Movement Strategy

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Movement Strategy and the translation is 100% complete.


Ọdịnihu anyị na gburugburu ebe obibi nke ihe ọmụma efu

Wikipedia malitere na 2001 dị ka òkù ịkọrọ nchikota nke ihe ọmụma niile. Taa, Wikimedia na-enye akwụkwọ nkà ihe ọmụma kasị ukwuu n'ụwa na ọtụtụ ọrụ wiki ndị ọzọ dị ka Wikimedia Commons, Wikidata, na ndị ọzọ.

Nakwa ihe ịga nke ọma a, ndị Wikimedia na-ezute ọtụtụ ihe ịma aka. Ọdịiche nwoke na nwanyị na ihe mgbochi na-esonyere ndị otu na-enweghị atụ dịkwa. A naghị ekesa ike, ihe onwunwe na ohere nke ngagharị anyị. Nnyocha, onyunyo, na mmụba nke mgbasa ozi ihe ọmụma na-etinye ịdị adị Wikimedia n'ihe egwu. N'ihi ọganihu nke nkà na ụzụ na usoro mmekọrịta ọha na eze, ọrụ anyị nwere ike ịka nká. Ka o sina dị, ihe ịma aka ndị a na ụwa na-agbanwe agbanwe na-enyekwa ohere maka ihe ndị ọzọ.

Ịmepụta atụmatụ n'etiti ndị otu dị iche iche ka ha na-arụ ọrụ na mmemme Wikimedia oge niile bụ ihe na-adịghị mma na mgbagwoju anya. N'ikpeazụ, a chịkọtara ihe ọmụma na echiche mkpokọta iji mepụta ọhụụ nkekọrịta. Ọganihu nke usoro a na-egosi na ike nke Wikimedia bụ nkà, nraranye, na iguzosi ike n'ezi ihe nke ndị nyere ya aka.

Ihe na-achịkọta anyị abụghị ihe anyị na-eme; ọ bụ ihe mere anyị ji eme ya.

Ịghọta Movement Strategy

Ka anyị malite na ntụzịaka atụmatụ anyị:

N'afọ 2030, Wikimedia ga-abụ akụrụngwa dị mkpa nke gburugburu ebe obibi nke ihe ọmụma efu, onye ọ bụla nke na-ekerịta ọhụụ anyị ga-enwe ike isonyere anyị.

Anyị kwenyere na ike nke ige ntị, mmụta, na ịnwale. Ọ bụ naanị site na mkparịta ụka mepere emepe ka anyị nwere ike ịmepụta ụwa nke ihe ọmụma efu nke na-arụ ọrụ maka mmadụ niile. Usoro mmegharị ahụ na-enyere onye ọ bụla aka ịhazi gburugburu ụzọ aga n'ihu. Usoro a ga-emepe nke ọma, na-ekere òkè na asụsụ ọtụtụ asụsụ. Anyị na-akpọ onye ọ bụla ka ọ nye aka na atụmatụ a ka anyị na-ekerịta ụkpụrụ nkịtị.

Usoro ntụzịaka ahụ jikọtara ma kpalie Wikimedia Movement n'ụzọ anyị na 2030. Ihe mgbaru ọsọ abụọ na-eduzi ntụzịaka a:

  • Ọmụma dị ka Ọrụ' - I bụ ikpo okwu na-enye ihe ọmụma n'ọtụtụ usoro ma na-ewukwa ngwaọrụ maka ndị mmekọ.
  • Ịha nhatanha Ọmụma - I lekwasị anya na ihe ọmụma na obodo ndị usoro nke ike na ihe ùgwù hapụlụ.

Ihe mgbaru ọsọ ndị a jikọtara ọnụ. Agaghị enweta otu na-enweghị nke ọzọ.

Usoro ntụzịaka ahụ na-akpali ntụnye iri gbasara mpaghara ọrụ dị iche iche. Ndụmọdụ ọ bụla na-akọwapụta ihe atụmatụ. Atụmatụ ọ bụla nwere ike ịgụnye ọtụtụ mmemme yana ọrụ ngọ'

Atụmatụ ngagharị Strategy niile jikọtara ọnụ ma kwado ibe ha. Dị ka ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ, ọ gaghị ekwe omume ịchụso ha iche iche.

Sonyere anyị

Ị dị mkpa maka ịga nke ọma nke Atụmatụ ngagharị a. Enwere ọtụtụ ụzọ isi tinye aka: Ọ bụrụ na ị nwere echiche ndị ọzọ, ọ ga-amasị anyị ịnụ ha. Ka anyị kwuọ.