Atụmatụ kwa afọ nke Wikimedia Foundation/2024-2025

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation Annual Plan/2024-2025 and the translation is 99% complete.
Outdated translations are marked like this.

Atụmatụ Kwa Afọ nke afọ a na-abịa n'oge n'ejighị n'aka, oge mgbanwe na oge mgbagwoju anya maka ụwa na maka njem Wikimedia. gburugburu ụwa,ọrụ nke ozi atụkwasara obi na intanentị dị mbawanye dị mkpa ma nwee ihe ịma aka n'ihu karịa ka ọ dị na mbụ. Ụlọ ọrụ na nhiwe ịntanetị ga-enwerịrị mmegharị nke ọrụ ịntanetị nke ga-enye ohere nnabata nkesa na mpa na mpa . Ụzọ ọhụrụ nke iji chọta ozi, nke gụnyere ọchụchọ dabeere na nkata, na-enweta nkwado. Ịdị mfe nke ịmepụta ọdịnaya sitere na igwe AI na-enye oghere ọrụ nakwazị n'enwe ịma aka n'ihu nye ọrụ Wikimedia dị ka usoro ihe ọmụma teknụzụ mmadụ na eme, yana maka ọnọdụ nnweta ego Wikimedia.

Ka anyị na-eche ihu n'oké ifufe ndị a, atụmatụ 2030 Strategic Direction nke Njem a na-eduzi atụmatụ kwa afọ na

nke ọtụtụ afọ nke Foundation. Mgbanwe ndị dị n'ụwa gbara anyị gburugburu na-eme ka ntụziaka a dịkwuo mkpa karịa ka ọ dị bu. Oku a na-akpọ iji ghọọ akụrụngwa dị mkpa nke gburugburu ebe obibi nke ihe ọmụma efu abụghị naanị nkwupụta mkpali - ọ bụ iwu ịgbalịsike na-enyocha ndigidesike nke ọrụ anyị na otu anyị na nzaghachi nye mgbanwe ọdịdị gburugburu anyị.

Ebumnuche nke Njem Wikimedia gara n'ihu na-adabere na isi ndabe abụọ nke usoro ntụzịaka atụmatụ anyị:

  1. Ịha nhatanha n'ihe ọmụma: mebaa ụwa anyị site n'ịchịkọta ihe ọmụma nke na-egosipụta n'ụzọ zuru ezu ụdị mmadụ dị iche iche.
  2. nyefe ihe Ọmụma dị ka Ọrụ: "wulite ọrụ na arụmarụ na-enyere ndị ọzọ aka ime otu ihe ahụ."

Dịka Njem, anyị ga-aga n'ihu na-enye ụwa ozi nwere ntụkwasị obi, ma na-azụlite ndị ọrụ afọ ofufo na-akwalite imepụta ọdịnaya na nhazi n'ofe karịrị asụsụ Narị atọ na iri abụọ.

N'ime atụmatụ kwa afọ nke a, anyị na-eme ememe ọganiihu nke ọtụtụ otu na ndị mmadụ n'otu n'otu na-arụ ọrụ iji kwalite Aro Atụmatụ Mgbanwe dị iche iche tinyere isi ọrụ Foundation a. N'ime afọ ndị na-abịa, Foundation ga-amalitekwa ịkọwapụta nke ọma ebe ụfọdụ ntuziaka na-enye ihe ọmụma karịa ndị ọzọ na nchụso anyị na atụmatụ ntuziaka 2030.

Nakwazi anyị ga na-emebe atụmatụ n'aganihu . Ile anya gafee 2030 dị mkpa maka ebumnuche anyị, nke chọrọ ka anyị "mepụta ma debe ozi bara uru… ka ọ dị na ịntanetị n'efu, na ebighi ebi ." Ruo ọtụtụ iri afọ, ọdịnaya Wikipedia na- apụta na ibe mbụ nke pacenti iri itoolu na itoolu nke ọchụchọ Google. A kọwawo ya dị ka "njịkọ apụrụ ịdabere na-ejikọta dijitalụ ụwa niile ọnụ".

