Atụmatụ Afọ nke Wikimedia Foundation/2024-2025/Njikọ aka

From Meta, a Wikimedia project coordination wiki
This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation Annual Plan/2024-2025/Collaboration and the translation is 71% complete.
Outdated translations are marked like this.

Mmekọrịta

N'ime afọ ole na ole gara aga, anyị gara n'ihu n'ịkwalite na imelite usoro nhazi imekọ ihe ọnụ - nlekwasị anya Wikimedia Foundation ka dabeere na mmadụ na nkà na ụzụ nye ọrụ pụrụ iche nke Foundation dị ka ụlọ ọrụ bụ isi n'ịkwadọ ndị mmadụ na ngalaba ndị na-ahazị usoro mmepụta ihe ọmụma nke njikọ aka ọgbọ na ọgbọ. Ihe mmetụta anọ dị oke mkpa bụ (ịha nhata, Akụrụngwa, Nchekwa, ezi Ịrụ Ọrụ) na-adịgide, ebe ọrụ na ihe ndị a na-enweta n'ime ha na-akọwapụta ọganihu dị ịrịba ama e mere n'afọ a.

Mkparịtaụka a malitere n'afọ a site na Talking:2024 - mkparịtaụka n'etiti ndị ọrụ Foundation, ndị isi, ndị otu bọọdụ, na ndị otu Wikimedia nọ gburugburu ụwa. E sochiri ha site n'akwụkwọ ịkpọ òkù sitere n'aka onye isi ngwaahịa na teknụzụ bụ Selena Deckelmann maka ntinye na-wiki n'ime atụmatụ ebumnobi nke ọrụ ngwaahịa na teknụzụ nke Foundation n'afọ na-abịa. Ebumnobi ndị a na-akwalite mkparịta ụka na-aga n'ihu site na Talking:2024, nke gosipụtara mkpa ọ dị ịnọgide na-elekwasị anya na mkpa nke Otu anyị na ndị ntinye aka n'ịntanetị. N'ime izu ndị na-abịa, a ga-ebipụta mpịụtaara isi ngwaahịa na teknụzụ, nke ihe ndepụta atụmatụ afọ zuru ezu ga-esochi na mbido Eprel.

Anyị na-anabata echiche gị ugbu a site na Ubọchị iri atọ na otu nke ọnwa Mee afọ 2024 ma a ga-emelite ibe a ka mkparịta ụka ọhụrụ na wiki na-amlite n'ọwa na asụsụ dị iche iche. Mkparịta ụka ndị a bụ ebe ndị Wikimedia na-ekerịta echiche ha na atụmatụ a chọrọ ma kesaa ihe nlekwasị nke onwe ha maka afọ na-abịa. N'ịbụ ndị nwere mkpali mmụọ sitere n'ihe ọtụtụ ndị ọzọ na-eme n'ọrụ nke ha, anyị na-aga n'ihu na-achọta ohere iji jikọọ ma nwee mmụta site na nhazi atụmatụ na ọrụ nke ndị ọzọ na njem Wikimedia yana ndị mmekọ ndị ọzọ. N'afọ a, enwere ọtụtụ ụzọ isi tinye aka: ebe a na Meta-Wiki, n'ime ngalaba otu a dị iche iche, na peeji ọrụ Wikimedia, na n'ọwa ngalaba otu dị iche iche.

Co-created Community spaces

N'afọ a, ndị ọrụ na ndị isi sitere na Wikimedia Foundation ga-esonye na oku a haziri ahazi nke ngalaba otu dị ugbu a maka usoro nhazi abụọ nke atụmatụ afọ na-abịa edepụtara. Na mgbakwunye, ndị ọrụ Foundation na-ahazi ọtụtụ oku metụtara isiokwu onye ọ bụla nwere ike ịsonye dabere na mpaghara mmasị ha. Ọ bụrụ na ịchọrọ isonye na oku a mana nkọwa asụsụ adịghị n'asụsụ masịrị gị, zitere anyị emailu na Movementcomms@wikimedia.org, anyị ga-eme nhazi dị mkpa maka nke a. Biko mara na a ga-emelite ndepụta a oge niile ka akapịachara ụbọchị ọnụ iji hụ na ị maara maka ozi kachasị ọhụrụ ewepụtara.

  1. Mkparịtaụka nke Komittee ihe gbasara ngalaba otu na Trustees nke Wikimedia Foundation: .
  2. WikiCauserie: , Nkọwa Asụsụ ga-adị na: English - French.
  3. MENA Community call , interpretations available: English - Arabic.
  4. CEE Catch up: , Nkọwa Asụsụ ga-adị na: English - Russian.
  5. Annual Planning Session at ESEAP Conference 2024: .
  6. Igbo Wikimedia Open Community Call: .
  7. Cross-regional meeting: May 15, 2024 (15.00-16.30 UTC), interpretation available: English, French, Polish, Portuguese, Spanish.
  8. Wikimedia AI call: May 16, 2024 (14.00-15.00 UTC). Interpretation: TBD
  9. Afrika Baraza: , Nkọwa Asụsụ ga-adị na: English - French, Arabic and Swahili.
  10. South Asia Open call: .

Na-Wiki

A ga-ezisa ozi nchịkọta maka ntinye aka na mkparịta ụka atụmatụ kwa afọ na mpaghara ọrụ dị iche iche. Ụdị ngwa atụmatụ afọ nke zuru ezu yana ntụgharị asụsụ ga-adị na Meta-Wiki a. Ị nwere ike isonye anyị na ibe okwu mpaghara yana ebe a na ibe okwu Meta-Wiki, mgbe niile n'asụsụ masịrị gị. Anyị ga-agbakwunye njikọ ebe a na ebe ezisara ọdịnaya mgbe ha ga adị.

Mkparịta ụka ndị ọzọ gbasara atụmatụ kwa afọ na-emekwa na ọwa ngalaba otu ndị ọzọ na Discord na Telegram. Anyị na-akwado gị ka ị sonye na mkparịta ụka ma ọ bụrụ na ị denyere aha na ọwa ndị a.

A ga-eme Mkparịta ụka gbasara ngwaahịa na ọwa dị iche iche. Mkparịta ụka a dị n'etiti ndị otu ngalaba otu ha na ndị otu Wikimedia Foundation Product na-emekọ ihe ọnụ nwere ebumnobi na mpụtaara dị mkpa na atụmatụ afọ. Ndị otu obodo nwere mmasị n'ebumnobi dị iche iche yana isi mpụtaara nke ndị otu ngwaahịa nwee nwere ike isonyere otu ahụ maka nkọwa ọrụ nke ebumnobi ha nwere, mmejuputa ya, yana ndakọrịta ya n'ọrụ na mmasị ngalaba otu.

Mmekọrịta ndị a bụ ohere ịjụ ajụjụ manweta nweta nkọwapụta na ọrụ ndị otu ngwaahịa kọwapụtara maka afọ 2024–25 dabere na ebumnuche atụmatụ afọ na isi mpụtaara. Anyị ga-agbakwunye njikọ ebe ndị otu ngwaahịa na ndị na-ege ha ntịga na akpakọrịta mgbe ha dị.