge a, ndị òtù ọrụ nyocha afọ ofufo emechaala nyocha izi ezi nke ntụli aka na nsonaazụ ikpeazụ dị na Meta-wiki. Enwere ike ịchọta nchịkọta ngwa ngwa n'okpuru:

  • 58.6% Ee, 41.4% Mba
  • Ndị nyere aka sitere na wiki 128 sonyere na ntuli aka ahụ
  • A kwadoro ihe karịrị asụsụ iri atọ na ntuli aka ahụ

Ihe nsonaazụ a pụtara bụ na enwere nkwado zuru oke maka Bọọdụ iji nyochaa akwụkwọ ahụ. Ọ pụtaghị na ntuziaka mmebe iwu na-emecha ozugbo.

Site na ebe a, ndị otu ọrụ ga-achịkọta ma gbakota okwu ndị enyere na usoro ịtụ vootu, wee bipụta ha na Meta-wiki. A ga-nyefe ndị Bọọdụ of Trustees Ntuziaka mmebe iwu maka ntụle ha. Ndị bọọdụ ahụ ga-enyocha ntinye enyere n'oge ntuli aka ahụ, wee nyochaa ma enwere akụkụ nke Ntuziaka ndị chọrọ mmezi ọzọ. Ọ bụrụ otu a, nkọwa ndị a, na ntinye enyere site na Meta-wiki na mkparịta ụka obodo ndị ọzọ, ga-eweta ezigbo mmalite maka imegharị ntuziaka iji gboo mkpa ndị obodo kwupụtara na nzaghachi ndị ntuli aka.

Ọ bụrụ na bọọdụ ahụ na-aga n'ihu na nkwado, ndị otu ọrụ UCoC ga-amalite ịkwado atụmatụ akọwapụtara na ntuziaka. Ụfọdụ n'ime atụmatụ ndị a gụnyere iso ndị otu obodo na-arụkọ ọrụ iji guzobe Kọmitii Ụlọ U4C, ịmalite ndụmọdụ gbasara ọzụzụ, na ịkwado mkparịta ụka maka ịkwalite usoro mkpesa anyị. A ka nwere ọtụtụ ihe thea ga-eme, mana anyị ga-enwe ike ịbanye n'akụkụ ọzọ nke ọrụ a.

Ọtụtụ ndị mmadụ sonyere n'ịhụ na amụma na ụkpụrụ mmebe iwu na-arụ ọrụ maka obodo anyị. Anyị ga-aga n'ihu na-arụkọ ọrụ ọnụ na nkọwapụta nke atụmatụ siri ike e depụtara na ntuziaka dị ka ndị Wikimedians gosipụtara na-arụ ọrụ ahụ n'ụzọ dị iche iche n'ime afọ gara aga.

Once again, we thank everyone who participated in the ratification of the Enforcement Guidelines.

Maka ozi ndị ọzọ gbasara nsonaazụ ya, biko hụkwa ibe Nsonaazụ.

Daalụ,

User:SNg (WMF)

Stella Ng n'aha UCoC Project Team

Onye isi Njikwa, Trust and Safety Policy