Ma n'agbanyeghị nke ahụ, mgbanwe site ndabere na njikọna nhazi nchọta ihe - nke rụworo anyị ọrụ na ụdị ego anyị ruo n'oge a - ruo dị ka nke ebe nkata nhazi nchọta ihe nọ n'oge mbụ ya, mana ọ dị ka ọ bịara ọnụnọ. Anyị kwenyere na nke a bụ akụkụ nke mgbanwe ọgbọ otu ndị mmadụ si emepụta na otu ha si eji ozi ịntanetị eme ihe. Mgbanwe ndị a na-aga n'ihu ka ịntanetị na-adịwanye iche ma bụrụ nke zuru ụwa ọnụ, yana na-ebeleta ịkachasị na Bekee.

Ihe na-apụta bụ atụmatụ mgbagwoju anya:' Ọrụ Wikimedia na-aghọ ihe dị mkpa karịa nye akụrụngwa ihe ọmụma nke ịntanetị, n'otu oge ahụọ na-aghọ ihe adịchaghị mkpa nye ndị ji intanenti eme ihe. Ha dị mkpa karịa n'ihi na Wikipedia natara ụdị asụsụ buru ibu na-akpụzi ọdịnihu nke iweghachite ozi, nke gụnyere ebe ọchụchọ mana gafee ya. Site n'ọtụtụ atụmatụ, Wikipedia Bekee kachasị ịbụ isi iyi nke data ọzụzụ nke ChatGPT na-etinye - ma ọtụ n'ime ndị aghọtara kachasị ịdị mma. ịchịkọta N'ozuzu, nke a bụ ihe dị mma. AI nwere ntụkwasị obi kwesiri inwe ebe nwere ntụkwasị obi onwere ikeidabere naya.

N'otu oge ahụ, ọdịnaya Wikimedia na-aghọ 'ihe na-adịchaghị ahụta dị ka akụkụ nke akụrụngwa ịntanetị dị mkpa n'ihi na ịntanetị AI wepụtara anaghị ekwupụta isi iyi ebemsidee nke ndabere eziokwu, ma ọ bụ mee ntụaka ebeosidee na Wikipedia. nkwekọrịta mmekọrịta ọha na eze na-akwado iji ọdịnaya nke ndị ọzọ eme ihe nọ na nrugide. Ọ bụ ezie na a ka ga-ahụ mmetụta AI kachasị elu, anyị ahụwo mmetụta nke nrụgide a ka oge na-aga na ụfọdụ ọdịda metrik dị ka traffik mpaghara na [$ 3 ndị ntinye aka ọhụrụ].

Atụmatụ afọ ọ bụla ga-abụrịrị nke ọtụtụ afọ na usoro ọtụtụ ọgbọ na-aga na-aga n'ihu ikwado ebumnuche anyị na ebighi ebi. Nke achịkọtara na usoro ntuziaka atụmatụ Wikimedia, Foundation na-aga n'ihu na-etinye aka na mpaghara atọ iji gwa anyị gbasara atụmatụ ọtụtụ afọ na amụma anyị:

  1. Ụdị metụtara Ego: Udi ego nke Wikimedia na amụma aga-eme n'ọdịnihu maka ego ha ga-enweta na arịrịo nkwado ego n'ịntanetị (nke anyị tụrụ anya na ọ gaghị aga n'ihu na-eto eto otu ogo dịka ọ dị na mbụ), ogo ọzọ na-esote Wikimedia Endowment , na mmụta ndị anyị mụtaarala na Wikimedia Enterprise.
  2. NGWAAHIA na NKA NA ỤZỤ : Ịgbaso ọrụ Foundation n'ịkwado mkpa teknụzụ nke otu Wikimedia, ịghọta mkpa nke ndị ngalaba otu anyị dị iche iche, na-ebute owuwo ihe ọhụrụ nye ndị na-ege ntị n'ọdịnihu, yana ịkwalite akụrụngwa anyị maka mgbanwe ọdịdị mpụga.
  3. ỌRỤ & ORU DỊỊRỊ ONYE: inwe Mkparịta ụka etinyere uche na ya karịa iji guzobe ụkpụrụ nhazị ọrụ na ụkpụrụ iji ghọta isi ọrụ na ọrụ dịịrị onye na Foundation. Ezubere nke a iji nyere aka n'iweta ntinye aka na nleba anya n'akwụkwọ ikike Njem a na mkparịta ụka usoro atụmatụ ntuziaka nke njem a buru ibu.

N'otu aka ahụ n'afọ gara aga, atụmatụ nke afọ a na-anọgide na-elekwasị anya na isi mkpa nkà na ụzụ, na nhụta Foundation dị ka ụlọ ọrụ na-eweta ohere nye ndị na-ahazi usoro mmepụta ihe ọmụma nke ọgbọ na ndị ọgbọ gburugburu ụwa. Ebumnuche anọ dị oke mkpa nke atụmatụ nke afọ a na-anọgidesikwa ike bụ (Ihe akụrụngwa, nha nhata, nchekwa & iguzosi ike n'ezi ihe, na ịdị irè), ebe ọrụ na ihe ndị a na-enweta n'ime ihe nlekwasi anya ọ bụla na-egosi ọganihu e nwetara n'afọ dị ugbu a.

N'ọkwa dị elu, ọrụ anyị maka afọ na-abịanụ na-elekwasị anya n'ịkwalite mmụta onye ọrụ na ọrụ Wikimedia, na-enye ezi ndozi na-aga n'ihu dị mkpa iji kwado ebe nrụọrụ weebụ iri zuru ụwa ọnụ ma na-etinye ego na-elekwasị anya n'ọdịnihu iji sonye na mgbanwe a na-enwe na ịntanetị. Anyị ga-akwalite ụzọ ziri ezi maka ihe ọmụma n'efu site n'ịnọchị oghere ihe ọmụma na ịgbasa nsonye na Njem a, ichekwa ndị mmadụ na ọrụ anyị site na ihe ịma aka mpụga ndị ọzọ na-eche ha ihu, ma nyere aka hụ na nkwado ego na ịdị irè nke Wikimedia na-adịte aka iji kwado Njem a n'ọdịnihu.

Atụmatụ mmefu ego nke Foundation na-egosipụta mgbanwe azụmaahịa na-aga n'ihu, dị ka anyị na-ahụ ogo mbelata nnweta ego ọhụrụ. Iji zute eziokwu ọhụrụ a, Foundation ebelatala uto ya nke ukwuu n'ime afọ abụọ gara aga wee mee mbelata ndị ọrụ na mmefu n'afọ gara aga. Kemgbe 2022, ego maka ngalaba dị gasị agafeela ogo uto nye Foundation, nke ka bụ ikpe maka atụmatụ afọ a.

N'ime ijekọ ozi a ọnụ

Ebumnuche anyị zuru ọnụ bụ inyere ngalaba otu anyị zuru ụwa ọnụ iso anyị rụkọọ ọrụ ọnụ nke ọma ka anyị niile wee bụrụ n'ezie akụrụngwa dị mkpa nke gburugburu ihe ọmụma n'efu. Na ngalaba na-esote, ị ga-ahụ nkọwa ndị ọzọ akọwapụtara gbasara ọrụ nke otu dị iche iche na Foundation na-akwado ihe nlekwasi anya anọ a. Ọ dịghị nke ọ bụla n'ime ihe ndị a bụ ọrụ nke naanị anyị nwere ike ịrụ; ọ ga-ewe anyị niile ịmepụta ụwa nke mmadụ niile nwere ike ịkekọrịta na nchikota nke ihe ọmụma niile. Ya mere otu n'ime ụkpụrụ anyị bụ isi bụ na anyị niile nọ na ijeko ozi a ọnụ.

A na-anabata nkwado gị na wiki ebe a na Meta, na na ebe nzukọngalaba otu ma ọ bụ na Village pọmpụ ngalaba otu gi (ma ọ bụ nke dị ka ya).

Gịnị ka ụwa chọrọ n'aka anyị ugbu a?

N'afọ a, Foundation lekwasịrị anya na isi ihe anọ external trends na-emetụta ọrụ anyị:

  • Ndị ojiji ihe eme ihe nwere njuputa nke ozi, chọrọ ka ndị atụkwasịrị obi chịkọba ya
  • Ndị ntinye aka nwere ọtụtụ ụzọ bara uru, di ike ikesa ihe ọmụma n'ịntanetị
  • Ọdịnaya nkwenye n'eziokwu dị karịa ka ọ dị na mbụ, ma ọdịnaya ga-abụ nnukwu ngwa
  • Iwu na-ebute ihe ịma aka, iyi egwu na ohere dị iche iche site na ikike

Dị ka anyị mere n'afọ gara aga, Foundation malitere ime atụmatụ site n'ịjụ ajụjụ a, "Gịnị ka ụwa chọrọ n'aka anyị na ọrụ Wikimedia ugbu a?" Anyị mere nyocha n'ime usoro n'ewu ewu ndị dị na mpụga nke na-emetụta ọrụ anyị, nke gụnyere itinyekwu uche na obere ozi , nke ana eme ozugbo; na-abawanye ọnụnọ nke mkpali, ego na ihe ndị ọzọ, iji dọta ndị na-enye aka na ụfọdụ nhiwe; iyi egwu iwu na usoro iwu, gụnyere ụkpụrụ ikpo okwu nwere ike ịbụ ngwa megide anyị na ndị ntinye aka anyị, yana ohere iji kwalite ọdịmma ọha na eze nke ọma; na okwu nke nkwenye n'eziokwu ọdịnaya na mmetụta adịghị mma AI na gburugburu ebe izi ozi.

N'afọ gara aga, anyị mere ọtụtụ nzọụkwụ na nzaghachi maka usoro ndị a n'ewu ewu dị na mpụga, gụnyere ntunye ọhụrụ na ọrụ nke otu ndị na-ege ntị n'ọdịnihu, dị ka mmepe nke ngwa mgbakwunye ChatGPT , iji nwalee na ikpo okwu ọhụrụ na ịkwalite mmụta gbasara otu ndị mmadụ nwere ike isi chọọ iji generative AI na-emekọrịta ihe ọmụma na ọrụ Wikimedia. Anyị mepụtakwara otu ọhụrụ na-arụ ọrụ ma kwalite ngwa ọrụ maka nlekọta dị mma na nke kachasị mma maka ndị ndezi nwere ikike agbatịkwuru iji nyere ndị na-enye aka jikwaa mgbasa ozi ọjọọ na mgbasa ozi ọma na ọrụ Wikimedia. Anyị legharịrị wee mụta site na usoro ndị a n'ime afọ; dịka ọmụmaatụ, n'agbanyeghị na ChatGPT bụ otu n'ime usoro ịntanetị na-eto ngwa ngwa na akụkọ ntolite, Wikipedia ahụghị mgbanwe dị ukwuu na ebe o metụtara ndị na-agụ akwụkwọ n'otu oge ahụ. Ndị mmadụ ka dabeere na Wikipedia na ọrụ Wikimedia dị ka isi iyi nke ozi a pụrụ ịtụkwasị obi na ezi ozi gburugburu ụwa.

Talking:2024

Iji mee ka atụmatụ kwa afọ nke afọ a malite, anyị ji Talking: 2024malite, mkparịtaụka iji kesaa, gee, ma mụta n'ebumnobi. Dị ka akụkụ nke atụmatụ a,Ndị Trustee, Ndị Ezekutiv, na ndị Orụ Wikimedia Foundation kwadoro mkparịtaụka otu Narịna iri atọ na otu na wiki, ya na ndị mmadụ n'otu n'otu, na n'ime obere otu - ma mkparịtaụka na-aga n'ihu. Mkparịtaụka ndị a na-agbasa na mpaghara ụwa niile. Anyị na-aga n'ihu na-enwe mmụta site n'aka ndị ngalaba otu ama ama ruo na nke ndị bịara ọhụrụ na nso nso a, site na ndị ọrụ afọ ofufo ruo na ndị nlekọta, ndị na-ahazi mmemme, na ndị isi mmekọ.

ihe amụtara site na mkparịtaụka ndị a nyekwara aka ntinye na atụmatụ anyị maka afọ a, ruo 2030 ma gafee - tinyere iche echiche maka ihe ọ ga-ewe iji wuo ọrụ anyị n'ofe ọgbọ:

  • Anyị na-anụ mgbe niile na ọ dị mkpa ka Foundation nọgide na-elekwasị anya na ịkwalite akụrụngwa teknụzụ iji kwado mkpa ndị ọrụ afọ ofufo maka mmezi ngwá ọrụ na metrik.[njikọ nke ngalaba akụrụngwa] Ọ bụ isiokwu kachasị mkpa maka mbọ atụmatụ anyị ka anyị na-eme ntinye n'ọrụ ebumnuche bara uru nke na-akpọ ka ọrụ anyị gaa n'ihu ruo mgbe ebighị ebi. Mkparịtaụka ndị a nyere aka gosi na anyị na-aga n'ihu na-aga n'ụzọ ziri ezi.
  • N'agbanyeghị na teknụzụ pụtara ìhè n'ọtụtụ mkparịtaụka ndị a, enweghị mgbagha dị ya na Wikimedia bụ Njem mmadụ na-edu. Anyị nụrụ ka "Ọ bụ maka ndị mmadụ" wee nyochaa ọbụna ihe ngwọta ndị ọzọ nwere ike dozie nsogbu a maara nke ọma banyere otu esi edozi mkpa ndị ndezi dị ugbu a na atụmatụ ịnabata ndị bịara ọhụrụ. Ụkpụrụ ndị mmadụ na-edu pụtara n'ọtụtụ mkparịtaụka gbasara ọrụ Wikimedia na-arụ n'ịkpụzi ọgbọ na-esote ọgụgụ isi n'abụghị nke mmadụ.
  • Mkparịtaụka Talking: 2024 nyekwara ohere maka ụlọ ọrụ ngagharị ịkekọrịta mkpa maka njide n'aka ego ọtụtụ afọ na nkwado ha sitere na Foundation, nke anyị ga-etinye na atụmatụ afọ a. Mkparịtaụka ndị ọzọ gosipụtara mkpa ọ dị ịga n'ihu na-ebute ụzọ ihe ndị dị oke mkpa na ịkọwapụta ihe gbasara azụmazụ.
  • N'ikpeazụ, ọrụ nke ịkọwapụta Akwụkwọ ikike njem a pụtara n'ọtụtụ mkparịtaụka. Ndị a sitere na ntụgharị uche banyere ntuziaka atụmatụ na ụkpụrụ ("Ọ ga-abụ nke buru ụzọ bịa, bụ nke a ga aza mgbe niile na Njem a?") maka ajụjụ gbasara ebumnuche nke usoro dị iche iche ("Olee mkpebi anyị chọrọ kansụl zuru ụwa ọnụ ime? Gịnị kpatara ya? Mkpebi na-esi n'otu ebe gaa na nke ọzọ?" "Anyị na-eji aka ike dozie okwu a mgbe ha bụ ihe enwere ike iji ihe aka nro soo."). Na-atụghị anya ya, e nwere echiche dịgasị iche iche ("Ogbe ndị na-edezi n'ọtụtụ mpaghara anaghị ahụ uru na ndị mmekọ, Họb , ma ọ bụ usoro ọchịchị ndị ọzọ." "Ndị ngalaba otu a ka na ahụta na Foundation anụbeghị olu ha ." ma mpaghara ụfọdụ bụ ihe kwesịrị ịja mma, ọkachasị ebe ndị mmekọ na-akpakọrịta na ngalaba otu."). Na nkwanye ùgwù miri emi nke ọrụ dị mgbagwoju anya eji n'aka ("ngalaba otu buru ibu ọ na-esi ike ijikọta onye ọ bụla.")

Ebumnuche 2024-2025 Foundation

Ụzọ anyị si eme atụmatụ kwa afọ

N'ọnọdụ a, ụzọ anyị si eme atụmatụ kwa afọ nke afọ a ka bụ nke ụkpụrụ nhazi ndị a n'edu:

  • lekwasị anya na usoro ntuziaka atụmatụ na nchịkọba gị jịkọọ nha nhata ihe ọmụma na inye ihe ọmụma dị ka ọrụ dị ka akụkụ nke usoro ntuziaka atụmatụ Njem.
  • mee nsonye echiche mpụga. Malite site na: ihe na-eme n'ụwa gbara anyị gburugburu. Lepu anya n'èzí. Chọpụta isi ihe ndị Mpụga n'ewu ewu na-emetụta ọrụ anyị.
  • Lekwasị anya na ngwaahịa + Teknụzụ. Na-elekwasị anya na ọrụ Foundation dị ka ụlọ ọrụ na-enye ohere na-eme ka ngwaahịa na teknụzụ na-arịwanye n'ogo.
  • sonye na ebe nlekwasị anya anọ n'afọ n'afọ. Ihe nlekwasị nya anọ nke atụmatụ kwa afọ na-anọgide na-adabere site n'afọ gara aga, na ọrụ na-ewulitere site ọganihu gara aga.
  • Mee nlele ọtụtụ afọ. Mepụta atụmatụ afọ anyị na nhazi ọtụtụ afọ. Tụlee usoro n'ewu ewu maka ụdị ego nnweta ego anyị, atụmatụ teknụzụ, yana ọrụ Njem na ibu ọrụ dịịrị onye.
  • kwalite inye ego nye otu ndị nọ na Njem a Inye ego nye ngalaba ndị nọ na otu a agafeela ogo uto foundation na-aga n'ihu.

Wikimedia Foundation nwere ebumnuche anọ bụ isi maka 2024-2025 Nnukwu ebumnuche nhazi ndị a agbanwebeghị site na atụmatụ afọ gara aga, n'agbanyeghị ọrụ na ebumnuche akọwapụtara n'okpuru ebumnuche ọ bụla na-aga n'ihu. (Nchịkọta ebumnuche 2024-25 Foundation dịkwa n'ụdị slide.) Ezubere ebumnuche ndị iji nwee nkwekọ Strategic Direction nke njem Wikimedia na Movement Strategy Recommendation, na ịzaghachi isi ihe n'ewu ewu na mpụga na-achịkọba ọrụ anyị.

Ebumnuche 2024-25 Wikimedia Foundation bụ:

  1. AKỤRỤNGWA: kwalite ọganihu ihe Ọmụma dị ka Ọrụ.Melite mmụta Onye Ọrụ na wiki, ọkachasị maka ndị ndezi ama ama. kwalite metrik na nkọwa mmepụtaara.
  2. ỊHA NHATA:kwadoo ịha nhata ihe ọmụma. site na ọchịchị njem a, nhata nha na nkesa ngwa ọrụ,igbochi oghere ihe ọmụma, na ijikọta njem a.
  3. NCHEKWA NA NGUZOSIKE N'EZI IHE: chekwa ndị otu anyị na ọrụ anyị. Kwado usoro ndị na-enye nchekwa nke ndị ọrụ afọ ofufo. Chebe iguzosi ike n'ezi ihe nke ọrụ anyị. kwalite ọganihu nke gburugburu ihe ọmụma n'efu.
  4. Ịdị ire: Kwalite arụmọrụ na ịdị irè nke Foundation n'ozuzu ya. Tulee, megharia ma nabata usoro anyị maka mmetụta kachasị na obere akụrụngwa.

nchịkọta ebumnuche 2024-25

Akụkụ a na-enye nkọwapụta nke isi ọrụ dị n'ime ebumnuche Foundation ọ bụla.


EBUMNUCHE MBỤ: AKỤRỤNGWA:kwalite ọganihu ihe Ọmụma dị ka Ọrụ site n'ilekwasị anya na mmụtara wiki, ndị na-ege ntị n'ọdịnihu, yana akara na ọrụ data.

  • MMỤTAARA WIKI
    • Mmụtaara onye ntinye aka:' Enyemaka ndị nwere mmụtaara na ndị nkwado ọhụrụ na-agbakọta ọnụ iji wuo akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwesịrị ntụkwasị obi.
    • Ahụmahụ ndị ahịa: Nwee njịkọ ọgbọ ọhụrụ nke ndị na-agụ akwụkwọ na ndị na-enye onyinye iji wulite njikọ na-adịgide adịgide na ọdịnaya nkà ihe ọmụma.
    • MediaWiki:' Mee ka usoro mgbasa ozi ihu MediaWiki gboo isi mkpa ndị Wikipedia.
  • NDỊ N'EGE NTI N'ỌDỊNIHU
    • Nnwale echiche.'Nnwale echiche gbadoro ụkwụ n'ọdịniihu ka ị ghọta usoro owuwu nke teknụzụ nke ọma, omume ịntanetị, wee mebaa nnweta ọdịnaya Wikipedia.
  • AKARA NA ỌRỤ DATA
    • Metrik:' Soo ma bipụta metrik dị mkpa iji ghọta mmetụta anyị ma mee mkpebi.
    • Ebe Nnwale: wepụta ebe nnwale siri ike iji nyochaa nke ọma mmetụta nke njirimara ngwaahịa.

EBUMNUCHE nke mbụ: ỊHA NHATA: kwadoo Ịha nhatanha Ọmụma site n'ilekwasị anya na ọchịchị na ime mkpebi, nkesa ihe onwunwe ziri ezi, mmeche oghere ihe ọmụma na ijikọ Njem a.

  • ICHISI NJEM A
    • Ime Mkpebi : Kwado ime mkpebi nziri ezi nke njem a. Gbaa mbọ hụ na ndị ọrụ afọ ofufo ghọtara ma nwee ike isonye n'ụzọ zuru oke na usoro isi ihe omume nke Njem a(dịka ọmụmaatụ, Charter, Kansụl Mba Nile, Hubs, kọmitii).
  • NKESA NGWAỌRỤ
    • inweta Ego: Gaa n'ihu ịkwado inye onyinye na nrụtụ aka usoro ntuziaka atụmatụ Njem a. Soro ndị ngalaba otu na-arụkọ ọrụ iji kwado nkesa akụrụngwa ziri ezi yana kwalite ikike ịnakọta ego ndị mmekọ.
  • INỌCHI OGHERE IHE ỌMỤMA
    • Mmụba ọdịnaya: Mebaa uto na ọdịnaya encyclopedik kwesịrị ntụkwasị obi. Nyere ngalaba otu aka imechi oghere ihe ọmụma site n'ime ka ngwaọrụ anyị na sistemụ nkwado anyị dị mfe ịnweta, imeghari na imelite.
  • NJIKỌ
    • Jikọọ Otu a: Nyere ndị Wikimedia aka ijikọ, kesaa ma mụta n'aka ndị ọgbọ. (dịka ọmụmaatụ, Wikimedia nke afọ, WikiCelebrate, Njikọ mpaghara na nke gburugburu ụwa, Wikimania, Ọgbakọ mpaghara, Wikimedia Hackathon, Let's Connect.)

EBUMNUCHE nke atọ: Nchekwa: Chebe ndị anyị na ọrụ anyị site n'ilekwasị anya na nkwado ọchịchị oru ngo, ikike mmadụ, ịzaghachi n'usoro iwu na-agbanwe agbanwe, ịlụso ozi na-adịghị mma ọgụ, na ịkwalite ụdị Wikimedia.

  • CHEKWA NDỊ OTU ANYỊ
    • Ntụkwasị obi na nchekwa: Na-akwado ọrụ nchịkwa ọchịchị ọrụ dị ka ArbCom, Stewards, na ndị ọzọ na-echebe ndị mmadụ ma na-akwado iguzosi ike n'ezi ihe. Soro ndị nchịkwa na-arụ ọrụ na-echebe megide ịgba akwụkwọ na oke ọkụ n'obi iwu.
    • Ikike mmadụ: Kwado gburugburu ebe nchekwa dị mma maka ikesa, ịnata, na iji ezi uche kesaa ozi na ọrụ Wikimedia.
    • Mkparị bawanyere: Chekwaba ngalaba otu na sistemu na nriwanye mkparị dị oke njọ site na imeziwanye akụrụngwa,ngwa na usoro anyị.
  • CHEKWABA ỌRỤ ANYỊ
    • Iwu na ụkpụrụ: leba anya na mgbanwe usoro iwu, nke gụnyere agụmakwụkwọ nchịkwa, nnyocha iwu na nnabata.
    • Ozi n'ezighị ezi

Gaa n'ihu na-akwado ngalaba òtù siri ike, dị iche iche dị ka ihe nchebe kachasị mma. Kwado mbọ ndị ọrụ afọ ofufo site na nnyocha, njikọ ọkachamara na nchekwa iwu.

  • KWALITE ỌGANIHU UDI IHE NLEREANYA ANYA ANYỊ
    • Nkwado Amụma:' Kwalite uru nke ihe nlereanya Wikimedia na gburugburu iwu na amụma.

EBUMNUCHE nke anọ: ỊDỊ IRE: kwalite ịdị ike ịrụ ọrụ Foundation n'ozuzu oke + idị irè site n'ilekwasị anya na nkwado ego na ịrụ ọrụ nke ọma, na-ewusi njikọ aka na ịrụ ọrụ nke ndị ọrụ ike, na ịhazi usoro omume ihe Foundation.

  • NDIGIDE NKE EGO
    • Ego a na-enweta: Nweta $188M maka ego kwa afọ ma mee atụmatụ ntinye ego ga-adị ogologo oge.
    • Irụ ọrụ: Gbaa mbọ hụ na ụdị ihe nlereanya ego anyị ruru ma ọ bụ gafere usoro kacha mma nke ụlọ ọrụ; jikwaa oke mmefu akwadoro nke opekata mpe 77%.
    • Ndị Mmeko: Gbaa mbọ hụ na ndị mmekọ nwere ọnọdụ nke ọma itinye aka na nhazi mmefu ego na nhazi mmefu ego ọtụtụ afọ.
  • ARỤMỌRỤ
    • Usoro ndị mmadụ: Kwalite atumatu, usoro na ahụmahụ ndị mmadụ iji melite ntinye aka na ịdị irè nke ndị ọrụ.
    • Ọrụ ebere: Gbasaa ohere maka ndị ọrụ ka ha bụrụ ndị nnọchiteanya maka ozi anyị na ndị na-enye onyinye na ọha na eze, dịka akụkụ ntinye aka ọgbakọ n' ikwalite omenala nke inye onyinye.
  • Usoro
    • Gbanwee Usoro Foundation: Mepụta usoro dị mma, nke akpaaka na nke dabere na ndị ahịa. (dịka ọmụmaatụ, Nchịkọta Ịkwụ Ụgwọ Arịrịọ ego, Njikwa Ihe ize ndụ Ụlọ Ọrụ, Gburugburu Ọrụ, ịrụ Ọrụ Azụmahịa .)
    • Metrik Ụzọ anọ: Mejuputa usoro siri ike iji nyochaa metrik nke nkeji anọ na izi ezi ego ebe ọ metụtara ebumnuche kwa afọ.

Ọganihu emere na atụmatụ afọ gara aga

Ihe na-esote bụ obere nkọwa ọganihu anyị nwetagooro na atụmatụ kwa afọ nke 2023-2024. Anyị na-aga n'ihu na-ekerịta ọganihu na-aga n'ihu na atụmatụ afọ anyị Ebumnuche dị na Diff yana na ọkwa ndị ọzọ.

Ọganihu anyị nwetara na EBUMNUCHE MBU:AKỤRỤNGWA

Ọganihu emere na EBUMNUCHEnke abụọ: ỊHA NHATA

Ọganihu emere na EBUMNUCHE nke atọ: Nchekwa na iguzosi ike n'ezi ihe

  • EU Digital Services Act: o were ọtụtụ ihe iji kwadoo Digital Services Act, omume malitere n'August 2023 nke na-ahazi nhiwe ịntanetị na-arụ ọrụ na European Union.
  • Nkwado: ịgụ akwụkwọ ndị na-achịkwa, ndị na-eme amụma na ndị isi gọọmentị gbasara ihe nlereanya Wikimedia
  • mkpughe: meruo ọrụ nkọwapụta mpụtaara na mkpughe iwu anyị, tinyere ibipụta supplemental transparency report
  • Ozi n'ezighị ezi: ndị ọrụ afọ ofufo akwadoro na iguzosi ike n'ezi ihe site n'ịdepụta atụmatụ mgbochi mgbasa ozi n'ezighị ezi n'ofe gburugburu ebe obibi; luso ozi ezighị ezi ọgụ na Anti-Disinformation Repository
  • Nchekwa ndị ọrụ afọ ofufo: usoro Otu kwadoro maka nchekwa na nsonye site nrụkọ ọrụ nke ha na Kọmitii Affiliation, Kọmitii Nlebaanya Okwu na Ombuds Commission.

Oganihu emere na Ebumnuche nke anọ: ỊDỊ IRE

  • Mbawanye ịdị mma arụmọrụ: anyị na-aga n'ihu iji bulie pasentị nke mmefu ego anyị nke na-aga n'ihu na-akwado ozi Wikimedia ("Our Programmatic Efficiency Ratio") site n'ịbawanye ịdị mma arụmọrụ ime anyị n'ihe gbasara njikwa na onu ego nnakọta ego.
  • Mgbakwunye ntinye n'ịkwado Njem a: mbawanye nrụpụta ọrụ a ga-eme ka enwee ntinye ego nke $1.8M na mpaghara dịka ego iji rụọ ọrụ, mmepe atụmatụ, akụrụngwa saịtị na ihe ndị ọzọ.